Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Jenụwarị 2027 › 4 Jenụwarị
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 4 Jenụwarị 2027
Mọnde · Oge Krismas
Mmemme na ndị nsọ
4 Jenụwarị
Ụbọchị izu · Agba ofufe: ọcha
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
7Ezigbo ụmụ m, unu ekwela ka onye ọbụla duhie unu, onye ọbụla na-eme ezi ihe bụ onye ezi omume dị ka ya onwe ya bụ onye ezi omume. 8Onye ọbụla na-eme mmehie bụ nwa ekwensu, nʼihi na ekwensu bụ onye mmehie site na mmalite. Ihe mere Ọkpara Chineke jiri pụta ìhè bụ ka ọ laa ọrụ niile nke ekwensu nʼiyi. 9Onye a mụrụ site na Chineke adịghị anọgide na-eme mmehie, nʼihi na mkpụrụ Chineke na-anọgide nʼime ya, ha enweghị ike ịnọgide na-eme mmehie, nʼihi na a mụrụ ha site na Chineke. 10Otu a ka anyị si amata ndị bụ ụmụ Chineke, na ndị bụ ụmụ ekwensu: Onye ọbụla na-adịghị eme ihe ziri ezi abụghị nwa Chineke, otu a ka ọ dịkwa onye na-adịghị ahụ ụmụnna ha nʼanya.
Abụ Ọma nzaghachi
1Abụ Ọma. Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ ọhụrụ, nʼihi na ọ rụọla ọtụtụ ọrụ dị ebube; aka nri ya na aka nsọ ya arụpụtarala ya nzọpụta. 7Ka oke osimiri niile gbọọ ụja, ya na ihe niile dị nʼime ya, ụwa na ndị niile bi nʼime ya. 8Ka osimiri na iyi niile kụọ aka ha, ka ugwu niile bụkuokwa ya abụ nʼihi ọṅụ; 9ka ha bụọ abụ nʼihu Onyenwe anyị, nʼihi na ọ na-abịa ikpe ụwa ikpe. Ọ ga-eji ezi omume kpee ụwa ikpe. Ọ ga-eji ikpe ziri ezi kpee ndị niile ikpe.
Oziọma
35Nʼechi ya, Jọn na mmadụ abụọ ndị na-eso ụzọ ya guzoro nʼebe ahụ ọzọ. 36Mgbe ọ hụrụ Jisọs ka ọ na-agafe, ọ sịrị, “Leenụ, Nwa Atụrụ Chineke.” 37Mgbe mmadụ abụọ ahụ na-eso ụzọ ya nụrụ nke a, ha tụgharịrị soro Jisọs. 38Mgbe Jisọs tụgharịrị hụ ka ha na-eso ya, ọ sịrị ha, “Gịnị ka unu chọrọ?” Ha sịrị ya, “Rabbi” (nke pụtara “Onye ozizi”), “olee ebe i bi?” 39Ọ sịrị ha, “Bịanụ, unu ga-ahụ.” Ha sooro ya ga hụ ebe ọ na-anọ. Ha nọnyekwara ya ụbọchị ahụ niile. Ọ bụ nʼihe dị ka elekere anọ nke mgbede. 40Otu nʼime mmadụ abụọ ahụ nụrụ ihe Jọn kwuru, nke sooro ya bụ Andru nwanne Saimọn Pita. 41Ihe mbụ o mere bụ ịchọta Saimọn nwanne ya sị ya, “Anyị achọtala Mezaya ahụ” (onye a na-akpọkwa Kraịst). 42Ọ kpọtaara ya Jisọs. O lere ya anya sị, “Ị bụ Saimọn nwa Jọn. A ga-akpọ gị Sefas” (nke nsụgharị ya, pụtara Pita).
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike