Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọktoba 2026 › 17 Ọktoba

Kalenda Ọtọdọks · 4 Ọktoba (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 17 Ọktoba 2026

Satọdee · Izu nke 20 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 2

Mmemme na ndị nsọ

Hieromartyr Hierotheos, Bishop of Athens (1st C)

Obubu ọnụ

Ọ dịghị obubu ọnụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Akwụkwọ ozi

2Kọ 1:8–11

8Anyị chọrọ ka unu mara ụmụnna m, ihe banyere nsogbu e sogburu anyị nʼEshịa. Nʼezie, nsogbu ahụ karịrị anyị ike, mee ka anyị hapụ inwekwa olileanya na anyị ga-emesi dịrị ndụ. 9Nʼezie, ọ dị nnọọ nʼoge ahụ, dịka a ga-asị na a mara anyị ikpe ọnwụ. Ma anyị maara na o si otu a mee ka anyị nwee ike ịmụta na o kwesighị ka anyị tụkwasị obi nʼike nke aka anyị, kama ka anyị nwee olileanya nʼime Chineke, onye pụrụ ime ka ndị nwụrụ anwụ si nʼọnwụ bilie. 10Ọ bụ Chineke bụ onye zọpụtara anyị site nʼime oke ọnwụ dị otu a. Anyị nwekwara ntụkwasị obi na ọ ga-aga nʼihu na-azọpụtakwa anyị, 11dịka unu ga-enyekwara anyị aka site nʼekpere unu, ka ọtụtụ nwere ike nye ekele nʼihi anyị maka onyinye amara anyị natara na nzaghachi ekpere ọtụtụ mmadụ ndị a na-ekpere anyị.

Oziọma

Luk 5:17–26

17Otu ụbọchị, mgbe ọ nọ na-ezi ndị mmadụ ihe, ndị Farisii na ndị ozizi iwu (sitere nʼobodo nta niile dị na Galili na Judịa na Jerusalem bịa nọdụkwa ebe) ahụ. Ike Chineke dịnyekwaara ya ịgwọ ndị ọrịa. 18Nʼoge ahụ ndị ikom ụfọdụ bu otu nwoke akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ nʼihe ndina ya, bịara gbalịa isite nʼọnụ ụzọ ụlọ ahụ bubata ya tọgbọ ya nʼụkwụ ya. 19Mgbe ha na-enweghị ike ime nke a nʼihi igwe mmadụ, ha rigooro nʼelu ụlọ, site nʼoghere wetuo nwoke ahụ nʼute ya nʼetiti igwe mmadụ nʼihu Jisọs. 20Mgbe Jisọs hụrụ okwukwe ha, ọ sịrị, “Enyi m, a gbagharala gị mmehie gị.” 21Ndị Farisii na ndị ozizi iwu malitere iche nʼime obi ha sị, “Onye bụ onye a na-ekwulu Chineke? Onye pụrụ ịgbaghara mmadụ mmehie, ma ọ bụghị naanị Chineke?” 22Mgbe Jisọs matara ihe ha na-ajụ, ọ zara ha sị, “Gịnị mere unu ji na-eche ihe ndị a nʼobi unu? 23Olee nke ka mfe ikwu: Ọ bụ a gbagharala gị mmehie gị niile, ka ọ bụ ị sị, Bilie jee ije? 24Ma ka unu mata na Nwa nke Mmadụ nwere ikike nʼụwa ịgbaghara mmehie.” Ọ sịrị onye ahụ akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ, “Asị m gị, bilie, chịrị ute gị laa nʼụlọ gị!” 25Ngwangwa, o biliri ọtọ nʼihu mmadụ niile, chịrị ihe ndina ya bido na-eto Chineke na-ala nʼụlọ ya. 26Ihe ndị a juru onye ọbụla anya, ha tokwara Chineke. Oke egwu jupụtakwara ha nʼahụ, ha sịrị, “Anyị ahụla ihe ebube taa.”

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 4 Ọktoba na kalenda nzukọ bụ 17 Ọktoba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike