Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọktoba 2026 › 16 Ọktoba

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 16 Ọktoba 2026

Fraịdee · Izu nke 28 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Fraịdee nke izu nke 28 nke Oge Nkịtị

Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ

Onye nsọ Hedwig, Onye okpukpe · Ncheta a na-ahọrọ

Onye nsọ Magaret Meri Alacoque, Nwaagbọghọ · Ncheta a na-ahọrọ

Obubu ọnụ na nchegharị

Ụbọchị nchegharị

Fraịdee ọ bụla bụ ụbọchị nchegharị; ọgbakọ ndị bishọp ọ bụla na-ekpebi otú a ga-esi debe ya: izere anụ ma ọ bụ omume nchegharị ọzọ. Obubu ọnụ na-ejikọ ndị dị afọ 18 ruo 59, izere anụ site nʼafọ 14.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Efe 1:11–14

11Nʼime Kraịst ka e mere anyị ndị nketa, ndị e bururị ụzọ họpụta na mbụ, dị ka atụmatụ onye ahụ na-arụpụta ihe niile nʼizuoke nke nzube na ebumnuche ya. 12Nke mere na anyị, ndị buuru ụzọ nwee olileanya na Kraịst, ga-ebi ndụ nʼotuto nke ebube ya. 13Unu bụkwa ndị a gụnyere nʼime Kraịst mgbe unu nụrụ ozi nke eziokwu ahụ bụ oziọma nke nzọpụta. Mgbe unu kwenyere, a kara unu akara nʼime ya bụ akara nke nkwa ahụ bụ Mmụọ Nsọ. 14Nke a bụ ihe nketa anyị tutu ruo mgbe a rụzuru ọrụ mgbapụta nke ndị ahụ niile bụ ihe nweta Chineke. Ka e si otu a too ebube ya.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 33:1–2, 4–5, 12–13

1Tienụ mkpu ọṅụ nye Onyenwe anyị, unu ndị ezi omume; nʼihi na ọ bụ ihe ziri ezi ka ndị obi ha ziri ezi too ya. 2Werenụ ụbọ akwara too Onyenwe anyị; werenụ une nke nwere akwara iri kpọọrọ ya egwu. 4Nʼihi na okwu Onyenwe anyị niile ziri ezi bụrụkwa eziokwu; o kwesiri ntụkwasị obi nʼọrụ ya niile. 5Onyenwe anyị na-ahụ ezi omume na ikpe ziri ezi nʼanya; ụwa niile jupụtara nʼịhụnanya ya nke na-enweghị ọgwụgwụ. 12Mba a gọziri agọzi ka mba ahụ bụ, bụ ndị Chineke bụ Onyenwe anyị ha; bụ ndị ọ họpụtara ka ha bụrụ ihe nketa ya. 13Onyenwe anyị si nʼeluigwe na-ele ndị mmadụ bi nʼụwa anya. Ọ na-ahụzu ụmụ mmadụ niile anya.

Oziọma

Luk 12:1–7

1Nʼoge ahụ, mgbe ọtụtụ puku ndị mmadụ gbakọtara, nke mere ka ha na-azọ ibe ha ụkwụ. O buuru ụzọ bido ịgwa ndị na-eso ụzọ ya sị, “Kpacharanụ anya unu banyere ihe na-eko achịcha ndị Farisii, nke bụ ihu abụọ ha. 2Nʼihi na ọ dịghị ihe ọbụla zoro ezo nke na-agaghị apụta ìhè, ọ dịkwaghị ihe e kpuchiri ekpuchi nke a na-agaghị ekpughe. 3Ihe ọbụla unu kwuru nʼọchịchịrị, a ga-anụ ya nʼihe, ihe ọbụla unu gbara nʼizu nʼime ụlọ ka a ga-ekwusa nʼelu ụlọ. 4“Ana m agwa unu, ndị enyi m, unu atụla egwu maka ndị na-egbu anụ ahụ ma e mesịa, ha apụghị ime ihe ọzọ. 5Ma aga m ezi unu onye unu ga-atụ egwu. Tụọnụ egwu Onye ahụ nwere ikike igbu anụ ahụ ma tụbakwa ya nʼọkụ ala mmụọ. E, asị m unu tụọnụ ya egwu. 6Ọ bụghị mkpụrụ ego abụọ ka a na-ere ụmụ nza ise? Ma o nweghị nke ọbụla nʼime ha Chineke chefuru. 7Nʼezie a gụrụ ọ bụladị agịrị isi dị nʼisi unu ọnụ. Unu atụla egwu, nʼihi na unu dị oke ọnụ karịa ọtụtụ ụmụ nza.

Ndị nsọ nke ụbọchị

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde A, afọ ụbọchị izu II.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike