Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Jenụwarị 2027 › 5 Jenụwarị

Kalenda Ọtọdọks · 23 Disemba (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 5 Jenụwarị 2027

Tiuzdee · Izu nke 32 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 6

Mmemme na ndị nsọ

Forefeast of the Nativity

Obubu ọnụ Ọmụmụ

Obubu ọnụ: nri esiri esi na-enweghị mmanụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Akwụkwọ ozi

Jem 3:1–10

1Ụmụnna m, ka ọtụtụ nʼime unu hapụ ịgbalị ịbụ ndị ozizi, nʼihi na unu maara na anyị bụ ndị ozizi ka a ga-ekpe ikpe nʼọnọdụ sikarịrị ike. 2Nʼihi na anyị niile na-asọ ngọngọ site nʼọtụtụ ụzọ. Ma onye ọbụla nke na-adịghị emehie site nʼikwuhie ọnụ bụ onye tozuru oke na onye pụrụ ijide anụ ahụ ya niile aka. 3Ọ bụrụ na anyị e tinye mkpụmkpụ igwe e ji ekechi ọnụ ịnyịnya ibu nʼọnụ ya, ka o rubere anyị isi, anyị na-eduru ya gaa ebe anyị chọrọ. 4Otu a kwa, ọ bụladị ụgbọ mmiri buru ibu nke ikuku dị ike na-ebugharị nʼosimiri, ka onye na-anya ụgbọ mmiri pụrụ ime ka ọ gaa ebe ọ chọrọ site nʼịtụgharịa ụmara ntakịrị e ji anya ụgbọ. 5Otu a ka ọ dịkwa ire anyị. Ọ bụ akụkụ anụ ahụ anyị dị nta, ma ọ na-anya isi banyere ọtụtụ ihe. Tulee otu oke ọhịa si dị ukwuu, bụ nke icheku ọkụ dịkarịsịrị nta na-eme ka o nwuru ọkụ. 6Ire anyị bụ ọkụ. E debere ire nʼetiti akụkụ anụ ahụ ndị ọzọ dịka ụwa ajọ omume. Ọ na-emerụ ahụ niile, na-amụnye ọkụ nʼusoro ndụ mmadụ. Ya onwe ya bụkwa ihe ọkụ ala mmụọ na-amụnye ọkụ. 7Mmadụ enweela ike zụọ, na-agbalịkwa ịzụ anụmanụ dị iche iche, na nnụnụ, na anụ na-akpụ akpụ, na anụ bi na mmiri; 8ma mmadụ ọbụla adịghị nke nwere ike ịzụ ire. Ọ bụ ihe dị oke njọ na-adịghị ekwe nchịkọta, ma jupụtakwa na nsi na-ebute ọnwụ. 9Ọ bụ ya ka anyị ji eto Onyenwe anyị na Nna anyị. Ọ bụkwa ya ka anyị ji abụ mmadụ ibe anyị ọnụ, bụ ndị Chineke mere nʼoyiyi nke ya. 10Site nʼotu ọnụ anyị ka ịja mma na ịbụ ọnụ na-esi apụta. Ụmụnna m, nke a abụghị ihe ziri ezi.

Oziọma

Mak 10:2–12

2Ụfọdụ ndị Farisii bịara, ma nʼihi ị nwalee ya, ha jụrụ ya sị, “O ziri ezi nʼiwu ka nwoke gbaa nwunye ya alụkwaghị m?” 3Ma ọ zara ha sị, “Gịnị ka Mosis nyere unu nʼiwu?” 4Ha sịrị, “Mosis kwenyere ka nwoke dee asambodo alụkwaghị m, nye nwunye ya ma zilaga ya.” 5Jisọs sịrị ha, “Ọ bụ nʼihi na obi unu siri ike nke ukwuu ka o ji deere unu iwu a. 6Ma na mmalite nke okike ụwa, Chineke ‘kere ha nwoke na nwanyị.’ 7‘Nʼihi nke a ka nwoke ga-eji hapụ nne ya na nna ya e jikọta ya na nwunye ya. 8Ha abụọ ga-abụ otu anụ ahụ.’ Ya mere, ha abụkwaghị mmadụ abụọ ọzọ, kama otu anụ ahụ. 9Ya mere, ihe Chineke jikọtara, ka mmadụ ọbụla atọsala ya.” 10Mgbe ha banyere nʼụlọ, ndị na-eso ụzọ ya jụrụ ya ọzọ ihe banyere okwu a. 11Ọ sịrị ha, “Onye ọbụla gbara nwunye ya alụkwaghị m ma lụrụ nwanyị ọzọ na-eme mmehie ịkwa iko megide ya. 12Ma ọ bụrụ na nwanyị ọbụla agbaa dị ya alụkwaghị m ma lụrụ nwoke ọzọ, ọ na-emekwa mmehie ịkwa iko.”

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 23 Disemba na kalenda nzukọ bụ 5 Jenụwarị na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike