Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Jenụwarị 2027 › 19 Jenụwarị
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 19 Jenụwarị 2027
Tiuzdee · Izu nke 2 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Tiuzdee nke izu nke 2 nke Oge Nkịtị
Ụbọchị izu · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
10Chineke abụghị onye na-ekpe ikpe nʼezighị ezi. Ọ gaghị echefu ọrụ niile unu rụrụ ya. Ọ gaghị echefu ịhụnanya niile unu gosiri nʼihi ya site nʼịgara ndị nsọ ozi, dịka unu na-aga nʼihu na-emekwa. 11Anyị chọrọ ka onye ọbụla nʼime unu nọgidesie ike nʼotu ịnụ ọkụ nʼobi ahụ ruo ọgwụgwụ ihe niile, ka unu nwee olileanya inwezu ihe niile unu na-atụ anya ya mgbe oge ruru. 12Anyị achọghị ka unu bụrụ ndị umengwụ, kama ka unu bụrụ ndị na-eṅomi ndụ ahụ jiri okwukwe na ntachiobi nweta ihe ahụ e kwere na nkwa. 13Mgbe Chineke kwere Ebraham nkwa, o ji onwe ya ṅụọ iyi, nʼihi na ọ dịghị onye ọzọ dị ukwuu karịa ya, 14na-asị, “Nʼezie aga m agọzi gị, nyekwa gị ọtụtụ ụmụ ụmụ.” 15Ebraham nwere ndidi, natakwa ihe e kwere ya na nkwa. 16Ụmụ mmadụ na-eji ndị ka ha ukwuu ṅụọ iyi, iyi aṅụrụ nʼụzọ dị otu a na-eme ka ihe e kwuru guzosie ike ma wezugakwa ịrụ ụka niile nʼetiti mmadụ. 17Ya mere, mgbe Chineke chọrọ igosi ndị ahụ ga-eketa nkwa ahụ, ụdịdị izuzu ya, o jiri ịṅụ iyi mee ka o doo ha anya na izuzu ya adịghị agbanwe agbanwe. 18Ka ọ ga-abụ site nʼihe abụọ na-enweghị mgbanwe, nke na-agaghị ekwe omume izi Chineke dịka onye ụgha, anyị bụ ndị gbara ọsọ ndụ ga-enweta agbamume siri ike iji jide olileanya e dobeere anyị. 19Anyị nwere olileanya a dị ka arịlịka nke mkpụrụobi nke guzosiri ike ma bụrụkwa nke e chekwara. Ọ na-abanye nʼime ime ebe nchụaja ahụ nʼazụ akwa mgbochi 20ebe Jisọs onye buru anyị ụzọ, abanyela nʼihi anyị; ọ ghọlara anyị onyeisi nchụaja ruo mgbe ebighị ebi dị ka usoro Melkizedek si dị.
Abụ Ọma nzaghachi
1Toonu Onyenwe anyị! Aga m eji obi m niile jaa Onyenwe anyị mma nʼime nzukọ ndị ụzọ ha ziri ezi na nʼime ọgbakọ ukwuu. 2Ọrụ niile Onyenwe anyị na-arụ dị ukwuu; ndị niile na-enwe mmasị na ha na-atụgharị uche nʼime ha. 4O meela ka e cheta ọrụ ebube ya niile; Onyenwe anyị bụ onye amara na onye ọmịiko. 5Ọ na-egboro ndị na-atụ egwu ya mkpa ihe oriri; ọ na-echetakwa ọgbụgba ndụ ya ruo mgbe ebighị ebi. 9O wetaara ndị ya mgbapụta; o meela ka ọgbụgba ndụ ya guzosie ike ruo ebighị ebi, aha ya dị nsọ dịkwa oke egwu. 10Ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ mmalite amamihe; ndị niile na-edebe ụkpụrụ ya nwere ezi nghọta. Otuto ya na-adị ruo mgbe ebighị ebi.
Oziọma
23Otu ụbọchị izuike, ya na ndị na-eso ụzọ ya na-agafe nʼubi a kụrụ ọka. Dị ka ha na-agafe, ndị na-eso ụzọ ya malitere ịghọ ụfọdụ ogbe ọka nʼime ọka ndị ahụ. 24Ndị Farisii siri ya, “Lee, gịnị mere ha ji na-eme ihe megidere iwu nʼụbọchị izuike.” 25Ma ọ sịrị ha, “Unu agụtaghị ihe Devid na ndị so ya mere mgbe agụụ gụrụ ha? 26Nʼoge Abịata bụ onyeisi nchụaja, ọ banyere nʼụlọ Chineke taa achịcha e chere nʼihu ya, nke ziri ezi na ọ bụ naanị ndị nchụaja kwesiri ịta ya. O nyetụkwara ndị ya na ha so.” 27Mgbe ahụ, ọ gwakwara ha sị, “E mere ụbọchị izuike maka mmadụ, emeghị mmadụ maka ụbọchị izuike.” 28Ya mere, Nwa nke Mmadụ bụ Onyenwe ọ bụladị ụbọchị izuike.
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike