Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Disemba 2026 › 17 Disemba

Kalenda Ọtọdọks · 4 Disemba (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 17 Disemba 2026

Tọọzdee · Izu nke 29 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 3

Mmemme na ndị nsọ

Great Martyr Barbara and Martyr Juliana, at Heliopolis in Syria († c. 306)

Obubu ọnụ Ọmụmụ

Obubu ọnụ: ya na mmanụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Akwụkwọ ozi

Hib 7:1–6

1Melkizedek a bụ eze Salem, bụrụkwa onye nchụaja Chineke Onye kachasị ihe niile elu. Ọ zutere Ebraham mgbe o si na mmeri o meriri ọtụtụ ndị eze ahụ na-alọghachi, gọziekwa ya. 2Ebraham nyekwara ya otu ụzọ nʼime ụzọ iri nke ihe niile. Ihe mbụ aha ya pụtara bụ, “eze ezi omume,” ọzọkwa bụ “eze nke Salem,” nke pụtara, “eze udo.” 3O nweghị nna, o nwekwaghị nne, nke ọ na-enwe agbụrụ. O nweghị mmalite nke ụbọchị a mụrụ ya, maọbụ ọgwụgwụ ndụ, e mere ya dị ka Ọkpara Chineke. Ọ na-anọgide bụrụ onye nchụaja ruo mgbe ebighị ebi. 4Leenụ otu o siri bụrụ onye dị ukwuu, ọ bụladị Ebraham bụ nna nna anyị nyere ya otu ụzọ nʼime ụzọ iri site nʼihe ọ kwatara nʼagha! 5Ma otu ọ dị, iwu kwadoro ka ụmụ Livayị bụ ndị ghọrọ ndị nchụaja na-anakọta otu ụzọ nʼime ụzọ iri site nʼaka ndị ọzọ, ya bụ, site nʼaka ndị ụmụnna ha ndị Izrel, nʼagbanyeghị na ụmụnna ha ndị ahụ bụkwa ụmụ ụmụ Ebraham. 6Ma nwoke a bụ onye na-esiteghị nʼagbụrụ naara otu ụzọ nʼụzọ iri site nʼaka Ebraham ma gọziekwa ya bụ onye ahụ nke natara nkwa ahụ.

Akwụkwọ ozi (maka Fraịdee)

Hib 7:18–25

18Nʼotu aka ahụ, e wezugala usoro iwu ochie ahụ nʼihi adịghị ike ya na nʼihi abaghị uru ya 19(nʼihi na iwu ahụ emeghị ka ihe ọbụla zuo oke), ma nʼaka nke ọzọ, e webatala olileanya ka mma, bụ nke anyị na-esite na ya bịaruo Chineke nso. 20Ma e ji ịṅụ iyi mee ka ọnọdụ onyeisi nchụaja a guzosie ike. O nweghị iyi a ṅụrụ mgbe ndị ọzọ ghọrọ ndị nchụaja. 21Ma onye nke a ghọrọ onye nchụaja site nʼịṅụ iyi mgbe onye ahụ gwara ya, “Onyenwe anyị aṅụọla iyi, ọ gaghị agbanwe obi ya, ‘Ị bụ onye nchụaja ruo mgbe ebighị ebi.’ ” 22Nʼihi nke a, Jisọs aghọọla onye na-akwagide ọgbụgba ndụ ka mma. 23Ihe ọzọ, ndị nchụaja nke ochie ahụ dị ọtụtụ nʼọnụọgụgụ nʼihi na ọnwụ gbochiri ha ịga nʼihu nʼọrụ ha. 24Ya mere, ebe ọ na-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi, ọ na-abụkwa onyeisi nchụaja mgbe niile. 25Ya mere o nwere ike ịzọpụta ruo mgbe niile ndị ahụ na-abịakwute Chineke site na ya, nʼihi na ọ na-adị ndụ ruo mgbe niile ịrịọ arịrịọ nʼihi ha.

Oziọma

Luk 20:9–18

9Ọ gara nʼihu tụọrọ ndị mmadụ ilu a sị, “Otu nwoke nwere ubi vaịnị, nke o nyefere nʼaka ndị ga-elekọta ya anya ma pụọ gaa njem nʼala ọzọ ebe ọ nọrọ ogologo oge. 10Mgbe oge iwe ihe ubi ruru, o zigara otu nʼime ndị ohu ya ka ọ bịakwute ndị ahụ na-elekọtara ya ubi, ka ha nyekwa ya ụfọdụ nʼime mkpụrụ ubi vaịnị ahụ. Ma ndị na-elekọtara ya ubi jidere ya, tie ya ihe, zilaga ya nʼaka efu. 11O zigakwara ohu ya ọzọ. Ma ha tikwara ya ihe mee ya ihe ihere, zilakwaa ya nʼaka efu. 12O zigakwara onye nke atọ, ma ha merụrụ ya ahụ, chụlaa ya. 13“Mgbe ahụ, onyenwe ubi vaịnị ahụ sịrị, ‘Gịnị ka m ga-eme? Aga m ezigara ha ọkpara m, nke m hụrụ nʼanya, ma eleghị anya ha ga-asọpụrụ ya.’ 14“Ma mgbe ndị na-elekọta ubi ahụ hụrụ ya, ha kwurịtara nʼetiti onwe ha, sị, ‘Onye a bụ onye nketa ihe niile a, ka anyị gbuo ya, ka ihe nketa a bụrụzia nke anyị.’ 15Ya mere, ha kpụfere ya nʼazụ ubi vaịnị ahụ, gbuo ya. “Gịnị ka onye nwe ubi ahụ ga-eme ha? 16Ọ ga-abịa, laa ndị ahụ na-elekọta ubi ahụ nʼiyi, were ubi vaịnị ahụ nye ndị ọzọ.” Mgbe ndị ahụ nụrụ nke a, ha sịrị, “Chineke ekwela.” 17O legidere ha anya sị, “Gịnịkwa ka unu chere na ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ pụtara, “ ‘Nkume ahụ ndị na-ewu ụlọ jụrụ aghọọla nkume nke isi ntọala ụlọ’? 18Onye ọbụla nke dakwasịrị nʼelu nkume ahụ, ka a ga-etiwasị, ma onye ọbụla ọ dakwasịrị, ka ọ ga-egwepịa.”

Oziọma (maka Fraịdee)

Luk 20:19–26

19Ndị ozizi iwu na ndịisi nchụaja chọrọ ụzọ ha ga-esi jide ya nʼotu oge ahụ nʼihi na ha matara na ọ bụ ha ka o bu nʼobi tụọ ilu ahụ, ma ha tụrụ egwu ndị mmadụ. 20Ya mere, ha chere ya nche nke ọma, ma zipụ ndị nnyopụta, ndị mere onwe ha dịka ndị ezi omume, ka ha chọpụta ma o nwere ụzọ ha ga-esi jide ya site nʼihe ọ ga-ekwu, ka ha site na nke a nyefee ya nʼaka ọchịchị na ike onyeisi ala. 21Ya mere ndị nnyopụta ahụ jụrụ ya sị, “Onye ozizi, anyị mara na i na-ekwu ma na-ezikwa ihe ziri ezi, matakwa na i dịghị ele mmadụ anya nʼihu, kama ị na-ezi ụzọ Chineke dị ka eziokwu si dị. 22O ziri ezi nʼiwu ka anyị tụọ ụtụ isi nye Siza, ka ọ bụ na o zighị ezi?” 23Ma ọ matara na nke a bụ ajụjụ aghụghọ, ya mere ọ sịrị ha, 24“Gosinụ m otu mkpụrụ ego denarị. Isi onye ka e sere nʼelu ya, aha onye ka e dekwasịkwara ya?” Ha sịrị, “Ọ bụ nke Siza.” 25Ọ sịrị ha, “Ya mere, nyenụ Siza ihe bụ nke Siza, nyekwanụ Chineke ihe bụ nke Chineke.” 26Ha enweghị ike ijide ya nʼihi ihe o kwuru nʼebe ahụ, nʼihu ọha mmadụ. Ọsịsa ya juru ha anya, ha mechikwara ọnụ.

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 4 Disemba na kalenda nzukọ bụ 17 Disemba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike