Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọktoba 2026 › 16 Ọktoba

Kalenda Ọtọdọks · 3 Ọktoba (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 16 Ọktoba 2026

Fraịdee · Izu nke 20 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 2

Mmemme na ndị nsọ

Hieromartyr Dionysius the Areopagite, Bishop of Athens († 96)

Ụbọchị obubu ọnụ

Obubu ọnụ: ya na mmanụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Akwụkwọ ozi

Fil 3:8–19

8E, karịa nke a, akpọọla m ihe ndị a niile ihe efu, nʼihi na a pụghị iji ha tụnyere ịdị oke ọnụahịa nke ịmata Kraịst Jisọs, Onyenwe m. Nʼihi ya, etufuola m ihe ndị a niile, gụọ ha dị ka ihe na-abaghị uru, ka m nwee ike rite Kraịst nʼuru. 9Ka e nwee ike hụ m nʼime ya. Enweghị m ezi omume nke aka m, nke dabere nʼiwu, kama ọ bụ nke sitere nʼokwukwe na Kraịst, ezi omume si na Chineke nke dabeere nʼokwukwe. 10Naanị ihe m chọrọ bụ ịmara Kraịst na ike dị na mbilite nʼọnwụ ya, na nnwekọ nke isoro ya keta oke nʼahụhụ ya, nakwa ka m yie ya nʼọnwụ. 11Ka m si otu a, ruo nʼogo nke inweta mbilite site nʼọnwụ. 12Anaghị m ekwu na m etozuola oke, maọbụ nwezuo ihe niile. Ma a na m agbalịsi ike ka m jide ihe ahụ nke Kraịst Jisọs jidere m nʼihi ya. 13Ụmụnna m, nʼezie, abụbeghị m ihe ahụ m kwesiri ịbụ. Ma ihe m ji ike m niile na-eme bụ ichefu ihe niile ndị gara aga, na ilekwasị anya nʼihe ahụ m na-agbaso bụ nke dị m nʼihu. 14Ana m agbasi ọsọ ike iji gbaruo nʼisi, maka irite ihe ahụ a na-agbata nʼọsọ, bụ ọkpụkpọ ịbanye na ndụ eluigwe ahụ nke Chineke kpọrọ m site na Jisọs Kraịst. 15Ka anyị niile, bụ ndị tozuru oke nʼime mmụọ nwee uche dị otu a. Ọ bụrụkwa na ụfọdụ nʼime unu nwere uche ọzọ dị iche, Chineke ga-ekpughere unu nke a. 16Ka anyị jidesienụ aka ike naanị nʼihe ahụ anyị nweterela. 17Ụmụnna m, na-agbasonu ụdị ndụ m na-ebi, chọpụtakwanụ ndị ọzọ na-adị ndụ dị ka anyị si adị, mee ha ihe ilere anya unu. 18Nʼihi na agwala m unu nke a ọtụtụ mgbe, na-achọkwa ịgwa unu ya ọzọ ugbu a. Lee, anya mmiri dị m nʼanya ugbu a m na-ekwu ya sị na e nwere ọtụtụ ndị na-ebi ndụ ha dị ka ha bụ ndị iro obe Kraịst nʼezie. 19Ọgwụgwụ ndị dị otu a ga-abụ ịla nʼiyi. Afọ ha bụ chi ha, ndị otuto ha dịkwa nʼihere ha. Ha na-atụkwasị uche naanị nʼihe nke ụwa.

Akwụkwọ ozi (maka Onye nsọ Daịonisiọs onye Areopagọs)

Ọrụ 17:16–34

16Mgbe Pọl nọ na-echere ha nʼAtens, o wutere mmụọ ya nke ukwuu nʼihi arụsị niile ọ hụrụ, nke jupụtara nʼobodo ahụ. 17Nʼihi nke a, ya na ndị Juu na ndị na-atụ egwu Chineke, na-anọgide nʼụlọ nzukọ na-arụrịta ụka. Kwa ụbọchị, ọ na-apụkwa nʼọma ahịa na-agwa ndị niile o zutere okwu. 18Ya na ụfọdụ ndị Epikuri na ndị Stoịk bụ ndị ọkachamara na-arụrịta ụka. Ndị ụfọdụ na-asị, “gịnị ka onye ekwurekwu a ga-ekwu?” Ndị ọzọ sịrị, “ọ dịka onye na-ekwusa ụmụ mmụọ ndị ala ọzọ.” Ha kwuru nke a nʼihi na ọ na-ekwusa oziọma banyere Jisọs na mbilite nʼọnwụ ya. 19Ha kpọbatara ya nʼebe ha zukọrọ, ebe a na-akpọ Areopagọs, ebe ha nọ sị ya, “Anyị enwere ike ịmata ihe banyere ozizi ọhụrụ gị a? 20Ị na-ekwu ihe ndị na-agbagwoju anyị anya. Anyị chọrọ ịmata ihe ndị a nke ọma.” 21(Ndị Atens niile na ndị ala ọzọ bi nʼobodo ahụ, enweghị ohere ime ihe ọbụla, ọ gwụchaala ọrụ ikwu na ịnụ banyere ihe dị ọhụrụ.) 22Mgbe ahụ Pọl guzoro na nzukọ Areopagọs sị, “Unu ndị Atens, ahụla m na ọ na-anụ unu ọkụ nʼobi ịsọpụrụ mmụọ nke unu na-efe ofufe. 23Nʼihi na mgbe m na-ejegharị nʼobodo unu, ahụrụ m ụlọ chi dị iche iche, ahụrụ m otu ebe ịchụ aja nke e dekwasịrị nʼelu ya: Ihe e nyere chi nke amaghị ama. Ya mere, ihe ahụ unu na-efe ofufe nʼamaghị ama nke a ka m na-ekwusara unu. 24“Chineke onye kere ụwa na ihe niile dị nʼime ya. Ebe ọ bụ onye nwe eluigwe na ụwa, ọ dịghị ebikwa nʼụlọnsọ e jiri aka wuo. 25Otu aka ahụ, ọ dịghị anara ije ozi site nʼaka mmadụ, dịka a ga-asị na o nwere ihe kọrọ ya. Ya onwe ya na-enye ndụ na ume na ihe niile. Ọ na-egbokwa mkpa niile. 26O sitere nʼaka otu onye, bụ mmadụ mbụ ahụ, kee agbụrụ niile nke mmadụ nʼotu nʼotu, ka ha biri nʼelu ụwa dum. O jiri aka ya kewachaa oge ọgbọ ọbụla ga-anọ na oke niile nke ebe obibi ha. 27Ma nzube ya banyere ihe niile bụ ka onye ọbụla chọsie Chineke ike. Eleghị anya, mmadụ nwere ike lezie ụzọ ya anya, si otu a chọta ya. Ọ nọkwaghị mmadụ ọbụla nʼebe dị anya. 28‘Nʼihi nʼime ya ka anyị na-ebi, anyị na-ejegharịkwa nʼime ya na-adịkwa ndụ.’ Dịka ụfọdụ nʼime unu ndị ode abụ na-ekwu sị, ‘Anyị onwe anyị bụ ụmụ ya.’ 29“Ebe anyị bụ ndị Chineke mụrụ, o kwesighị ka anyị na-eche na ihe akpọrọ Chineke yiri ọlaọcha maọbụ ọlaedo, maọbụ nkume, ihe apịrị apị site na ǹka na ihe dị nʼobi mmadụ. 30Ma Chineke lefuru enweghị nghọta nke mmadụ anya banyere ihe ndị a niile nʼoge gara aga. Ma ugbu a, ọ chọrọ ka mmadụ niile chegharịa. 31Nʼihi na o debela otu ụbọchị mgbe ọ ga-ekpe ụwa niile ikpe nʼụzọ ezi omume, site nʼaka otu nwoke ọ họpụtara. O mekwara ka nke a guzosie ike, mgbe o mere ka onye ahụ sị nʼọnwụ bilie.” 32Mgbe ha nụrụ ihe banyere mbilite nʼọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ, ha chịrị ya ọchị. Ma ụfọdụ nʼime ha sịrị, “Nʼoge ọzọ anyị ga-achọ ịnụ okwu ndị a.” 33Nʼoge a, Pọl hapụrụ ha. 34Mmadụ ole na ole sooro ya, bụrụkwa ndị kwere ekwe. Otu onye nʼime ha bụ Dionisiọs onye Areopagọs. Onye ọzọ bụ nwanyị a na-akpọ Damaris na ndị ọzọkwa.

Oziọma

Luk 6:17–23

17Ya na ha rịdatara ga nʼebe ala dị larịị. Igwe ndị na-eso ụzọ ya na oke igwe mmadụ sitere na Judịa, na Jerusalem nakwa obodo dị na nsọtụ mmiri nke Taịa na Saịdọn. 18Ndị bịara ịnụrụ okwu ya na ka a gwọọ ha ọrịa ha. A gwọkwara ọtụtụ ndị mmụọ na-adịghị ọcha na-esogbu. 19Igwe mmadụ ahụ gbalịrị ịmetụ ya aka, nʼihi na ike dị ukwuu si ya nʼahụ na-apụ na-agwọ ha niile. 20O weliri anya lee ndị na-eso ụzọ ya, sị ha, “Ngọzị na-adịrị unu bụ ndị ogbenye, nʼihi na alaeze Chineke bụ nke unu. 21Ngọzị na-adịrị unu ndị agụụ na-agụ ugbu a, nʼihi na afọ ga-eju unu. Ngọzị na-adịrị unu ndị na-ebe akwa ugbu a, nʼihi na unu ga-achị ọchị. 22Ngọzị na-adịrị unu mgbe ndị mmadụ na-akpọ unu asị, mgbe ha na-achụpụ unu, na-akparị unu, na-ajụ aha unu, nʼihi Nwa nke Mmadụ. 23“Ṅụrịanụ ọṅụ ma wuliekwanụ elu nʼihi ọṅụ nʼụbọchị ahụ, nʼihi na ụgwọ ọrụ unu dị ukwuu nʼeluigwe. Nʼihi na otu a ka ndị nna nna ha mesoro ndị amụma.

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 3 Ọktoba na kalenda nzukọ bụ 16 Ọktoba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike