Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Disemba 2026 › 18 Disemba
Kalenda Ọtọdọks · 5 Disemba (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 18 Disemba 2026
Fraịdee · Izu nke 29 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 3
Mmemme na ndị nsọ
Venerable Sabbas the Sanctified († 532)
Obubu ọnụ Ọmụmụ
Obubu ọnụ: ya na mmanụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
Ọ dịghị na nsụgharị a
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
Ọ dịghị na nsụgharị a
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
Ọ dịghị na nsụgharị a
Ofufe ụtụtụ: Oziọma
17Ya na ha rịdatara ga nʼebe ala dị larịị. Igwe ndị na-eso ụzọ ya na oke igwe mmadụ sitere na Judịa, na Jerusalem nakwa obodo dị na nsọtụ mmiri nke Taịa na Saịdọn. 18Ndị bịara ịnụrụ okwu ya na ka a gwọọ ha ọrịa ha. A gwọkwara ọtụtụ ndị mmụọ na-adịghị ọcha na-esogbu. 19Igwe mmadụ ahụ gbalịrị ịmetụ ya aka, nʼihi na ike dị ukwuu si ya nʼahụ na-apụ na-agwọ ha niile. 20O weliri anya lee ndị na-eso ụzọ ya, sị ha, “Ngọzị na-adịrị unu bụ ndị ogbenye, nʼihi na alaeze Chineke bụ nke unu. 21Ngọzị na-adịrị unu ndị agụụ na-agụ ugbu a, nʼihi na afọ ga-eju unu. Ngọzị na-adịrị unu ndị na-ebe akwa ugbu a, nʼihi na unu ga-achị ọchị. 22Ngọzị na-adịrị unu mgbe ndị mmadụ na-akpọ unu asị, mgbe ha na-achụpụ unu, na-akparị unu, na-ajụ aha unu, nʼihi Nwa nke Mmadụ. 23“Ṅụrịanụ ọṅụ ma wuliekwanụ elu nʼihi ọṅụ nʼụbọchị ahụ, nʼihi na ụgwọ ọrụ unu dị ukwuu nʼeluigwe. Nʼihi na otu a ka ndị nna nna ha mesoro ndị amụma.
Akwụkwọ ozi (maka Onye nsọ Sabas)
22Ma mkpụrụ nke Mmụọ Nsọ bụ, ndụ ịhụnanya, na ọṅụ, na udo, na ogologo ntachiobi, na obiọma, na ịdị mma, na ikwesi ntụkwasị obi, 23ịdị nwayọọ, na ijide onwe. Ọ dịkwaghị iwu na-emegide ihe ndị a. 24Ma ndị niile bụ ndị Kraịst Jisọs akpọgidela anụ ahụ ha, ya na ọchịchọ ha nʼelu obe. 25Ọ bụrụ na anyị na-ebi ndụ mmụọ, ka nzọ ụkwụ anyị bụrụ nke mmụọ na-eduzi. 26Ka anyị ghara ịbụ ndị mpako si otu a na-akpali iwe na ekworo nʼetiti anyị. 6:1Ụmụnna m, ọ bụrụ na-anwude onye ọbụla dabara na mmehie, unu onwe unu bụ ndị Mmụọ na-achị kwesiri iji mmụọ nke ịdị nwayọọ na obi dị umeala nyere onye ahụ aka, ime ka ọ gazie nʼezi ụzọ. Ma lezienụ onwe unu anya, onye ọbụla nʼime unu, nʼihi na a pụrụ ịnwakwa unu. 2Na-eburịtanụ nsogbu dịrị ibe unu, ma site nʼotu a ka unu nwee ike debezuo iwu Kraịst.
Oziọma (maka Onye nsọ Sabas)
27“Nna m enyefeela m ihe niile nʼaka. Ọ dịghị onye maara Ọkpara ahụ ma ọ bụghị Nna ya. Ọ dịkwaghị onye maara Nna karịa Ọkpara ahụ na ndị Ọkpara ahụ kwadoro igosi Nna ya. 28“Bịakwutenụ m unu niile ndị na-adọgbu onwe unu nʼọrụ, ndị e bokwasịrị ibu dị arọ. Aga m enyekwa unu izuike. 29Nyaranụ yoku nke m nʼolu unu, mụtakwanụ ihe site nʼaka m. Nʼihi na adị m nwayọọ, bụrụkwa onye dị umeala nʼobi. Unu ga-achọtakwara mkpụrụobi unu izuike. 30Nʼihi na yoku m dị mfe, ibu m adịghịkwa arọ.”
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 5 Disemba na kalenda nzukọ bụ 18 Disemba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike