Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọktoba 2026 › 14 Ọktoba
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 14 Ọktoba 2026
Wenezdee · Izu nke 28 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Wenezdee nke izu nke 28 nke Oge Nkịtị
Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ
Onye nsọ Kalistọs nke Mbụ, Pope na Onye nwụrụ nʼihi okwukwe · Ncheta a na-ahọrọ
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
18Ma ọ bụrụ na Mmụọ Nsọ na-edu unu, unu anọkwaghị nʼokpuru iwu. 19Ugbu a, ọrụ nke anụ ahụ pụtara ihe: ịkwa iko, adịghị ọcha na agụụ ịkwa iko. 20Ikpere arụsị, iri amụsụ, ibu iro nʼobi, na ịlụ ọgụ, ekworo na iwe, ịkpa iche iche, nkewa, ịhọ otu. 21Ịkpọ asị, igbu ọchụ, ịṅụbiga mmanya oke, oke oriri na ihe ndị ọzọ yiri ha. Ana m adọ unu aka na ntị dịka m gwara unu nʼoge gara aga, ndị na-eme ihe dị otu a agaghị abanye nʼalaeze Chineke. 22Ma mkpụrụ nke Mmụọ Nsọ bụ, ndụ ịhụnanya, na ọṅụ, na udo, na ogologo ntachiobi, na obiọma, na ịdị mma, na ikwesi ntụkwasị obi, 23ịdị nwayọọ, na ijide onwe. Ọ dịkwaghị iwu na-emegide ihe ndị a. 24Ma ndị niile bụ ndị Kraịst Jisọs akpọgidela anụ ahụ ha, ya na ọchịchọ ha nʼelu obe. 25Ọ bụrụ na anyị na-ebi ndụ mmụọ, ka nzọ ụkwụ anyị bụrụ nke mmụọ na-eduzi.
Abụ Ọma nzaghachi
1Onye ihe na-agara nke ọma ka mmadụ ahụ bụ, onye na-adịghị aga ije na ndụmọdụ ndị na-emebi iwu; onye na-adịghị eguzokwa nʼụzọ ndị mmehie maọbụ soro nʼotu ndị nkwutọ. 2Kama ihe na-atọ ya ụtọ bụ ime ihe niile dị nʼiwu Onyenwe anyị. Ọ na-atụgharịkwa uche ya nʼiwu Onyenwe anyị ehihie na abalị, 3Ọ dị ka osisi a kụrụ nʼakụkụ iyi, nke na-amịpụta mkpụrụ ya nʼoge ya, nke ahịhịa ya na-adịghị akpọnwụ akpọnwụ. Ihe niile ọ na-eme na-agara ya nke ọma. 4Ma ndị ajọ omume adịghị otu a. Ha dị ka igbugbo ọka nke oke ifufe na-efesasị. 6Nʼihi na Onyenwe anyị na-eche ụzọ ndị ezi omume nche. Ma ụzọ ndị ajọ omume ga-eduba ha nʼịla nʼiyi.
Oziọma
42“Ahụhụ ga-adịrị unu ndị Farisii, nʼihi na unu na-enye otu ụzọ nʼụzọ iri nʼihi mint, na mkpa akwụkwọ na-esi isi ụtọ na mkpa akwụkwọ niile dị iche iche nke ubi, ma leghara ikpe ziri ezi na ịhụnanya nke Chineke anya. Ihe niile ndị a ka unu kwesiri ime nʼelegharaghị ihe ndị ọzọ anya. 43“Ahụhụ ga-adịrị unu ndị Farisii! Nʼihi na unu na-ahụ ịnọ nʼisi oche niile nʼụlọ ekpere na ekele pụrụ iche a na-ekele unu nʼọma ahịa nʼanya. 44“Ahụhụ ga-adịrị unu, nʼihi na unu dị ka ili na-apụtaghị ihe, nke ndị mmadụ na-agafe nʼelu ha nʼihi na ha amaghị na ọ bụ ili.” 45Nʼotu oge, otu onye ozizi iwu sịrị ya, “Onye ozizi, mgbe ị na-ekwu ihe ndị a, anyị sokwa na ndị ị na-akọcha.” 46Ma ọ sịrị, “Ahụhụ ga-adịrị unu bụ ndị ozizi iwu. Nʼihi na unu na-ebo ndị mmadụ ibu ha na-enweghị ike ibuli, ma unu onwe unu adịghị eweli ọ bụladị otu mkpịsịaka unu, ịmetụ ibu ahụ aka.
Ndị nsọ nke ụbọchị
- Onye nsọ Kalistọs nke Mbụ, Pope na Onye nwụrụ nʼihi okwukwe
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde A, afọ ụbọchị izu II.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike