Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Disemba 2026 › 23 Disemba
Kalenda Ọtọdọks · 10 Disemba (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 23 Disemba 2026
Wenezdee · Izu nke 30 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 4
Mmemme na ndị nsọ
Martyrs Minos, Hermogenes, and Eugraphos of Alexandria († c. 313)
Obubu ọnụ Ọmụmụ
Obubu ọnụ: nri esiri esi na-enweghị mmanụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
1Iwu ahụ bụ naanị onyinyo na-egosi ihe ọma gaje ịbịa. Nʼihi ya, o zughị oke nʼonwe ya isite nʼaja ndị ahụ a na-achụ mgbe mgbe kwa afọ, mee ka ndị ahụ na-abịaru nso ife ofufe zuo oke. 2Ma ọ bụghị otu a, ọ bụ na a gabeghị akwụsị ịchụ aja ndị a? Ọ bụrụ na a sachapụla njọ ndị na-efe ofufe na mbụ, akọnuche ha agaghịkwa ama ha ikpe mmehie ha. 3Ma nke bụ eziokwu bụ na ihe aja ndị a na-eme bụ ichetara ha mmehie ha kwa afọ niile. 4Nʼihi na ọ bụ ihe na-apụghị ime eme na ọbara oke ehi na nke ụmụ ewu dị iche iche ga-asachapụ mmehie. 5Ya mere mgbe Kraịst bịara nʼụwa, ọ sịrị, “Aja na onyinye abụghị ihe ị chọrọ kama ị kwadoro ahụ nye m. 6Aja nsure ọkụ na aja a chụrụ maka mmehie, ha abụghị ihe dị ezi mma nye gị. 7Mgbe ahụ ka m sịrị, ‘Lee, abịala m Chineke m, ime ihe ị na-achọ. Nke a bụkwa ihe e dere banyere m nʼime akwụkwọ mpịakọta.’ ” 8O kwuru na mbụ, “Aja dị iche iche, na onyinye, na aja nsure ọkụ na aja mmehie adịghị atọ gị ụtọ, ha adịghịkwa amasị gị” (a chụrụ aja ndị a dịka iwu si dị). 9O kwukwara ọzọ, “Lee abịala m ime uche gị.” Ọ kagburu aja nke mbụ ahụ ma were aja nke abụọ dochie nʼọnọdụ ya. 10Site nʼime uche Chineke, e mere ka anyị dị nsọ site nʼaja Jisọs Kraịst ji onwe ya chụọ naanị otu ugboro. 11Onye nchụaja ọbụla na-eguzo kwa ụbọchị na-efe ofufe, na-achụkwa otu aja ahụ ugboro ugboro, bụ aja nke na-enweghị ike ịsachapụ mmehie. 12Ma mgbe Kraịst chụchara naanị otu aja ahụ, otu ugboro nʼihi mmehie niile, ọ nọdụrụ ala nʼaka nri Chineke. 13Ebe ahụ ka ọ nọ ugbu a na-eche ka ndị iro ya niile bụrụ ihe mgbakwasị ụkwụ ya. 14Nʼihi na o sitela nʼotu aja mee ka ndị ahụ a na-eme ka ha dịrị nsọ zuo oke mgbe niile. 15Mmụọ nsọ na-agbakwara anyị ama banyere ihe ndị a mgbe o buru ụzọ kwuo: 16“Nke a bụ ọgbụgba ndụ ahụ mụ na ha ga-agba mgbe oge ndị ahụ gasịrị, ka Onyenwe anyị kwuru. Aga m etinye iwu m nʼobi ha. Aga m edekwasịkwa ha nʼuche ha.” 17O kwukwara sị, “Agaghị m echetakwa mmehie ha na mmebi iwu ha niile ọzọ.” 18Ya mere, ebe ọ bụ na a gbagharala mmehie ndị a, ọ dịkwaghị mkpa ịchụ ajọ ọzọ maka mgbaghara mmehie.
Oziọma
5Mgbe ụfọdụ na-ekwu okwu banyere otu e si were nkume mara mma na onyinye e chere nʼihu Chineke, chọọ ụlọnsọ ukwu ahụ mma, ọ sịrị, 6“Ma banyere ihe ndị a, oge na-abịa mgbe ihe ndị a niile unu na-ahụ na-agaghị adịkwa. Ọ dịghị otu nkume a ga-ahapụ nʼelu ibe ya, a ga-akwatusị ha niile.” 7Ha jụrụ ya sị, “Onye ozizi, olee mgbe ihe ndị a ga-emezu? Gịnị ga-abụkwa ihe ịrịbama ga-egosi na ha na-aga imezu?” 10Mgbe ahụ, ọ sịrị ha, “Mba ga-ebili megide mba, alaeze ga-ebilikwa megide alaeze. 11A ga-enwe ala ọma jijiji dị ukwuu. Ụnwụ na ọrịa ọjọọ dị iche iche ga-adịkwa nʼebe dị iche iche. A ga-ahụ ihe dị egwu na ihe ịrịbama dị ukwuu site na mbara eluigwe. 20“Mgbe unu hụrụ ka ndị agha gbara Jerusalem gburugburu, matanụ na oge e ji ala ya nʼiyi eruola. 21Nʼoge ahụ ka ndị nọ na Judịa gbalaga nʼugwu, ka ndị nọ nʼime obodo si na ya pụta, ka ndị na-anọghị nʼobodo gharakwa ịba nʼime ya. 22Nʼihi na oge a ga-abụ oge ịbọ ọbọ ka e mezuo ihe niile akwụkwọ nsọ kwuru. 23Ma ahụhụ ga-adịrị ndị dị ime, na ndị na-enye ụmụaka ara, nʼụbọchị ahụ! A ga-enwe oke ihe mgbu nʼala a, iwe ga-adakwasịkwa ụmụ mmadụ. 24Mma agha ga-egbu ha, mba niile ga-adọrọkwa ha nʼagha. Ndị mba ọzọ ga na-azọtọsị Jerusalem nʼụkwụ ruo mgbe oge nke ndị mba ọzọ ahụ zuru.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 10 Disemba na kalenda nzukọ bụ 23 Disemba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike