Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Disemba 2026 › 26 Disemba
Kalenda Ọtọdọks · 13 Disemba (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 26 Disemba 2026
Satọdee · Izu nke 30 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 4
Mmemme na ndị nsọ
Martyrs Eustratios, Auxentios, Eugene, Mardarius and Orestes at Sebaste († c. 284-305)
Obubu ọnụ Ọmụmụ
E kwere azụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
1Ya mere bụrụnụ ndị na-eṅomi Chineke, dị ka ụmụ a hụrụ nʼanya. 2Na-agakwanụ nʼime ịhụnanya, dịka Kraịst siri hụ anyị nʼanya ma were ndụ ya nye Chineke maka anyị dịka aja na onyinye nke isi ụtọ. 3Ma nʼetiti unu, ka a ghara ịkpọta mmehie ịkwa iko, maọbụ nke adịghị ọcha, maọbụ nke inwe anya ukwu aha, nʼihi na ihe ndị a ekwesighị nʼetiti ndị nsọ. 4Ọ dịkwaghị mma ka unu na-ekwu okwu rụrụ arụ maọbụ okwu nzuzu maọbụ njakịrị, kama ka e nwee inye ekele. 5Matanụ nke ọma na onye na-akwa iko, maọbụ onye rụrụ arụ, maọbụ onye anya ukwu, nʼihi na anya ukwu dị ka ikpere arụsị, enweghị ike ịbata nʼalaeze Kraịst na Chineke. 6Unu ekwela ka onye ọbụla jiri okwu efu duhie unu. Ọ bụ nʼihi omume ọjọọ ndị a ka iwe Chineke ji abịakwasị ndị na-anaghị erubere ya isi. 7Unu na ndị dị otu a enwela mmekọ. 8Nʼihi nʼoge gara aga, unu bụ ọchịchịrị, ma ugbu a, unu bụ ìhè nʼime Onyenwe anyị. Na-ebinụ ndụ ka ụmụ nke ìhè
Oziọma
18Ya mere, ọ na-ekwu sị, “Gịnị ka alaeze Chineke yiri? Gịnịkwa ka m ga-eji tụnyere ya? 19O yiri mkpụrụ mọstaadị nke mmadụ kụrụ nʼubi ya a gbara ogige. O toro ghọọ osisi, nke ụmụ nnụnụ na-ezukwa ike nʼalaka ya.” 20Ọzọ, ọ sịrị, “Gịnị ka m ga-eji tụnyere alaeze Chineke? 21Ọ dị ka ihe na-eko achịcha nke nwanyị gwakọtara na ọtụtụ atọ nke ụtụ ọka, tutu ruo mgbe o koro ụtụ ọka ahụ niile.” 22O jegharịrị nʼobodo ukwu na nʼobodo nta niile na-ezi ihe, ka ọ na-aga Jerusalem. 23Otu onye sịrị ya, “Onyenwe m, ndị a ga-azọpụta ha ga-adị ole na ole?” Ọ sịrị ha, 24“Gbalịsienụ ike banye site nʼọnụ ụzọ dị warawara, nʼihi na ana m a gwa unu na ọtụtụ ga-achọ ịbanye ma ha agaghị enwe ike. 25Ọ bụrụ na nna nwe ụlọ ebilie mechie ọnụ ụzọ, unu ga-eguzo na-ezi na-akụ aka nʼụzọ na-asị, ‘Onyenwe anyị meghere anyị ụzọ.’ “Na nzaghachi, ọ ga-asị, ‘Amaghị m ebe unu si bịa.’ 26“Nʼoge ahụ, unu ga-asị, ‘Anyị na gị rikọrọ, ṅụkọkwaa, ị kuzikwara nkuzi nʼogbe anyị.’ 27“Ma ọ ga-asị, ‘Amaghị m ebe unu siri bịa. Pụọnụ nʼihu m, unu ndị ajọ omume.’ 28“Ịkwa akwa na ịta ikikere eze ga-adịkwa mgbe unu ga-ahụ Ebraham, na Aịzik na Jekọb na ndị amụma niile ka ha nọ nʼalaeze Chineke; ma unu onwe unu abụrụ ndị a chụpụrụ nʼezi. 29Ndị mmadụ ga-esite nʼọwụwa anyanwụ, nakwa ọdịda anyanwụ, na nʼugwu na ndịda nke ụwa bịa nọdụ nʼoriri nʼime alaeze Chineke.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 13 Disemba na kalenda nzukọ bụ 26 Disemba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike