Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọktoba 2026 › 23 Ọktoba
Kalenda Ọtọdọks · 10 Ọktoba (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 23 Ọktoba 2026
Fraịdee · Izu nke 21 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 3
Mmemme na ndị nsọ
Martyrs Eulampius and Eulampia, at Nicomedia, and 200 martyrs with them († 303-311)
Ụbọchị obubu ọnụ
Obubu ọnụ: ya na mmanụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
1Ọ bụ ọchịchọ m ka unu ghọta otu m si na-agbasi mgba ike nke ukwuu nʼihi unu, na nʼihi ndị nọ nʼobodo Laodisia, na ndị niile na-enwebeghị ike ịhụ m ihu na ihu. 2Ebumnobi m bụ ka a gbaa ha ume, jikọọkwa ha nʼotu nʼịhụnanya, ka ha nweta ụba niile nke nghọta zuruoke na amamihe nke ihe omimi Chineke ahụ bụ Kraịst nʼonwe ya. 3Ọ bụkwa nʼime ya ka ụlọakụ ihe zoro ezo niile nke amamihe na ihe ọmụma dị. 4Ana m ekwu nke a ka onye ọbụla ghara iji ire ụtọ duhie unu ụzọ. 5Ọ bụ ezie na anọghị m nʼetiti unu nʼanụ ahụ, ma anọ m nʼetiti unu nʼime mmụọ. Ana m aṅụrị ọṅụ ịhụ mkpebi unu na iguzosi ike nʼokwukwe unu nʼime Kraịst. 6Ya mere, dị ka unu si nabata Kraịst Jisọs Onyenwe anyị, na-ebinụ ndụ unu nʼime ya. 7Bụrụnụ ndị mgbọrọgwụ ha mibanyere nʼime ya, ndị a na-ewuli elu nʼime ya, ndị dị ike nʼime okwukwe, dị ka e si kuziere unu, ndị jupụtara na-inye ekele.
Oziọma
31Ọ gara nʼihu sị ha, “Ma gịnị ka m ga-eji tụnyere ndị bi nʼọgbọ a? Gịnị ka ha yiri? 32Ha dị ka ụmụntakịrị nọ nʼọma ahịa na-akpọ ibe ha oku na-asị, “ ‘Anyị gburu unu ọja, ma unu adịghị ete egwu. Anyị bụrụ abụ ịkwa ozu, ma unu ebeghị akwa.’ 33Nʼihi na Jọn omee baptizim bịara na-erighị achịcha maọbụ ṅụọ ihe ọṅụṅụ ma unu sịrị, ‘Mmụọ ọjọọ bi nʼime ya.’ 34Nwa nke Mmadụ bịara na-eri ihe oriri na-aṅụkwa ihe ọṅụṅụ, ma unu sịrị, ‘Lee, onye oke oriri na onye oke aṅụmaṅụ, enyi ndị ọna ụtụ na ndị mmehie.’ 35Ma e sitela nʼụmụ ya niile nwapụta amamihe nʼonye ziri ezi.”
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 10 Ọktoba na kalenda nzukọ bụ 23 Ọktoba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike