Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọktoba 2026 › 21 Ọktoba
Kalenda Ọtọdọks · 8 Ọktoba (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 21 Ọktoba 2026
Wenezdee · Izu nke 21 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 3
Mmemme na ndị nsọ
Venerable Pelagia the Penitent († 457)
Ụbọchị obubu ọnụ
Obubu ọnụ: ya na mmanụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
18Ọ bụ ya bụ isi nke anụ ahụ ahụ bụ chọọchị. Ọ bụ ya bụ mmalite, onye mbụ a mụrụ nʼetiti ndị niile ga-esi nʼọnwụ bilie. Nke a mere ka ọ bụrụ onyeisi mbụ nʼime ihe niile. 19Nʼihi na ọ bụ nʼime ya ka ọ masịrị ozuzu oke ya ibi. 20Ọ bụ site na ya ka o ji mee ka ihe niile bịaghachikwute ya. E mere ka udo dịrị nʼetiti ya na ihe niile, maọbụ ihe dị nʼụwa, maọbụ nke dị na nʼeluigwe site na ọbara ọ wụsiri nʼelu obe. 21Unu onwe unu bụ ndị e mere ndị mba ọzọ site nʼebe Chineke nọ, na ndị iro nʼuche unu nʼihi ajọ omume niile unu. 22Ma ugbu a, o kpezierela unu site na-anụ ahụ Kraịst, sitekwa nʼọnwụ ya, iji chee unu nʼihu ya dịka ndị dị nsọ, na ndị na-enweghị ịta ụta, na ihe ebubo ọbụla megide ha. 23Ma ọ bụrụ na unu anọgide nʼokwukwe unu, bụrụ ndị gbara mgbọrọgwụ, ndị guzosiri ike, ndị na-ewezugaghị onwe ha site nʼolileanya ahụ dịrị unu nʼoziọma ahụ. Nke a bụ oziọma ahụ unu nụrụ, nke ekwusakwara nye ihe niile e kere eke nʼokpuru eluigwe, nke e mere mụ onwe m bụ Pọl, onyeozi ya.
Oziọma
46“Gịnị mere unu ji na-akpọ m, ‘Onyenwe anyị, Onyenwe anyị,’ ma unu adịghị eme ihe m kwuru? 47Achọrọ m igosi unu ihe onye ọbụla na-abịakwute m nke na-anụ okwu m, ma na-ejikwa ihe ọ na-anụ akpọrọ ihe, yiri. 48Onye ahụ yiri nwoke wuru ụlọ, onye gwumiri ala, doo ntọala ụlọ ahụ nʼelu oke nkume. Mgbe idee mmiri bịara were ike ya tie nʼụlọ ahụ, o nweghị ike ime ka ọ maa jijiji nʼihi na e wusiri ya ike. 49Ma onye ahụ nụrụ okwu m, nke na-ejighị ihe ọ nụrụ mee ihe, dị ka nwoke wukwasịrị ụlọ ya nʼelu ala, nke na-enweghị ntọala ọbụla. Mgbe idee mmiri bịara were ike ya tie nʼụlọ ahụ, ụlọ ahụ dara daruo ala, ọdịda ya dị ukwuu.” 7:1Mgbe o kwusiri okwu ndị a nye ndị na-ege ya ntị, ọ banyere na Kapanọm.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 8 Ọktoba na kalenda nzukọ bụ 21 Ọktoba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike