Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Disemba 2026 › 2 Disemba

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 2 Disemba 2026

Wenezdee · Izu nke 1 nke Advent

Mmemme na ndị nsọ

Wenezdee nke izu nke 1 nke Advent

Ụbọchị izu · Agba ofufe: odo odo

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Aịz 25:6–10

6Nʼelu ugwu a, ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ga-anọ kwadooro ụwa niile oke oriri. Ọ ga-abụ oke oriri nke ga-adịrị ndị niile. Oke oriri nke ezi anụ na mmanya dị mma ga-adị. 7Nʼelu ugwu a, ka ọ ga-ewepụ ihe ndị ahụ niile na-eweta ihu mgbarụ, nke dị ka akwa e ji kpuchie mmadụ niile, nke kpuchikwara ihu ndị mba niile. 8Ọ ga-elomi ọnwụ ruo mgbe ebighị ebi. Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ga-ehicha anya mmiri niile site nʼihu mmadụ niile, ọ ga-ewezuga ihe ịta ụta niile dakwasịrị ndị ya site nʼụwa niile. Onyenwe anyị ekwuola ya. 9Nʼụbọchị ahụ, ndị mmadụ ga-asị, “Nke a bụ Chineke anyị nʼezie, anyị tụkwasịrị ya obi, ọ zọpụtakwara anyị. Nke a bụ Onyenwe anyị ahụ, anyị tụkwasịrị ya obi, ka anyị nwee ọṅụ ma ṅụrịakwa na nzọpụta ya.” 10Nʼihi na aka Onyenwe anyị ga-adịgide nʼelu ugwu a, ma a ga-azọtọ ndị Moab nʼọnọdụ ha, dịka esi azọda ahịhịa dị nʼokpuru ụkwụ mmadụ.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 23:1–6

1Abụ Ọma Devid. Onyenwe anyị na-azụ m dịka atụrụ, ọ dịghị ihe akọrọ m. 2Ọ na-eme ka m dinaa ala nʼebe ahịhịa ndụ na-eto, ọ na-edugharị m nʼakụkụ mmiri dị jụụ, 3ọ na-atụte mkpụrụobi m. Ọ na-edu m nʼụzọ niile nke ezi omume nʼihi aha ya. 4A sịkwarị na m na-aga ije, na ndagwurugwu nke ọchịchịrị ọnwụ, agaghị m atụ egwu ihe ọjọọ ọbụla; nʼihi na ị nọnyeere m, mkpọrọ gị na mkpanaka gị na-akasị m obi. 5Ị na-akwado tebul nʼihu m, nʼanya ndị iro m. I tere isi m mmanụ iko m na-ejubiga oke. 6Nʼezie, ịdị mma na ebere ga-agbaso m ogologo ụbọchị niile nke ndụ m, m ga-ebikwa nʼụlọ Onyenwe anyị mgbe niile ebighị ebi.

Oziọma

Mat 15:29–37

29Jisọs hapụrụ ebe ahụ lọghachi nʼakụkụ osimiri Galili. Ọ rịgooro nʼelu ugwu nọdụ ala. 30Igwe mmadụ dị ukwuu bịakwutere ya. Ha duteere ya ndị ngwụrọ, na ndị ìsì, na ndị aka ha na ndị ụkwụ ha kpọnwụrụ akpọnwụ, na ndị ogbi, na ọtụtụ ndị ọzọ. Ha tọgbọrọ ha nʼụkwụ ya, ọ gwọkwara ha niile. 31Ọ tụrụ mmadụ niile nʼanya mgbe ha hụrụ ndị ogbi ka ha bidoro ikwu okwu. Mgbe ha hụkwara na a gwọrọ ndị aka ha, na ndị ụkwụ ha nwụrụ anwụ, o jukwara ha anya ịhụ na ndị ngwụrọ gara ije, na ndị ìsì hụkwara ụzọ. Ha toro Chineke nke Izrel. 32Jisọs kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya sị ha, “Ana m emere igwe mmadụ ndị a obi ebere, nʼihi na mụ na ha anọọla ụbọchị atọ nʼebe a, ma ha eribeghị nri ọbụla. Agaghị m ezilaga ha na-erighị nri, nʼihi na ha nwere ike ịda nʼụzọ.” 33Ndị na-eso ụzọ ya sịrị, “Ebee ka anyị ga-enweta nri ga-ezuru igwe mmadụ ndị a nʼọzara a?” 34Jisọs jụrụ ha sị, “Ogbe achịcha ole ka unu nwere?” Ha sịrị ya, “Ogbe achịcha asaa na azụ ole na ole.” 35Ọ gwara igwe mmadụ ahụ ka ha nọdụ ala. 36O weere ogbe achịcha asaa na azụ ole na ole ahụ kelee Chineke ekele. Ọ nyawasịrị ha, nye ndị na-eso ụzọ ya. Ndị na-eso ụzọ ya nyekwara igwe mmadụ ahụ. 37Onye ọbụla nʼime ha riri, rijuo afọ. Ndị na-eso ụzọ ya tụtụkọtara iberibe ndị fọdụrụ nke juru nkata asaa.

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike