Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Febrụwarị 2027 › 6 Febrụwarị
Kalenda Ọtọdọks · 24 Jenụwarị (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 6 Febrụwarị 2027
Satọdee · Izu nke 36 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 2
Mmemme na ndị nsọ
Venerable Xenia of Rome and her two female slaves (5th C)
Obubu ọnụ
Ọ dịghị obubu ọnụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
3Mgbe ọbụla anyị na-ekpere unu ekpere anyị na-ekele Chineke onye bụ Nna Onyenwe anyị Jisọs Kraịst ekele. 4Nʼihi na anyị anụla ihe banyere okwukwe unu nʼime Kraịst Jisọs, na otu unu si hụ ndị nsọ niile nʼanya. 5Okwukwe na ịhụnanya nke na-esite nʼolileanya nke a kwadobere unu nʼeluigwe, nke unu nụrụla nʼokwu nke eziokwu ahụ, bụ oziọma, 6nke bịaruterela unu. Nʼezie, dị ka o si dị nʼụwa niile, ọ na-amị mkpụrụ na-etokwa, dị ka o si eme nʼetiti unu, site nʼụbọchị unu nụrụ ma ghọtakwa amara nke Chineke nʼeziokwu.
Akwụkwọ ozi (maka Onye nsọ Ksenia nke Rom)
22Ma mkpụrụ nke Mmụọ Nsọ bụ, ndụ ịhụnanya, na ọṅụ, na udo, na ogologo ntachiobi, na obiọma, na ịdị mma, na ikwesi ntụkwasị obi, 23ịdị nwayọọ, na ijide onwe. Ọ dịkwaghị iwu na-emegide ihe ndị a. 24Ma ndị niile bụ ndị Kraịst Jisọs akpọgidela anụ ahụ ha, ya na ọchịchọ ha nʼelu obe. 25Ọ bụrụ na anyị na-ebi ndụ mmụọ, ka nzọ ụkwụ anyị bụrụ nke mmụọ na-eduzi. 26Ka anyị ghara ịbụ ndị mpako si otu a na-akpali iwe na ekworo nʼetiti anyị. 6:1Ụmụnna m, ọ bụrụ na-anwude onye ọbụla dabara na mmehie, unu onwe unu bụ ndị Mmụọ na-achị kwesiri iji mmụọ nke ịdị nwayọọ na obi dị umeala nyere onye ahụ aka, ime ka ọ gazie nʼezi ụzọ. Ma lezienụ onwe unu anya, onye ọbụla nʼime unu, nʼihi na a pụrụ ịnwakwa unu. 2Na-eburịtanụ nsogbu dịrị ibe unu, ma site nʼotu a ka unu nwee ike debezuo iwu Kraịst.
Oziọma
10“Onye ọbụla kwesiri ntụkwasị obi nʼihe dị ntakịrị, ga-ekwesikwa ntụkwasị obi nʼihe dị ukwuu. Onye na-ekwesikwaghị ntụkwasị obi nʼihe dị ntakịrị, agaghịkwa ekwesi ntụkwasị obi nʼihe dị ukwuu. 11Ọ bụrụ na unu abụghị ndị kwesiri ntụkwasị obi nʼakụ mmehie nke ụwa, onye ga-enyekwa ezi akụ nʼaka unu na ntụkwasị obi idebe? 12Ọ bụrụkwa na unu abụghị ndị kwesiri ntụkwasị obi nʼakụ onye ọzọ, onye ga-enye unu ihe nke bụ nke unu? 13“Ọ dịghị onye ọbụla pụrụ ife nna ukwu abụọ, nʼihi na ọ ga-achọ ịhụ otu nʼime ha nʼanya, kpọkwa nke ọzọ asị, maọbụ, sọpụrụ otu ma lelịa nke ọzọ anya. Otu a kwa i nweghị ike ife Chineke na akụ otu mgbe ahụ.” 14Mgbe ndị Farisii, bụ ndị hụrụ ego nʼanya nụrụ ihe ndị a, ha jiri ya mee ihe ọchị. 15Ọ sịrị ha, “Unu na-egosi onwe unu dị ka ndị ezi omume nʼihu ndị mmadụ ma Chineke maara obi unu. Nʼihi na ihe ndị mmadụ na-akpọ ihe dị oke mkpa bụ ihe rụrụ arụ nʼanya Chineke.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 24 Jenụwarị na kalenda nzukọ bụ 6 Febrụwarị na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike