Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Febrụwarị 2027 › 18 Febrụwarị
Kalenda Ọtọdọks · 5 Febụwarị (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 18 Febrụwarị 2027
Tọọzdee · Izu nke 38 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 4
Mmemme na ndị nsọ
Afterfeast of the Meeting of the Lord
Obubu ọnụ
Ọ dịghị obubu ọnụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
Ilu 10 (amaokwu a họọrọ)
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
Ọ dịghị na nsụgharị a
Ofufe ụtụtụ: Oziọma
9Mụ onwe m bụ ụzọ. Onye ọbụla sitere na m banye, a ga-azọpụta ya. Ọ ga na-apụ na-abata na-achọtakwa nri. 10Onye ohi na-abịa naanị ka o zuo ohi, gbuo ma bibiekwa; abịara m ka ha nwe ndụ ma nwebigakwa ya oke. 11“Mụ onwe m bụ onye ọzụzụ atụrụ ọma. Ezi onye ọzụzụ atụrụ na-atọgbọ ndụ ya nʼihi atụrụ ya. 12Onye e goro ọrụ, nke na-abụghị onye nche atụrụ, onye atụrụ na-abụghị nke ya, ọ na-ahapụ ha gbaa ọsọ mgbe ọ hụrụ agụ ka ọ na-abịa; mgbe ahụ agụ na-achụso atụrụ ahụ chụsasịa ha. 13Onye e goro ọrụ na-agbapụ, nʼihi na ọ bụ onye e goro ọrụ, ọ naghị echegbu onwe ya banyere atụrụ ndị ahụ. 14“Abụ m onye ọzụzụ atụrụ ọma; amaara m atụrụ m, atụrụ nke m makwaara m. 15Dị ka Nna ahụ maara m, mụ onwe m makwa Nna ahụ. Ana m atọgbọ ndụ m nʼihi atụrụ ahụ. 16Enwere m ụmụ atụrụ ọzọ ndị na-anọghị nʼọgba atụrụ a. Aghaghị m ịkpọbatakwa ha. Ha onwe ha ga-anụ olu m, a ga-enwekwa otu igwe atụrụ na otu onye ọzụzụ atụrụ.
Akwụkwọ ozi
12Ụmụnna m, ka ọ hapụ iju unu anya mgbe ọnwụnwa dị iche iche na-abịara unu nʼihi na ihe dị otu a abụghị ihe ọhụrụ nʼebe unu nọ. 13Kama ṅụrịanụ ọṅụ nʼihi na unu so Kraịst na-eketa oke nʼahụhụ ya, ka e sikwa otu a mee ka obi unu jupụta nʼọṅụ, unu ga-etikwa mkpu ọṅụ mgbe a ga-eme ka ebube ya pụta ìhè. 14Ọ bụrụ na a na-ekwutọ unu nʼihi aha Kraịst, unu bụ ndị a gọziri agọzi. Nke a na-ezipụta na mmụọ nke ebube ahụ bụ mmụọ Chineke na-ebi nʼime unu. 15Ka onye ọbụla nʼime unu ghara ịta ahụhụ nʼihi na o gburu mmadụ maọbụ dị ka onye ohi, maọbụ dị ka onye na-eme ihe ọjọọ, maọbụ dị ka onye na-anara mmadụ ihe nʼaka ike. 16Ma ihere ekwesighị ime unu mgbe unu na-ata ahụhụ dị ka ndị Kraịst. Kama nyenụ Chineke otuto na unu bụ ndị a na-akpọ aha ahụ. 17Nʼihi na oge eruola, mgbe a ga-amalite ikpe nʼezinaụlọ Chineke. Ọ bụrụ na a ga-ebu ụzọ kpee anyị ikpe, gịnị ga-abụkwanụ ọnọdụ ndị ahụ na-ekwenyeghị nʼoziọma Chineke? 18Ma, “Ọ bụrụkwa na ọ dị ike ịzọpụta onye ezi omume, oleekwanụ olileanya dịrị onye na-amaghị Chineke na onye mmehie?” 19Ya mere, ndị na-ata ahụhụ dị ka nzube Chineke si dị, nyefeenụ onwe unu nʼaka onye okike, onye kwesiri ntụkwasị obi, ma nọgidenụ na-eme ezi ihe. 5:1Mụ onwe m, onye bụ okenye na onyeama banyere ahụhụ Kraịst, bụrụkwa onye ga-eso keta oke nʼebube ya nke a gaje ikpughe, a na m arịọ ndị okenye nʼetiti unu arịrịọ a, 2na-azụnụ igwe atụrụ ahụ Chineke nyefere unu nʼaka. Ka unu na-elekọta ha, ọ bụghị nʼihi na unu agaghị ime otu a, kama ọ bụ ihe sitere nʼọchịchọ obi unu, dị ka Chineke chọrọ ka unu mee. Ọ bụkwaghị nʼihi ego unu ga-enweta, kama ọ bụ ịnụ ọkụ unu nʼije ozi. 3Unu abụla ọkaaka nʼebe ndị e nyefere unu nʼaka nọ. Kama bụrụnụ ihe ịma atụ nye igwe atụrụ ahụ. 4Ma mgbe Onyeisi ndị ọzụzụ atụrụ ahụ ga-abịa unu ga-anata okpueze ebube nke na-agaghị agbanwe agbanwe. 5Nʼotu aka ahụ, unu ụmụ okorobịa, doonụ onwe unu nʼokpuru ndị bụ okenye. Unu niile werenụ obi umeala na-ejeritara onwe unu ozi, nʼihi na, “Chineke na-eguzo imegide ndị na-ebuli onwe ha elu, ma ọ na-enye ndị dị umeala nʼobi amara.”
Akwụkwọ ozi (maka Onye nsọ Teodosiọs)
17Ka unu na-ekwenyere ndị ndu unu, dokwaanụ onwe unu nʼokpuru ha. Nʼihi na ọrụ ha bụ ịhụ maka mkpụrụobi unu dịka ndị ga-aza azịza. Meenụ nke a ka ha were ọṅụ na-eje ozi ha, ma ọ bụghị site nʼobi mwute nʼihi na nke a agaghị abara unu uru. 18Na-ekperenụ anyị ekpere, nʼihi na o doro anyị anya na anyị nwere akọnuche dị ọcha na-achọkwa ibi ndụ nwere ugwu nʼụzọ niile. 19Ana m arịọsị unu ya ike, ka unu mee nke a, ka m nwee ike ịlọghachikwute unu ọsịịsọ. 20Ugbu a ka Chineke nke udo, onye ahụ sitere nʼọbara ọgbụgba ndụ ebighị ebi ahụ kpọghachite Onyenwe anyị Jisọs, Onye ọzụzụ atụrụ ukwuu ahụ, site nʼọnwụ, 21mee ka unu zuo oke nʼezi ihe ọma niile ọbụla, nke ga-enyere unu aka ime ihe ọ na-achọ. Ka ọ rụpụta nʼetiti anyị ihe ndị ahụ niile na-atọ ya ụtọ site na Jisọs Kraịst, onye otuto niile dịrị ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen.
Oziọma
38Dịka ọ na-ezi ihe, ọ siri, “Lezienụ anya nʼebe ndị ozizi iwu nọ. Ndị iyi uwe mwụda na-ejegharị ebe niile na-amasị, na ịnara ekele pụrụ iche bụ nke a na-ekele ha nʼọma ahịa. 39Ndị ọ na-amasịkwa ịnọkwasị nʼoche kachasị elu nʼụlọ ekpere nakwa nʼoche pụrụ iche na mmemme oriri ọbụla. 40Ha na-eripịa ihe niile dị nʼụlọ ndị inyom ndị di ha nwụrụ anwụ, nʼekpe ogologo ekpere ka a hụta ha. Ndị dị otu a ka a ga-ata ahụhụ dị ukwuu.” 41Ọ nọdụrụ ala na ncherita ihu ebe igbe onyinye dị, sị ebe ahụ na-ahụ otu igwe mmadụ ahụ si etinye ego ha nʼime igbe onyinye. Ọtụtụ ndị ọgaranya tụnyere ego buru ibu. 42Otu nwanyị bụ ogbenye, nke di ya nwụrụ anwụ, bịara tinye mkpụrụ ego ọla abụọ nke pụtara otu peni. 43Ọ kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya sị ha, “Nʼezie agwa m unu, nwanyị a di ya nwụrụ anwụ, bụkwa ogbenye, etinyela ego nʼime igbe onyinye a karịa ndị ọzọ. 44Nʼihi na ndị ọzọ sitere nʼịba ụba nke ego ha nwere tinye, ma nwanyị a sitere nʼogbenye ya tinye ihe niile o nwere, ọ bụladị ihe niile o ji biri.”
Oziọma (maka Onye nsọ Teodosiọs)
17Ya na ha rịdatara ga nʼebe ala dị larịị. Igwe ndị na-eso ụzọ ya na oke igwe mmadụ sitere na Judịa, na Jerusalem nakwa obodo dị na nsọtụ mmiri nke Taịa na Saịdọn. 18Ndị bịara ịnụrụ okwu ya na ka a gwọọ ha ọrịa ha. A gwọkwara ọtụtụ ndị mmụọ na-adịghị ọcha na-esogbu. 19Igwe mmadụ ahụ gbalịrị ịmetụ ya aka, nʼihi na ike dị ukwuu si ya nʼahụ na-apụ na-agwọ ha niile. 20O weliri anya lee ndị na-eso ụzọ ya, sị ha, “Ngọzị na-adịrị unu bụ ndị ogbenye, nʼihi na alaeze Chineke bụ nke unu. 21Ngọzị na-adịrị unu ndị agụụ na-agụ ugbu a, nʼihi na afọ ga-eju unu. Ngọzị na-adịrị unu ndị na-ebe akwa ugbu a, nʼihi na unu ga-achị ọchị. 22Ngọzị na-adịrị unu mgbe ndị mmadụ na-akpọ unu asị, mgbe ha na-achụpụ unu, na-akparị unu, na-ajụ aha unu, nʼihi Nwa nke Mmadụ. 23“Ṅụrịanụ ọṅụ ma wuliekwanụ elu nʼihi ọṅụ nʼụbọchị ahụ, nʼihi na ụgwọ ọrụ unu dị ukwuu nʼeluigwe. Nʼihi na otu a ka ndị nna nna ha mesoro ndị amụma.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 5 Febrụwarị na kalenda nzukọ bụ 18 Febrụwarị na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike