Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Disemba 2026 › 16 Disemba

Kalenda Ọtọdọks · 3 Disemba (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 16 Disemba 2026

Wenezdee · Izu nke 29 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 3

Mmemme na ndị nsọ

Prophet Sophonius († 635-605 BC)

Obubu ọnụ Ọmụmụ

Obubu ọnụ: ya na mmanụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Akwụkwọ ozi

Hib 5:11–6:8

11Ọ dị ọtụtụ ihe ọzọ anyị nwere ikwu banyere ya, ma o siri ike ịkọwa ya nʼihi na unu adịghị amụta ihe ọsịịsọ. 12Nʼezie, ugbu a, unu kwesiri ịbụ ndị ozizi nye ndị ọzọ, ma unu ka nọ na-achọ onye ga-ezikwa unu ụkpụrụ mbụ nke okwu Chineke. Unu na-achọ mmiri ara kama nri siri ike. 13Onye ọbụla nke na-aṅụ ara, ka bụ nwantakịrị, ọ matabeghị ozizi banyere ezi omume. 14Nri dị ike dịrị ndị tozuru oke, ndị siterela nʼihe ha na-eme zụọ onwe ha ịchọpụta ihe dị iche nʼetiti ezi ihe na ajọ ihe. 6:1Ya bụ ka anyị na-aga nʼihu nʼihe mmụta zuru ezu, ka anyị gharakwa ịnọgide nʼihe mmụta mbụ ahụ nke anyị nwere banyere Kraịst. Anyị agaghị alaghachi azụ ịtọ ntọala nchegharị ọzọ site nʼọrụ ndị nwụrụ anwụ nʼokwukwe nʼebe Chineke nọ, 2na-akụzi banyere ime baptizim na ibikwasị aka nʼisi na onyinye nke Mmụọ Nsọ, na mbilite nʼọnwụ na ikpe ebighị ebi. 3Anyị ga-eme nke a ma Chineke kwe. 4Ma ọ dịghị mfe ịkpọghachi ndị dara ada ọzọ, bụ ndị natarala ihe ahụ na mbụ, ndị detụkwara onyinye amara dị iche iche nke si nʼeluigwe bịa ire, ndị ketakwara oke Mmụọ Nsọ, 5ndị detụkwara ịdị mma nke okwu Chineke ahụ ire na ike nke ụwa na-abịa, 6ma mesịa dahie nʼonwe ha, ọ bụ ihe siri ike ịkpọghachite ha ruo nchegharị. Ha na akpọgidekwa Ọkpara Chineke nʼobe ọzọ, na emenyekwa ya ihere nʼihu ọha mmadụ. 7Nʼihi na ala ahụ nke na-amị mmiri na-ezokwasị nʼelu ya mgbe niile, na-amịpụta mkpụrụ bara ụba nye ndị e ji maka ha kọọ ya, na-enweta ngọzị nʼaka Chineke. 8Ma ọ bụrụ na o puo naanị ogwu na ahịhịa, ọ baghị uru ọbụla. Kama, ọ ga-abụ ihe a bụrụ ọnụ, nke ọgwụgwụ ya ga-abụ ịkpọ ya ọkụ.

Oziọma

Luk 20:1–8

1Otu ụbọchị, ka ọ nọ nʼụlọnsọ ukwu na-ezi ndị mmadụ ihe na-ekwusakwa oziọma. Ndịisi nchụaja, na ndị ozizi iwu na ndị okenye bịakwutere ya. 2Ha sịrị ya, “Gwa anyị, olee ikike i ji na-eme ihe ndị a niile? Onye nyekwara gị ikike a?” 3Ọ zara ha sị, “Aga m ajụkwa unu otu ajụjụ. Gwanụ m, 4baptizim nke Jọn, o si nʼeluigwe ka o si nʼaka mmadụ?” 5Ha kparịtara ụka nʼetiti onwe ha ma sị, “Ọ bụrụ na anyị asị na o sitere nʼeluigwe, ọ ga-asị, ‘Gịnị mere unu na-ejighị kwenye na ya?’ 6Ọ bụrụkwanụ na anyị asị na, ‘o sitere nʼaka mmadụ,’ ndị mmadụ ga-atụ anyị nkume, nʼihi na ha niile kweere na Jọn bụ onye amụma.” 7Ya mere, ha zara, “Anyị amaghị ebe o si bịa.” 8Jisọs sịrị ha, “Enwekwaghị m ike ịgwa unu ikike m ji na-eme ihe ndị a.”

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 3 Disemba na kalenda nzukọ bụ 16 Disemba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike