Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Disemba 2026 › 22 Disemba

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 22 Disemba 2026

Tiuzdee · Izu nke 4 nke Advent

Mmemme na ndị nsọ

22 Disemba

Ụbọchị izu · Agba ofufe: odo odo

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

1Sa 1:24–28

24Mgbe ọ kwụsịrị nwantakịrị ahụ ịṅụ ara, nwantakịrị ahụ ka dị ntakịrị. Ma o duuru ya, jiri oke ehi gbara afọ atọ, na iri lita ụtụ ọka abụọ na abụọ, na otu karama mmanya, gaa nʼụlọ Onyenwe anyị dị na Shaịlo. 25Mgbe ha ji oke ehi ahụ chụsịa aja, ha kpọtaara Elayị nwantakịrị ahụ. 26Mgbe ahụ, ọ sịrị, “Onyenwe m, dịka ị si na-adị ndụ, ọ bụ m bụ nwanyị ahụ guzoro onwe ya nso nʼebe ị nọ kpee ekpere nye Onyenwe anyị. 27Nʼihi nwa a ka m kpere ekpere, Onyenwe anyị emelara m ihe m rịọrọ nʼaka ya. 28Ma ugbu a, ana m enyeghachi ya Onyenwe anyị ka ọ bụrụ nke ya ndụ ya niile.” O fere Onyenwe anyị ofufe nʼebe ahụ.

Abụ Ọma nzaghachi

1Sa 2:1, 4–8

1Mgbe ahụ Hana kpere ekpere sị: “Obi m na-aṅụrị ọṅụ nʼime Onyenwe anyị; nʼime Onyenwe anyị ka e buliri mpi m elu. Ọnụ m na-anya isi megide ndị iro m, nʼihi na-enwere m mmasị na nzọpụta gị. 4“Ụta ndị na-ebu agha agbajiela ma ndị ahụ dara mba ka e nyere ike. 5Ndị na-eriju afọ e meela onwe ha ndị ọrụ ngo maka nri, ma ndị na-adịghị eriju afọ na mbụ aghọọla ndị agụụ adịghị agụkwa. Nwanyị aga amụtala ụmụ asaa ma nwanyị ahụ mụrụ ọtụtụ ụmụ adịghị amụtakwa. 6“ Onyenwe anyị na-eweta ọnwụ, ya na-emekwa ka a dị ndụ, ọ bụ ya na-eme ka mmadụ daa nʼụra ọnwụ, na-emekwa ka ha dị ndụ ọzọ. 7Onyenwe anyị na-ezite ụbịam na akụnụba; ọ na-eweda nʼala, ma na-ebulikwa elu. 8Ọ na-esite na ntụ welite onye ogbenye na-ebuli ndị mkpa na-akpa site nʼikpo ntụ. Ọ na-eme ka ha soro ụmụ eze nọdụ, na-emekwa ka ha keta ocheeze nsọpụrụ. “Nʼihi na ntọala ụwa bụ nke Onyenwe anyị nʼelu ya ka ọ dọkwasịrị ụwa.

Oziọma

Luk 1:46–56

46Ma Meri sịrị, “Mkpụrụobi m na-ebuli Onyenwe anyị elu 47mmụọ m na-aṅụrị ọṅụ nʼime Chineke bụ Onye nzọpụta m, 48nʼihi na o ledatala anya, lekwasị m, bụ odibo ya dị ala. Site ugbu a gaa nʼihu, ọgbọ niile ga-akpọ m onye a gọziri agọzi. 49Nʼihi na Onye dị ike emeelara m ihe dị ukwuu. Aha ya dịkwa nsọ. 50Ebere ya na-erute ndị niile na-atụ egwu ya site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ. 51O gosila ike aka ya; ọ chụsasịala ndị dị mpako nʼime echiche obi ha. 52O sitela nʼocheeze ndị eze dị ike kwatuo ha, buliekwa ndị dị umeala nʼobi elu. 53O jirila ihe dị mma nyejuo ndị agụụ na-agụ afọ ma ndị ọgaranya ka o zipụrụ nʼaka efu. 54O nyerela odibo ya bụ Izrel aka, ọ na-echetakwa imere ya ebere. 55Dị ka ọ gwara nna nna anyị ha, nye Ebraham na ụmụ ụmụ ya ruo mgbe ebighị ebi.” 56Meri nọnyeere ya ihe dịka ọnwa atọ ma mesie laghachi nʼụlọ ya.

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike