Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Disemba 2026 › 2 Disemba
Kalenda Ọtọdọks · 19 Novemba (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 2 Disemba 2026
Wenezdee · Izu nke 27 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 1
Mmemme na ndị nsọ
Prophet Obadiah (9th C BC)
Obubu ọnụ Ọmụmụ
Obubu ọnụ: ya na mmanụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
22Ebikwasịkwala onye ọbụla aka nʼisi ọsịịsọ ime ya okenye maọbụ onye na-eje ozi. Ekwela ka i keta oke na mmehie ndị ọzọ. Debe onwe gị ọcha. 23Aṅụkwala naanị mmiri ọzọ, na-aṅụ ntakịrị mmanya maka afọ gị na nrịa nrịa nke na-arịa gị ọtụtụ mgbe. 24Mmehie ụfọdụ mmadụ na-apụta ihe ma na-ebukwa ha ụzọ rụọ oche ikpe, ma ndị ọzọ ka a na-ahụta mmehie ha nʼoge ikpeazụ. 25Otu a kwa, ọrụ ọma na-apụta ihe, ma ọ bụladị ndị na-apụtaghị ihe, apụghị izo ha ezo. 6:1Ndị niile bụ ohu ga-ahụ ndị nwe ha dị ka ndị ekwesiri inye ugwu na nsọpụrụ, ka a ghara ikwujọ aha Chineke na ozizi anyị. 2Ndị nke nwere ndị kwere ekwe dịka ndị nwe ha ekwesighị ilelị ha anya nʼihi na ha bụ ụmụnna ha. Kama, ha kwesiri ijere ndị nwe ha ozi nke ọma karịa, nʼihi na ndị na-erite uru nʼọrụ ha bụ ndị kwere ekwe bụrụkwa ndị anyị hụrụ nʼanya. Ihe ndị a ka ị ga-akụziri ha, dụkwaa ha ọdụ banyere ime nke a. 3Onye ọbụla na-ezi ihe ọzọ nke na-adabaghị nʼokwu ezi ntọala na-enye ndụ nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, ya na ozizi nke ibi ndụ kwesiri onye nke Chineke, 4bụ onye nganga na-afụli elu, ma bụrụkwa onye na-amaghị ihe. Ọchịchọ obi ya bụ nke na-ezighị ezi ma jupụtakwa nʼịrụ ụka na ekworo nke na-eweta ịkpọ asị na esemokwu, na nkwulu nakwa ajọ echiche, 5na isi ịrụ ụka niile nke na-esite nʼaka ụmụ mmadụ ndị echiche ha na-enweghịkwa eziokwu. Ha na-eche na ife Chineke bụ ụzọ e si aba ọgaranya. 6Ma ikpere Chineke bara uru nke ukwuu nye onye nwere afọ ojuju nʼihe ọbụla o nwere. 7Nʼihi na o nweghị ihe anyị ji nʼaka mgbe anyị bịara nʼụwa, otu a kwa, o nweghị ihe anyị ga-ewerekwa mgbe anyị ga-esi nʼụwa pụọ. 8Ya mere, ọ bụrụ na anyị enwe ihe oriri na uwe anyị ji ekpuchi ọtọ anyị, afọ kwesiri iju anyị nʼihe anyị nwere. 9Ma ndị na-achọ ịba ọgaranya na-adaba nʼọnwụnwa na nʼime ọnya na ọtụtụ ihe nzuzu na ọchịchọ ọjọọ niile dị iche iche nke na-enubanye ha nʼịla nʼiyi na mbibi. 10Nʼihi na ịhụ ego nʼanya bụ mgbọrọgwụ nke ime ihe ọjọọ niile dị iche iche. Ụfọdụ ndị hụrụ ego nʼanya, ndị na-achọsi ya ike, adapụla nʼokwukwe ha, si otu a tinye onwe ha nʼọtụtụ ọnọdụ na-ewetara ha obi ọjọọ na iru ụjụ. 11Ma gị bụ onye nke Chineke, gbaara ihe ndị a niile ọsọ. Ma chụsoo ezi omume na iyi Chineke, na okwukwe, na ịhụnanya, na ntachiobi, na ịdị nwayọ.
Oziọma
1Ugbu a, ndị ọna ụtụ na ndị mmehie na-abịa ya nso ịnụta ihe ọ na-ekwu. 2Ndị Farisii na ndị ozizi iwu tamuru ntamu na-asị, “Nwoke a na-anabata ndị mmehie sorokwa ha na-eri nri.” 3Ya mere, ọ tụrụ ha ilu a sị, 4“Ọ bụrụ na otu onye nʼime unu enwee narị atụrụ ma otu nʼime ha akpafuo. Ọ bụ na ọ gaghị ahapụ iri atụrụ itoolu na itoolu ahụ fọdụrụ nʼọzara, pụọ ịchọgharị otu ahụ kpafuru ruo mgbe ọ chọtara ya? 5Mgbe ọ chọtara ya, ọ ga-eji ọṅụ tụkwasị ya nʼubu ya. 6Mgbe ọ lọtara nʼụlọ ya, ọ ga-akpọkọta ndị enyi ya na ndị agbataobi ya sị ha, ‘Soronụ m ṅụrịa ọṅụ nʼihi na achọtala m atụrụ m furu efu.’ 7Asị m unu, nʼụzọ dị otu a, ọṅụ dị ukwu ga-adị nʼeluigwe nʼihi otu onye mmehie nke chegharịrị, karịa iri itoolu na itoolu ndị ezi omume bụ ndị nchegharị na-adịghị mkpa. 8“Maọbụ olee nwanyị nke nwere mkpụrụ ọlaọcha iri, ọ bụrụ nʼotu nʼime ha adafuo. Ọ gaghị amụnye oriọna, zaa ime ụlọ ya ịchọ otu mkpụrụ ego ahụ tutu ọ chọta ya? 9Mgbe ọ chọtara otu mkpụrụ ego ahụ, ọ ga-akpọ ndị enyi ya na ndị agbataobi ya sị ha, ‘Soronụ m ṅụrịa ọṅụ nʼihi na achọtala m ego m furu efu.’ 10Nʼụzọ dị otu a, asị m unu, ọṅụ ga-adị nʼihu ndị mmụọ ozi Chineke nʼihi otu onye mmehie nke chegharịrị.”
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 19 Novemba na kalenda nzukọ bụ 2 Disemba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike