Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọktoba 2026 › 15 Ọktoba

Kalenda Ọtọdọks · 2 Ọktoba (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 15 Ọktoba 2026

Tọọzdee · Izu nke 20 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 2

Mmemme na ndị nsọ

Hieromartyr Cyprian and Virginmartyr Justina of Nicomedia († 304)

Obubu ọnụ

Ọ dịghị obubu ọnụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Akwụkwọ ozi

Fil 3:1–8

1Na nchịkọta okwu ndị a niile, ụmụnna m, na-aṅụrịnụ ọṅụ nʼime Onyenwe anyị. Ike adịghị agwụ m ịgwa unu ihe ndị a. Ọ bakwaara unu uru ịnụ ụdị okwu a mgbe niile. 2Kpachapụrụnụ onwe unu anya nʼebe ndị mmadụ ọjọọ ahụ yiri nkịta nọ. Ndị ahụ na-eyiwasị ahụ ha. 3Nʼihi na ọ bụ anyị bụ ndị ezi obibi ugwu ahụ, ọ bụghị ha, nʼihi na anyị bụ ndị na-efe Chineke site na Mmụọ ya. Anyị na-aṅụrị ọṅụ nʼime Kraịst Jisọs. Anyị adịghị atụkwasị obi nʼihe e mere nʼanụ ahụ. 4Mụ onwe m nwere ike nwee ntụkwasị obi nʼihe ndị a. Nʼihi na e nwee onye chere na ọ pụrụ ịtụkwasị obi ya nʼanụ ahụ, mụ onwe m nwere ụdị ntụkwasị obi ahụ karịa onye ahụ: 5e biri m ugwu nʼabalị nke asatọ site na mgbe a mụrụ m, abụ m onye Izrel, sitere nʼagbụrụ Benjamin; abụ m onye Hibru a mụrụ nʼetiti ndị Hibru; dị ka o si metụta iwu abụ m onye Farisii; 6igosi ịnụ ọkụ nʼobi m, akpagburu m chọọchị, nʼụzọ ezi omume nʼokpuru iwu, abụ m onye zuruoke. 7Ma ihe ndị a niile m gụrụ dịka ihe bara uru nʼoge gara aga, bụụrụ m ugbu a, ihe na-abaghị uru nʼihi Kraịst. 8E, karịa nke a, akpọọla m ihe ndị a niile ihe efu, nʼihi na a pụghị iji ha tụnyere ịdị oke ọnụahịa nke ịmata Kraịst Jisọs, Onyenwe m. Nʼihi ya, etufuola m ihe ndị a niile, gụọ ha dị ka ihe na-abaghị uru, ka m nwee ike rite Kraịst nʼuru.

Akwụkwọ ozi (maka Onye nsọ Siprian)

1Tm 1:12–17

12Ana m ekele Kraịst Jisọs Onyenwe anyị ekele, onye na-enye m ike, nʼihi na ọ gụrụ m dị ka onye e kwesiri ịtụkwasị obi mgbe ọ họpụtara m ijere ya ozi. 13Ọ bụ ezie na nʼoge gara aga, abụ m onye na-ekwujọ Chineke na onye na-akpagbu ndị ya, bụrụkwa onye na-emegide emegide. Ma Chineke meere m ebere nʼihi na m mere ihe ndị ahụ nʼọnọdụ amaghị ihe, na enweghị okwukwe. 14Ma Onyenwe anyị wụkwasịrị m amara ya, nke babigara ụba oke, ya na okwukwe na ịhụnanya nʼime Kraịst Jisọs. 15Okwu a kwesiri ntụkwasị obi, kwesikwa ka anabata ya nke ọma: Kraịst Jisọs bịara nʼụwa ịzọpụta ndị mmehie, nke mụ onwe m bụ onyeisi ha. 16Ọ bụ nʼihi nke a ka e ji gosi m ebere, ka Kraịst Jisọs site nʼime m, bụ onye kachasị dị njọ, gosi enweghị ọgwụgwụ nke ntachiobi ya, ka m bụrụ ihe nlere anya nye ndị ahụ niile ga-ekwere na ya, ma nata ndụ ebighị ebi. 17Ugbu a, ka enye Eze ahụ na-adị ruo mgbe niile, Onye na-adịghị anwụ anwụ, Onye a na-adịghị ahụ anya, Onye naanị ya bụ Chineke, nsọpụrụ na otuto ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen.

Oziọma

Luk 6:12–19

12Nʼụbọchị ndị ahụ, ọ gara rigoro nʼelu ugwu ikpe ekpere. Ọ nọrọ abalị ahụ niile na-ekpe ekpere nye Chineke. 13Mgbe chi bọrọ, ọ kpọrọ ndị niile na-eso ụzọ ya, site nʼime ha họrọ mmadụ iri na abụọ ndị ọ kpọrọ ndị ozi ya. 14Saimọn (onye ọ kpọrọ Pita) na Andru nwanne ya, Jemis Jọn, Filip Batalomi. 15Matiu Tọmọs, Jemis nwa Alfiọs, Saimọn onye a na-akpọ Zilọt. 16Judas nwa Jemis na Judas Iskarịọt onye raara ya nye. 17Ya na ha rịdatara ga nʼebe ala dị larịị. Igwe ndị na-eso ụzọ ya na oke igwe mmadụ sitere na Judịa, na Jerusalem nakwa obodo dị na nsọtụ mmiri nke Taịa na Saịdọn. 18Ndị bịara ịnụrụ okwu ya na ka a gwọọ ha ọrịa ha. A gwọkwara ọtụtụ ndị mmụọ na-adịghị ọcha na-esogbu. 19Igwe mmadụ ahụ gbalịrị ịmetụ ya aka, nʼihi na ike dị ukwuu si ya nʼahụ na-apụ na-agwọ ha niile.

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 2 Ọktoba na kalenda nzukọ bụ 15 Ọktoba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike