Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọktoba 2026 › 24 Ọktoba
Kalenda Ọtọdọks · 11 Ọktoba (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 24 Ọktoba 2026
Satọdee · Izu nke 21 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 3
Mmemme na ndị nsọ
Apostle Philip, of the 70, one of the 7 Deacons (1st C)
Obubu ọnụ
Ọ dịghị obubu ọnụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
12Ya mere, ebe ọ bụ na anyị nwere olileanya dị otu a, anyị enweghị egwu ọbụla. 13Anyị agaghị adị ka Mosis onye weere akwa kpuchie ihu ya, nʼihi na ọ chọghị ka ụmụ Izrel hụ ebube ahụ na-agbanwe agbanwe. 14Kama e mechiri obi ha ruo taa. Nʼihi na mgbe ọbụla ha gụrụ akwụkwọ ọgbụgba ndụ ochie ahụ, akwa mkpuchi ahụ na-anọgidekwa apụghị apụ nʼobi ha, nʼihi na ọ bụ naanị site nʼime Kraịst ka ọ ga-eji pụọ. 15Ee, tutu ruo taa, mgbe ọbụla ha na-agụ akwụkwọ iwu ahụ Mosis dere, ihe mkpuchi na-adịgide nʼobi ha. 16Ma mgbe onye ọbụla tụgharịrị nʼebe Onyenwe anyị nọ, a na-ewepụ akwa mkpuchi ahụ. 17Nʼihi na Onyenwe anyị bụ Mmụọ, ma ebe ọbụla kwa Mmụọ Onyenwe anyị nọ, nʼebe ahụ ka mmadụ pụrụ inwere onwe ya. 18Anyị niile bụ ndị e wepụrụla akwa mkpuchi site nʼihu, na-egosi ebube nke Onyenwe anyị. A na-agbanwe anyị ịbanye nʼoyiyi ya site nʼebube ruo nʼebube, nke si nʼaka Onyenwe anyị, onye bụ Mmụọ.
Oziọma
27Mgbe nke a gasịrị, ọ pụrụ hụ otu onye ọna ụtụ aha ya bụ Livayị, ka ọ nọdụrụ ala nʼụlọ ịnakọta ụtụ ya. Ọ sịrị ya, “Soro m.” 28Ngwangwa, o biliri, hapụ ihe niile soro ya. 29Emesịa, Livayị kwadooro Jisọs oke oriri nʼụlọ ya, ọtụtụ igwe ndị ọna ụtụ na ndị ọzọ soo ha nʼoriri ahụ. 30Ma ndị Farisii na ndị ozizi iwu tamuru ntamu na-ajụ ndị na-eso ụzọ ya sị, “Gịnị mere unu ji soro ndị ọna ụtụ na ndị mmehie na-erikọ nri na-aṅụkọkwa ihe ọṅụṅụ?” 31Jisọs zara sị, “Mkpa dibịa adịghị akpa ndị ahụ dị ike, kama ọ bụ ndị ahụ na-esighị ike. 32Abịaghị m ịkpọ ndị ezi omume, kama abịara m ịkpọ ndị mmehie ka ha chegharịa.”
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 11 Ọktoba na kalenda nzukọ bụ 24 Ọktoba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike