Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Disemba 2026 › 24 Disemba

Kalenda Ọtọdọks · 11 Disemba (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 24 Disemba 2026

Tọọzdee · Izu nke 30 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 4

Mmemme na ndị nsọ

Venerable Daniel the “Stylite” [Pillar-Dweller] of Constantinople († 489-490)

Obubu ọnụ Ọmụmụ

Obubu ọnụ: ya na mmanụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Akwụkwọ ozi

Hib 10:35–11:7

35Ya mere, unu ahapụkwala ntụkwasị obi unu ahụ, nʼihi na ọ na-eweta ụgwọ ọrụ dị ukwuu. 36Nʼihi ya, unu kwesiri inwe ndidi ka ọ ga-abụ na mgbe unu mere uche Chineke unu ga-anata ihe e kwere na nkwa. 37Nʼihi, “Na oge na-adịghị anya, onye ahụ nke na-abịa ga-abịa ọ gaghị anọkwa ọdụ.” 38Ma, “Onye ezi omume nkem ga-esite nʼokwukwe dị ndụ. Mkpụrụobi m agaghị e nwee mmasị nʼime onye ọbụla na-alaghachi azụ.” 39Ma anyị abụghị ndị na-alaghachi azụ si otu a laa nʼiyi. Kama anyị dịnyere ndị nwere okwukwe, bụrụkwa ndị a zọpụtara. 11:1Ugbu a, okwukwe bụ inwe obi ike banyere ihe ndị a na-ele anya ha na inwe owuweanya banyere ihe a na-ahụbeghị anya. 2Nʼihi na ọ bụ site nʼokwukwe ka e ji gbaara ndị ochie ama. 3Ọ bụ site nʼokwukwe ka anyị ji ghọta na e mere ụwa na ihe niile anyị na-ahụ anya site nʼokwu Chineke. Nʼihi nke a, ihe anyị na-ahụ anya ugbu a bụ ihe e mere site nʼihe anyị na-adịghị ahụ anya. 4Ebel sitere nʼokwukwe chụọ aja dị mma nye Chineke karịa aja nke Ken chụrụ; nke e si na ya gụnye ya nʼonye ezi omume. Chineke kwuru okwu banyere onyinye ya. Ma ugbu a, ọ bụ ezie na ọ nwụọlarị ma ọ ka na-ekwu okwu site nʼokwukwe. 5E sitere nʼokwukwe kupu Enọk nke pụtara na ọ nwụghị anwụ, a hụkwaghị ya ọzọ nʼihi na Chineke akpọrọla ya. Ma tupu e kuru ya, e mere ka anyị mara na ọ mere ihe masịrị Chineke. 6Ọ bụ ihe siri ike mmadụ ime ihe ga-atọ ya ụtọ ma ọ bụrụ na onye ahụ enweghị okwukwe. Nʼihi na onye na-abịakwute Chineke nso aghaghị ikwe na ọ dị. Na ọ bụkwa onye na-akwụghachi onye ọbụla na-achọsi ya ike ụgwọ. 7Site nʼokwukwe, Noa, onye nke a dọrọ aka na ntị gbasara ihe ndị a na-ahụbeghị anya, gere ntị ma ruo ụgbọ mmiri maka nzọpụta nke ezinaụlọ ya. Site na nke a, ọ mara ụwa ikpe, ma bụrụ onye nketa nke ezi omume sitere nʼokwukwe.

Oziọma

Luk 21:28–33

28Mgbe ihe ndị a malitere ime, guzoronụ ọtọ welie isi unu elu, nʼihi na oge mgbapụta unu dị nso.” 29Ọ tụụrụ ha ilu a, “Leenụ osisi fiig na osisi ndị ọzọ niile anya. 30Mgbe ha bidoro ipupụta ahịhịa ọhụrụ, unu na-amata na ọkọchị adịla nso. 31Nʼụzọ dị otu a kwa, mgbe unu hụrụ ihe ndị a niile ka ha na-eme, matanụ na alaeze Chineke adịla nso. 32“Nʼezie agwa m unu, ọgbọ a agaghị agabiga tupu ihe ndị a niile emezuo. 33Eluigwe na ụwa ga-agabiga, ma okwu m enweghị ike ịgabiga.

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 11 Disemba na kalenda nzukọ bụ 24 Disemba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike