Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Novemba 2026 › 6 Novemba
Kalenda Ọtọdọks · 24 Ọktoba (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 6 Novemba 2026
Fraịdee · Izu nke 23 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 5
Mmemme na ndị nsọ
Martyr Arethas and with him 4299 Martyrs († 523)
Ụbọchị obubu ọnụ
Obubu ọnụ: ya na mmanụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
14Unu onwe unu, ụmụnna m, ghọọnụ ndị na-eṅomi nzukọ nke Chineke nʼime Kraịst Jisọs, ndị nọ na Judịa. Nʼihi na unu onwe unu hụkwara otu ụdị ahụhụ ahụ nʼaka ndị ala unu, dị ka ha onwe ha hụrụ nʼaka ndị Juu. 15Ndị gburu ndị amụma, gbukwaa Onyenwe anyị Jisọs. Ugbu a ha na-akpagbukwa anyị na-achụpụ anyị. Ha na-emegide Chineke na mmadụ niile 16site nʼigbochi anyị izisara ndị mba ọzọ oziọma ka a ghara ịzọpụta ha. Ha na-esite nʼụzọ dị otu a na-eme ka iko mmehie ha na-eju. Ma ikpe Chineke adakwasịlarị ha. 17Otu ọ dị, ụmụnna anyị, mgbe anyị si nʼetiti unu pụọ, nọọ nwa oge nta, ọnọdụ a mere anyị ndị na-enweghị nne na nna (maọbụ na-anụ ahụ ọ bụghị nʼime mmụọ), nʼihi otu unu si gụọ anyị agụụ, anyị gbalịrị ihu unu. 18Anyị gbalịsịrị ike ịbịakwute unu, karịsịa, mụ onwe m bụ Pọl gbalịrị, gbalịa ịbịa, ma ekwensu gbochiri anyị. 19Nʼihi na olee ihe bụ olileanya anyị, maọbụ ọṅụ anyị, maọbụ okpueze anyị, nke anyị ga-eji nyaa isi mgbe a ga-eme ka anyị niile guzo nʼihu Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, mgbe ọ ga-abịa? Ọ bụ na ọ bụghị unu onwe unu?
Oziọma
1Mgbe nke a gasịrị, Onyenwe anyị họpụtara iri mmadụ asaa na abụọ ndị ọzọ, zipụ ha mmadụ abụọ abụọ ka ha buru ya ụzọ gaa nʼobodo niile nakwa ebe niile ọ na-achọ ịga. 2Ọ sịrị ha, “Owuwe ihe ubi dị ukwuu ma ndị ọrụ dị naanị ole na ole. Ya mere, rịọọnụ Onyenwe owuwe ihe ubi ka o zite ndị ọrụ nʼowuwe ihe ubi ya. 3Gaanụ! Ma lee, ana m ezipu unu dị ka ụmụ atụrụ nʼetiti agụ. 4Unu ewerekwala ego maọbụ akpa maọbụ akpụkpọụkwụ. Unu ekelekwala onye ọbụla nʼụzọ. 5“Mgbe unu banyere nʼụlọ ọbụla, burunu ụzọ sị, ‘Udo dịrị nʼụlọ a.’ 6Ọ bụrụ na mmadụ udo bi nʼụlọ ahụ, udo unu ga-adịnyekwara ya. Ọ bụrụkwanụ na onye bi nʼụlọ ahụ abụghị onye udo, udo unu ji bịa ga-alọghachitekwara unu. 7Nọgidenụ nʼebe ahụ, na-erinụ ma na-aṅụkwanụ ihe ọbụla ha nyere unu, nʼihi na onye ọrụ kwesiri ịnata ụgwọ ọrụ ya. Unu esitela nʼotu ụlọ gaa nʼụlọ ọzọ. 8“Ọ bụrụ na ndị bi nʼobodo unu batara anabata unu, rienụ ihe ọbụla ha nyere unu. 9Gwọọnụ ndị ọrịa nọ nʼebe ahụ, gwakwanụ ha sị, ‘Alaeze Chineke adịla unu nso.’ 10Ma mgbe unu banyere nʼobodo ọbụla ha jụ ịnabata unu, pụọnụ gaa nʼokporoụzọ ya kwuo sị, 11‘Ọ bụladị aja si nʼobodo a nke nyapagidere nʼụkwụ anyị, anyị na-ehichapụ ya ka ọ bụrụ ihe ịdọ aka ntị nye gị. Otu ọ dị, matakwanụ nke a, na alaeze Chineke dị nso.’ 12Ana m agwa unu na nʼụbọchị ahụ, ga-akara Sọdọm mma karịa obodo ahụ. 13“Ahụhụ ga-adịrị gị Korazin. Ahụhụ ga-adịrị gị Betsaida. Nʼihi na ọ bụrụ na ọrụ ebube a rụrụ nʼime unu ka a rụrụ na Taịa na Saịdọn ha gaara echegharị ogologo oge, nọdụ nʼakwa mkpe na ntụ. 14Ọ ga-akara Taịa na Saịdọn mma nʼụbọchị ikpe karịa unu. 15Ma gị Kapanọm! Ị na-eche na a ga-ebuli gị elu ruo eluigwe? Mba! Ị ga-arịda nʼala mmụọ!
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 24 Ọktoba na kalenda nzukọ bụ 6 Novemba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike