Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Disemba 2026 › 21 Disemba

Kalenda Ọtọdọks · 8 Disemba (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 21 Disemba 2026

Mọnde · Izu nke 30 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 4

Mmemme na ndị nsọ

Venerable Patapios of Thebes (7th C)

Obubu ọnụ Ọmụmụ

Obubu ọnụ: nri esiri esi na-enweghị mmanụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Akwụkwọ ozi

Hib 8:7–13

7Ọ bụrụ na ọgbụgba ndụ ochie ahụ zuruoke, ọ garaghị aba uru ka achọwa ọgbụgba ndụ ọzọ. 8Ma Chineke chọpụtara ezughị oke ha mgbe ọ sịrị, “Lee, oge na-abịa, ka Onyenwe anyị kwupụtara, mgbe m ga-eme ka ọgbụgba ndụ ọhụrụ dịrị nʼetiti mụ na ụlọ Izrel, nakwa ụlọ Juda. 9Ọ bụghị ụdị ọgbụgba ndụ mụ na nna nna ha gbara, mgbe m jidere ha nʼaka site nʼala Ijipt dupụta ha, nʼihi na ha anọgideghị bụrụ ndị kwesiri ntụkwasị obi idebe ọgbụgba ndụ m. Nʼihi ya, echepụrụ ihu m nʼebe ha nọ, ka Onyenwe anyị kwupụtara. 10Ma nke a bụ ọgbụgba ndụ m ga-eme ka ọ dịrị nʼetiti mụ onwe m na ụlọ Izrel, mgbe oge ndị ahụ gasịrị, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. Aga m etinye iwu m nʼime uche ha, dekwasị ya nʼobi ha. Aga m abụ Chineke ha, ha onwe ha ga-abụkwa ndị m. 11Ọ dịghị onye ọbụla nʼetiti ha ga-akụziri onye agbataobi ya ihe, maọbụ otu onye asị ibe ya, ‘Mara Onyenwe anyị,’ nʼihi na ha niile ga-ama onye m bụ, site nʼonye dịkarịsịrị nta ruo nʼonye dịkarịsịrị ukwuu. 12Nʼihi na aga m agbaghara ajọ omume ha, agaghị m echetakwa mmehie ha niile ọzọ.” 13Mgbe o kwuru okwu banyere ọgbụgba ndụ ọhụrụ, ọ pụtara na nke ochie ahụ abụrụla ihe gabigara agabiga. Ihe dị ochie nke gabigara ga-emesịa ghara ịdịkwa.

Oziọma

Luk 20:27–44

27Ụfọdụ ndị Sadusii, ndị sị na mbilite nʼọnwụ adịghị, bịakwutere ya 28ma jụọ ya sị, “Onye ozizi, Mosis deere anyị na ọ bụrụ na nwanne nwoke mmadụ anwụọ hapụ nwunye ya na-amụtaghị nwa, na nwoke dị otu a ga-alụrụ nwunye nwanne ya nwoke ahụ, sị otu a, mụtara nwanne ya ụmụ. 29Ugbu a, e nwere ụmụnne nwoke asaa, onye nke mbụ lụrụ nwanyị, nwụọ na-amụtaghị nwa. 30Nke abụọ kwa 31na onye nke atọ lụrụkwara ya. Nʼotu aka ahụ ha asaa lụchara ya ma nwụọ na-amụtaghị nwa. 32Nʼikpeazụ nwanyị ahụ nʼonwe ya nwụkwara. 33Ya mere, nʼoge mbilite nʼọnwụ nwunye onye ka ọ ga-abụ? Nʼihi na ha asaa lụchara ya?” 34Jisọs gwara ha, “Ndị nke ọgbọ a na-alụ nwunye, ma na-enyekwa ụmụ ha ka a lụrụ ha. 35Ma ndị ahụ a gụrụ dị ka ndị kwesiri isoro keta oke nʼọgbọ ahụ, nakwa na mbilite nʼọnwụ agaghị alụ di na nwunye. 36Nʼezie, ha apụghịkwa ịnwụ ọzọ, nʼihi na ha dị ka ndị mmụọ ozi. Ha bụ ụmụ Chineke, nʼihi na ha bụ ụmụ nke mbilite nʼọnwụ. 37Ọ bụladị Mosis nʼonwe ya zipụtara na mbilite nʼọnwụ dị, nʼakụkọ banyere ọhịa ahụ na-ere ọkụ, mgbe ọ na-akpọ Onyenwe anyị ‘Chineke nke Ebraham, Chineke nke Aịzik na Chineke nke Jekọb.’ 38Ọ bụghị Chineke nke ndị nwụrụ anwụ, kama ọ bụ nke ndị dị ndụ, nʼihi nʼebe ọ nọ mmadụ niile dị ndụ.” 39Ụfọdụ ndị ozizi iwu zara ya sị, “Onye ozizi, ị kwuru nke ọma.” 40O nwekwaghị onye ọbụla jụrụ ya ajụjụ ọzọ. 41Ma ọ sịrị ha, “Olee otu ha si kwuo na Kraịst ahụ bụ nwa Devid? 42Devid nʼonwe ya kwupụtara nʼakwụkwọ Abụ Ọma, sị: “ ‘Onyenwe anyị gwara Onyenwe m, “Nọdụ ala nʼaka nri m 43ruo mgbe m ga-eme ndị iro gị ihe mgbakwasị ụkwụ nye ụkwụ gị.” ’ 44Devid nʼonwe ya kpọrọ ya ‘Onyenwe anyị.’ Oleekwanụ otu o si bụrụ nwa ya?”

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 8 Disemba na kalenda nzukọ bụ 21 Disemba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike