Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Disemba 2026 › 28 Disemba
Kalenda Ọtọdọks · 15 Disemba (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 28 Disemba 2026
Mọnde · Izu nke 31 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 5
Mmemme na ndị nsọ
Hieromartyr Eleutherius, Bishop of Illyria, and his mother Martyr Anthea and Martyr Corivus the Eparch (2nd C)
Obubu ọnụ Ọmụmụ
Obubu ọnụ: nri esiri esi na-enweghị mmanụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
17Site nʼokwukwe Ebraham ji Aịzik chụọ aja mgbe a nwalere ya. Onye ahụ natara ihe ndị ahụ e kwere nkwa, dị njikere iji otu nwa ahụ o nwere chụọ aja, 18ọ bụ ezie na Chineke kwuru maka ya, “Ọ bụ site nʼAịzik ka a ga-akpọ mkpụrụ gị aha.” 19Ebraham chere na Chineke pụrụ ime ka onye nwụrụ anwụ site nʼọnwụ bilie, dịka ihe ịma atụ otu ahụ ka o mekwara, nʼihi na ọ nataghachikwara ya. 20Ọ bụ okwukwe ka Aịzik jiri nye Jekọb na Ịsọ ngọzị banyere ihe dị nʼihu. 21Ọ bụ okwukwe ka Jekọb ji gọzie ụmụ Josef nʼotu nʼotu tupu ọ nwụọ. Ọ kpọrọ isiala dịka ọ dabere nʼelu mkpanaka ya. 22Nʼọgwụgwụ ndụ ya, Josef sitere nʼokwukwe kwuo banyere ọpụpụ ụmụ Izrel ma nyekwa ntụziaka banyere olili ọkpụkpụ ya. 23Okwukwe ka nne na nna Mosis ji zobe ya ọnwa atọ mgbe a mụrụ ya, nʼihi na ha hụrụ na ọ bụ nwa mara mma. Ha atụkwaghị egwu iwu eze ala Ijipt bụ Fero nyere. 27Okwukwe ka ọ ji hapụ Ijipt. Ọ tụghị egwu iwe eze, ma ọ tachịrị obi ya dịka ọ hụrụ onye ahụ a na-apụghị ịhụ anya. 28O sitekwara nʼokwukwe debe Mmemme Ngabiga. O fesara ọbara ka onye mbibi nke ụmụ nwoke mbụ, hapụ ịmetụ ụmụ nwoke mbụ ndị Izrel aka. 29Ha gafere Osimiri Uhie site nʼokwukwe dị ka a ga-asị na ọ bụ ala efu. Ma mgbe ndị Ijipt nwara ime nke a, mmiri lomiri ha niile. 30Mgbidi Jeriko dara mgbe ha jiri okwukwe gaa ya gburugburu ụbọchị asaa. 31Site nʼokwukwe, Rehab nwanyị akwụna esoghị ndị nnupu isi laa nʼiyi nʼihi na ọ nabatara ndị bịara inyochapụta obodo ahụ nʼudo.
Oziọma
11Ndị Farisii bịakwutere ya malite nrụrịta ụka, na-achọ ihe ịrịbama si nʼeluigwe, iji nwalee ya. 12Ọ sụrụ ude nke ukwuu nʼime onwe ya sị, “Gịnị mere ọgbọ a ji achọ ihe ịrịbama? Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, o nweghị ihe ịrịbama a ga-egosi ọgbọ a.” 13Ọ hapụrụ ha nʼebe ahụ banyekwa nʼụgbọ mmiri ọzọ, ịgafe nʼofe ọzọ nke osimiri ahụ. 14Ndị na-eso ụzọ ya chefuru iwere achịcha. Ọ bụ naanị otu ogbe achịcha fọdụụrụ ha nʼime ụgbọ. 15Ọ dọrọ ha aka na ntị sị, “Kpacharanụ anya. Lepụnụ anya maka ihe na-eko achịcha ndị Farisii na nke Herọd.” 16Ha kparịtara ụka nʼetiti onwe ha na-asị, “Ọ bụ nʼihi na anyị enweghị achịcha.” 17Mgbe Jisọs ghọtara isi mkparịta ụka ha, ọ jụrụ ha sị, “Gịnị mere unu ji na-ekwu okwu maka enweghị achịcha? Ọ pụtara na unu adịghị ahụ maọbụ aghọta? Obi unu o siri ike? 18Unu nwere anya nke na-adịghị ahụ ụzọ? Unu nwere ntị ma unu adịghị anụ ihe? Ọ ga-abụ na unu adịghị echeta? 19Mgbe m ji ogbe achịcha ise zụọ puku mmadụ ise, iberibe achịcha juru nkata ole ka unu tụtụkọtara?” Ha zara sị ya, “Nkata iri na abụọ.” 20“Mgbe m ji ogbe achịcha asaa zụọ puku mmadụ anọ, iberibe achịcha juru nkata ole ka unu tụtụkọtara?” Ha zara sị ya, “Nkata asaa.” 21Ọ sịrị ha, “Unu ka nọ na-enweghị nghọta?”
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 15 Disemba na kalenda nzukọ bụ 28 Disemba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike