Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Novemba 2026 › 17 Novemba
Kalenda Ọtọdọks · 4 Novemba (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 17 Novemba 2026
Tiuzdee · Izu nke 25 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 7
Mmemme na ndị nsọ
Venerable Joannicius the Great († 846)
Obubu ọnụ
Ọ dịghị obubu ọnụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
10nʼụbọchị ahụ ọ ga-abịa ịnara ịja mma na otuto, nʼime ndị nsọ ya, ya na ka ọ bụrụ ihe ịtụnanya nʼebe ndị kweerenụ nọ, nʼihi na unu kwenyere ama nke oziọma ahụ anyị gbaara unu. 11Nʼihi nke a, anyị na-anọgide nʼekpere nʼihi unu, na-arịọ ka Chineke gụọ unu dịka ndị kwesiri ọkpụkpọ ọ kpọrọ unu, na-arịọkwa ka o site nʼike ya mee ka unu mezuo ebumnobi nke ihe dị mma, na ezi ọrụ niile nke okwukwe. 12Ka e nye aha Onyenwe anyị Jisọs otuto nʼime unu, unu onwe unu nʼime ya kwa, dị ka amara nke Chineke anyị na nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst si dị. 2:1Ma ihe banyere ọbịbịa Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, na nzukọ anyị na ya ga-ezukọta, anyị na-adụsị unu ọdụ ike ụmụnna. 2Ka unu ghara ịma jijiji maọbụ ịtụ egwu nʼuche unu nʼihi amụma, maọbụ okwu maọbụ akwụkwọ ozi e dere dị ka o sitere nʼaka anyị, nke na-asị nʼụbọchị Onyenwe anyị eruola.
Oziọma
34Anya bụ oriọna nke anụ ahụ. Ọ bụrụ na anya gị dị mma, ahụ gị niile ga-ejupụta nʼìhè. Ọ bụrụkwanụ na anya gị dị njọ, ị ga-anọ nʼọchịchịrị. 35Ya mere, lezie anya ka ị mara ka ìhè dị nʼime gị, ọ bụghị ọchịchịrị. 36Nʼihi nke a, ọ bụrụ na ahụ gị niile ejupụta nʼìhè, ọ bụrụkwa na akụkụ ọbụla agbaghị ọchịchịrị, mgbe ahụ, ahụ gị niile ga-ejupụta nʼìhè dị ka mgbe ìhè oriọna na-achakwasị gị nʼahụ.” 37Mgbe ọ na-ekwu okwu, otu onye Farisii kpọrọ ya ka ọ bịa soro ya rie nri. Ọ banyere nọrọ nʼoche nri. 38O juru onye Farisii ahụ anya na mgbe ọ bidoro iri nri ọ kwọghị aka ya tupu ya ebido. 39Ma Onyenwe anyị sịrị ya, “Unu ndị Farisii na-asacha azụ iko mmiri na efere, mee ka ọ dị ọcha, ma ime unu jupụtara nʼanya ukwu na nʼihe ọjọọ dị iche iche. 40Ndị nzuzu! Ọ bụ na ọ bụghị onye ahụ mere azụ iko mekwara ime ya? 41Kama werenụ ihe ndị ahụ dị nʼime rụọ ọrụ ebere, ihe niile ga-adịkwara unu ọcha.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 4 Novemba na kalenda nzukọ bụ 17 Novemba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike