Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọktoba 2026 › 15 Ọktoba

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 15 Ọktoba 2026

Tọọzdee · Izu nke 28 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Tọọzdee nke izu nke 28 nke Oge Nkịtị

Ncheta · Agba ofufe: ọcha

Onye nsọ Teresa nke Jisọs, Nwaagbọghọ na Onye nkuzi nke Chọọchị · Ncheta

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Efe 1:1–10

1Akwụkwọ ozi a sitere nʼaka mụ onwe m bụ Pọl, onye Chineke họpụtara ịbụ onyeozi Jisọs Kraịst. Ọ bụ unu ndị nsọ bi nʼEfesọs, unu bụ ndị kwesiri ntụkwasị obi nʼime Kraịst Jisọs, ka m na-edere ya: 2Ka amara na udo nke sitere na Chineke Nna anyị, na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịrị unu. 3Ka otuto dịrị Chineke, na Nna Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, bụ onye gọziri anyị site nʼinye anyị ngọzị niile nke ime mmụọ nke si nʼebe niile nke eluigwe nʼime Kraịst. 4Dịka o si họpụta anyị nʼime Kraịst tupu a tọọ ntọala ụwa, ka anyị bụrụ ndị dị nsọ na ndị na-enweghị ịta ụta nʼihu ya nʼịhụnanya. 5O kpebiri ime anyị ụmụ ya site nʼihi Kraịst Jisọs. Ma o mekwara ihe ndị a niile nʼihi na ọ tọrọ ya ụtọ nʼobi, bụrụkwa ihe o zubere ime. 6Ka e si otu a too ịdị ebube nke amara ya, nke o ji obi ya niile nye anyị nʼime Onye ahụ ọ hụrụ nʼanya. 7Nʼime ya, anyị nwere mgbapụta site nʼọbara ya, bụ mgbaghara nke njehie niile anyị; dị ka ịba ụba nke amara ya si dị, 8nke o mere ka ọ babigara anyị ụba oke site nʼamamihe na nghọta niile. 9O meela ka anyị mata ihe omimi nzube ya, dị ka o si tọọ ya ụtọ, bụ ihe omimi o zubere ime nʼime Kraịst. 10Nke ọ ga-eme ka o mezuo mgbe oge ya niile zuru, nke bụ ịchịkọta ihe niile nʼime ya, bụ ihe ndị dị nʼeluigwe na nʼụwa nʼokpuru Kraịst.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 98:1–6

1Abụ Ọma. Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ ọhụrụ, nʼihi na ọ rụọla ọtụtụ ọrụ dị ebube; aka nri ya na aka nsọ ya arụpụtarala ya nzọpụta. 2Onyenwe anyị emeela ka a mata nzọpụta ya o kpugheela ezi omume ya nye mba niile. 3O chetala ịhụnanya ya na ikwesi ntụkwasị obi ya nʼebe ụlọ Izrel dị; nsọtụ nke ụwa niile ahụla nzọpụta Chineke anyị. 4Tikusienụ Onyenwe anyị mkpu ọṅụ ike, ụwa niile jirinụ iti egwu tiwaa mkpu abụ ọṅụ; 5werenụ ụbọ akwara bụkuo Onyenwe anyị abụ, e, were ụbọ akwara na olu abụ ọma, 6jirinụ opi na opi ike, tisie mkpu ọṅụ ike nʼihu Onyenwe anyị, Onye bụ Eze.

Oziọma

Luk 11:47–54

47“Ahụhụ ga-adịrị unu nʼihi na unu na-ewu ili ndị amụma bụ ndị nna nna unu ha gburu. 48Ya mere, unu bụ ndị akaebe ma kwenyekwa nʼihe ndị nna nna unu ha mere, nʼihi ha gburu ha, ma unu e wuo ili ha. 49Ọ bụ nʼihi nke a ka Chineke nʼamamihe ya ji kwuo sị, Aga m ezigara ha ndị amụma na ndị ozi, ụfọdụ ka ha ga-egbu ma ndị ọzọkwa ka ha ga-akpagbu. 50Nʼihi nke a, ọgbọ a ga-aza ajụjụ banyere ọbara ndị amụma niile a wufuru, site na mmalite nke ụwa, 51site nʼọbara Ebel ruo na nke Zekaraya, onye e gburu nʼetiti ebe ịchụ aja na ebe nsọ. E, agwa m unu, a ga-ajụ ihe banyere ha nʼaka ọgbọ a. 52“Ahụhụ ga-adịrị unu bụ ndị ozizi iwu, nʼihi na unu wepụrụ ọtụghe igodo nke amamihe. Unu onwe unu abanyeghị, ma unu gbochikwara ndị na-abata ịbata.” 53Mgbe o si nʼebe ahụ pụọ, ndị ode akwụkwọ na ndị Farisii bidoro isogbu ya, na ịkpasu ya ikwu ọtụtụ okwu, 54na-esiri ya ọnya, ka ha mara ma ọ ga-ekwuhie ọnụ, ka ha hụ ihe ha ga-eji jide ya.

Ndị nsọ nke ụbọchị

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde A, afọ ụbọchị izu II.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike