Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Disemba 2026 › 17 Disemba

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 17 Disemba 2026

Tọọzdee · Izu nke 3 nke Advent

Mmemme na ndị nsọ

17 Disemba

Ụbọchị izu · Agba ofufe: odo odo

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Jen 49:1–2, 8–10

1Mgbe ahụ, Jekọb kpọkọtara ụmụ ya ndị ikom niile nʼotu sị ha, “Zukọọnụ ka m gwa unu ihe ga-adakwasị unu nʼụbọchị dị nʼihu. 2“Zukọọnụ nụrụ, ụmụ ndị ikom Jekọb nụrụ okwu nna unu Izrel. 8“Gị, Juda, ụmụnne gị ga-eto gị. Aka gị ga-adị nʼolu ndị iro gị. Ụmụ ndị ikom nna gị ga-akpọ isiala nye gị. 9Ị bụ nwa ọdụm, gị, Juda, i si nʼịchụ nta lọta, nwa m. Dịka ọdụm, ọ na-amakpu, na-edina ala, dịka nne ọdụm, onye ga-anwa anwa kpọtee ya? 10Mkpanaka eze agaghị esite nʼebe Juda nọ wezuga onwe ya, maọbụ mkpanaka onyendu esi nʼagbata ụkwụ ya pụọ, tutuu ruo mgbe eze ahụ nwe ya ga-abịa, irube isi nke mba niile ga-abụ nke ya.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 72:1–4, 7–8, 17

1Abụ nke Solomọn. O Chineke, jiri ikpe ziri ezi mejupụta eze. Nyekwa nwa eze ezi omume gị. 2Ọ ga-eji ezi omume chịa ndị gị, jiri ikpe ziri ezi chịa ndị a na-emegbu. 3Ka ugwu niile wetara ndị mmadụ ịba ụba; ugwu nta niile wetakwara ha mkpụrụ ezi omume. 4Ọ ga-ekpepụta ndị a na-emegbu nʼetiti ndị mmadụ, zọpụtakwa ụmụntakịrị ndị nọ na mkpa; ọ ga-egwepịa onye mmegbu. 7Nʼoge ndụ ya, ka ndị ezi omume too, na-awasa; ịba ụba ga-ejupụta ebe niile ruo mgbe ọnwa agaghị adịkwa. 8Ọ ga-achị site nʼosimiri ruo osimiri, na-esite nʼiyi ukwu. ruo na nsọtụ niile nke ụwa 17Ka aha ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi; ka ọ na-adịgide ruo mgbe niile dịka anyanwụ si adịgide. A ga-esite na ya gọzie mba niile, a ga-akpọ ya onye a gọziri agọzi.

Oziọma

Mat 1:1–17

1Nke a bụ ndekọ usoro ọmụmụ Jisọs onye bụ Kraịst, nwa Devid, nwa Ebraham. 2Ebraham mụrụ Aịzik, Aịzik amụọ Jekọb, Jekọb amụọ Juda na ụmụnne ya. 3Juda mụtara Perez na Zera site na Tama, Perez mụrụ Hezrọn, Hezrọn amụọ Aram. 4Aram mụrụ Aminadab, Aminadab mụrụ Nashọn, Nashọn amụọ Salmọn. 5Salmọn bụ nna Boaz, site na nwunye ya Rehab, Boaz mụrụ Obed, site na nwunye ya Rut, Obed amụọ Jesi. 6Jesi amụọ Devid, bụ eze. Devid mụrụ Solomọn site na nwunye ya Ụraya. 7Solomọn mụrụ Rehoboam, Rehoboam amụọ Abija, Abija amụọ Esa. 8Esa mụrụ Jehoshafat, Jehoshafat amụọ Joram, Joram amụọ Ụzaịa. 9Ụzaịa mụrụ Jotam, Jọtam amụọ Ehaz, Ehaz amụọ Hezekaya. 10Hezekaya mụrụ Manase, Manase amụọ Emọn, Emọn amụọ Josaya. 11Mgbe e mere ka ha gaa biri nʼala Babilọn ka Josaya mụrụ Jekonaya na ụmụnne ya. 12Mgbe ha si Babilọn lọta Jekonaya mụrụ Shealtiel, Shealtiel amụọ Zerubabel. 13Zerubabel mụrụ Abiud, Abiud amụọ Eliakịm, Eliakịm amụọ Azoa. 14Azoa mụrụ Zadọk, Zadọk amụọ Akịm, Akịm amụọ Eliud. 15Eliud mụrụ Elieza, Elieza amụọ Matan, Matan amụọ Jekọb. 16Jekọb mụrụ Josef onye bụ di Meri nne Jisọs, onye a na-akpọ Kraịst. 17Ya mere, site nʼEbraham ruo na Devid, e nwere ọgbọ iri na anọ. Ma site nʼoge Devid ruo mgbe a dọọrọ ha nʼagha gaa Babilọn, e nwere ọgbọ iri na anọ. Sitekwanụ nʼoge ahụ ruo mgbe a mụrụ Kraịst bụkwa ọgbọ iri na anọ.

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike