Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Disemba 2026 › 3 Disemba

Kalenda Ọtọdọks · 20 Novemba (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 3 Disemba 2026

Tọọzdee · Izu nke 27 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 1

Mmemme na ndị nsọ

Forefeast of the Entry of the Theotokos

Obubu ọnụ Ọmụmụ

Obubu ọnụ: ya na mmanụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Akwụkwọ ozi

1Tm 6:17–21

17Nye ndị bụ ọgaranya nʼoge ugbu a iwu ka ha ghara ịnya isi, maọbụ tụkwasị obi ha nʼakụnụba, nke a na-ejighị aka. Kama ka ntụkwasị obi ha dịrị na Chineke onye na-enyezu anyị ihe niile site nʼakụ ya nʼihi ime anyị obi ụtọ. 18Gwa ha ka ha na-eme ezi ihe, ka ha bụrụ ọgaranya nʼọrụ ọma niile, ka ha nwee obiọma na inyere ndị ọzọ aka, dịkwa njikere ikenye ndị ọzọ ihe site nʼihe ha nwere. 19Nʼụzọ dị otu a, ha na-akpadoro onwe ha akụ nke ga-abụrụ ha ntọala siri ike nʼọgbọ dị nʼihu, nke a ga-eme ka ha rite ndụ ahụ nke bụ ezigbo ndụ nʼuru. 20Timoti chebekwa ihe ndị ahụ e nyefere gị nʼaka, wezuga onwe gị site nʼokwu nzuzu nke rụrụ arụ, na ịrụ ụka nzuzu nke ha na-akpọ ihe ọmụma, 21bụ nke ụfọdụ kwupụtara, ma na ime nke a, ha esitela nʼụzọ okwukwe kpafuo. Ka amara dịnyere gị. Amen.

Akwụkwọ ozi (maka Fraịdee)

2Tm 1:1–2, 8–18

1Pọl, onyeozi Kraịst Jisọs, dị ka uche Chineke si dị, na dị ka nkwa ndụ nʼime Kraịst Jisọs si dị, 2Nye gị Timoti, ezi nwa m. Ka amara, na ebere na udo nke sitere na Chineke bụ Nna, na Kraịst Jisọs Onyenwe anyị dịrị gị. 8Ihere emela gị ikwupụta ama banyere Onyenwe anyị maọbụ banyere m bụ onye mkpọrọ ya. Kama, site nʼike Chineke, soro m hụọ ahụhụ nʼihi oziọma ahụ. 9Ọ zọpụtara anyị, kpọbata anyị na ndụ dị nsọ. Ọ bụghị nʼihi na anyị kwesiri ka a kpọọ anyị, kama, ọ bụ nʼihi nzube ya na amara ya. E nyere anyị amara nʼime Kraịst Jisọs tupu a tọọ ntọala ụwa a. 10Ugbu a, o meela ka ihe niile o zubere pụta ìhè site nʼọbịbịa Onye nzọpụta anyị Jisọs Kraịst, onye lara ike ọnwụ nʼiyi, zi anyị ụzọ anyị ga-esi nwee ndụ ebighị ebi site nʼoziọma ahụ. 11Nʼihi oziọma a, ahọpụtara m ka m bụrụ onye na-ekwusa oziọma a, na onyeozi, na onye nkuzi. 12Ọ bụkwa nʼihi nke a ka m ji na-ahụ ahụhụ ndị a nʼebe a, ma nʼeziokwu, ihere adịghị eme m, nʼihi na amaara m onye m na-atụkwasị obi, amakwaara m nke ọma, na o nwere ike ichebe ihe niile m nyere ya nʼaka idebe tutu ruo ụbọchị ahụ. 13Jidesie eziokwu ahụ aka ike, ụdị eziokwu ahụ mụ onwe m ziri gị, eziokwu ahụ gbasara okwukwe ahụ, na ịhụnanya ahụ dị nʼime Kraịst Jisọs. 14Chezie onyinye ọma ahụ e sitere nʼaka Mmụọ Nsọ bi nʼime gị nye gị idebe. 15Dị ka i maara, ndị niile si nʼEshịa bịa nʼebe a agbakụtala m azụ. Ọ bụladị Faigelọs na Hamogịnịs ahapụla m laa. 16Ka Onyenwe anyị mere ezinaụlọ Onisiferọs ebere, nʼihi ume ọ gbara m ọtụtụ mgbe. Ihere emeghị ya na-abụ m onye mkpọrọ. 17Mgbe ọ bịaruru Rom, ọ chọgharịrị m nʼebe niile, ma nʼikpeazụ, ọ chọtara m. 18Ka Onyenwe anyị kwe ka ọ nata ebere nʼaka Onyenwe anyị nʼụbọchị ahụ. Ị mara nke ọma ụdị aka o nyere m nʼEfesọs.

Oziọma

Luk 16:1–9

1Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Otu ọgaranya nwere otu onyeisi ọrụ nke e boro ebubo na ọ na-ala akụ ya nʼiyi. 2Ya mere ọ kpọrọ ya sị ya, ‘Gịnị bụ ihe a m na-anụ banyere gị? Gbakọọrọ m otu i si na-elekọta akụ m, nʼihi na achọkwaghị m ka ị bụrụ onyeisi ọrụ ọzọ.’ 3“Onyeisi ọrụ ahụ sịrị onwe ya, ‘Gịnị ka m ga-eme ugbu a nna m ukwu na-achọ ịkwụsị m ọrụ? Ike igwu ala adịghị m, ihere agakwaghị ekwe m ịrịọ arịrịọ. 4Amatala m ihe m ga-eme, nke a ga-enyere m aka ma ọ bụrụ na a chụpụ m nʼọrụ nʼebe a, aga m enweta ndị ga-anabata m nʼụlọ ha.’ 5“Ya mere ọ kpọrọ ndị niile ji nna ya ukwu ụgwọ nʼotu nʼotu. Ọ jụrụ onye nke mbụ sị, ‘Ego ole bụ ụgwọ i ji nna m ukwu?’ 6“Ọ sịrị ya, ‘Ọ bụ puku karama mmanụ oliv ka m ji ụgwọ ya.’ “Onyeisi ọrụ ahụ gwara ya sị, ‘Ngwangwa, were akwụkwọ degharịa ya narị karama ise.’ 7“Mgbe ahụ, ọ jụrụ onye nke abụọ sị, ‘Ego ole bụ ụgwọ i ji?’ “Ọ sịrị ya, ‘Ọ bụ narị akpa ọka wiiti.’ “Ọ sịrị ya, ‘Ngwangwa degharịa ya iri akpa ọka wiiti asatọ.’ 8“Nna ya ukwu toro onyeisi ọrụ ahụ na-ekwesighị ntụkwasị obi nʼihi na ọ kpara agwa dị ka onye nwere uche. Nʼihi na ụmụ, nke ọgbọ a, ji akọnuche na-eso ndị ọgbọ ha karịa ụmụ nke ìhè. 9Agwa m unu, jirinụ akụnụba nke ajọ omume metara onwe unu ndị enyi, ka ọ ga-abụ na mgbe ọ na-adịghịkwa akụ unu nwere, ha ga-anabata unu nʼụlọ obibi ha ebighị ebi.

Oziọma (maka Fraịdee)

Luk 16:15–18; 17:1–4

15Ọ sịrị ha, “Unu na-egosi onwe unu dị ka ndị ezi omume nʼihu ndị mmadụ ma Chineke maara obi unu. Nʼihi na ihe ndị mmadụ na-akpọ ihe dị oke mkpa bụ ihe rụrụ arụ nʼanya Chineke. 16“Iwu na ndị amụma nọ na-achị ruo oge Jọn bịara. Site nʼoge ahụ, a na-ekwusa oziọma nke alaeze Chineke, onye ọbụla na-ejikwa ike na-abanye nʼime ya. 17Ọ dị mfe ka eluigwe na ụwa gabiga karịa na a ga-ewepụ otu kpọm, site nʼihe niile dị nʼiwu. 18“Onye ọbụla gbara nwunye ya alụkwaghị m ma lụrụ nwanyị ọzọ na-eme mmehie ịkwa iko. Onye ọ bụlakwa lụrụ nwanyị di ya jụrụ na-eme mmehie ịkwa iko. 17:1Ọ sịrị ndị na-eso ụzọ ya, “Ihe ndị nke na-eme ka mmadụ jehie aghaghị ịdị, ma ahụhụ ga-adịrị onye ọbụla ọnọdụ ndị a ga-esi nʼaka ya bịa. 2Ọ ga-akara gị mma ka e kenye gị nkume igwe nri nʼolu, tụnye gị nʼime oke osimiri, karịa na ị ga-eduhie otu nʼime ụmụntakịrị ndị a ụzọ. 3Kpachapụrụnụ onwe unu anya! “Ọ bụrụ na nwanna gị e mejọọ gị, baara ya mba. Ọ bụrụ na o chegharịa, gbaghara ya. 4Ọ bụrụkwa na o mejọọ gị ugboro asaa nʼotu ụbọchị, rịọkwa gị ugboro asaa sị, ‘E chegharịala m,’ ị ghaghị ịgbaghara ya.”

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 20 Novemba na kalenda nzukọ bụ 3 Disemba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike