Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọktoba 2026 › 11 Ọktoba

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 11 Ọktoba 2026

Sọnde · Izu nke 28 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Sọnde nke 28 nke Oge Nkịtị

Sọnde · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Aịz 25:6–10

6Nʼelu ugwu a, ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ga-anọ kwadooro ụwa niile oke oriri. Ọ ga-abụ oke oriri nke ga-adịrị ndị niile. Oke oriri nke ezi anụ na mmanya dị mma ga-adị. 7Nʼelu ugwu a, ka ọ ga-ewepụ ihe ndị ahụ niile na-eweta ihu mgbarụ, nke dị ka akwa e ji kpuchie mmadụ niile, nke kpuchikwara ihu ndị mba niile. 8Ọ ga-elomi ọnwụ ruo mgbe ebighị ebi. Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ga-ehicha anya mmiri niile site nʼihu mmadụ niile, ọ ga-ewezuga ihe ịta ụta niile dakwasịrị ndị ya site nʼụwa niile. Onyenwe anyị ekwuola ya. 9Nʼụbọchị ahụ, ndị mmadụ ga-asị, “Nke a bụ Chineke anyị nʼezie, anyị tụkwasịrị ya obi, ọ zọpụtakwara anyị. Nke a bụ Onyenwe anyị ahụ, anyị tụkwasịrị ya obi, ka anyị nwee ọṅụ ma ṅụrịakwa na nzọpụta ya.” 10Nʼihi na aka Onyenwe anyị ga-adịgide nʼelu ugwu a, ma a ga-azọtọ ndị Moab nʼọnọdụ ha, dịka esi azọda ahịhịa dị nʼokpuru ụkwụ mmadụ.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 23:1–6

1Abụ Ọma Devid. Onyenwe anyị na-azụ m dịka atụrụ, ọ dịghị ihe akọrọ m. 2Ọ na-eme ka m dinaa ala nʼebe ahịhịa ndụ na-eto, ọ na-edugharị m nʼakụkụ mmiri dị jụụ, 3ọ na-atụte mkpụrụobi m. Ọ na-edu m nʼụzọ niile nke ezi omume nʼihi aha ya. 4A sịkwarị na m na-aga ije, na ndagwurugwu nke ọchịchịrị ọnwụ, agaghị m atụ egwu ihe ọjọọ ọbụla; nʼihi na ị nọnyeere m, mkpọrọ gị na mkpanaka gị na-akasị m obi. 5Ị na-akwado tebul nʼihu m, nʼanya ndị iro m. I tere isi m mmanụ iko m na-ejubiga oke. 6Nʼezie, ịdị mma na ebere ga-agbaso m ogologo ụbọchị niile nke ndụ m, m ga-ebikwa nʼụlọ Onyenwe anyị mgbe niile ebighị ebi.

Ihe ọgụgụ nke abụọ

Fil 4:12–14, 19–20

12Amụtala m otu m ga-esi nọrọ mgbe ihe siri ike na mgbe ihe bara ụba. Amụtakwala m otu m ga-esi nwee afọ ojuju nʼọnọdụ ọbụla, maọbụ mgbe m na-anọ agụụ, maọbụ mgbe m rijuru afọ, maọbụ mgbe m nwere ihe dị ukwuu maọbụ nʼoge ụkọ. 13Nʼihi na apụrụ m ime ihe niile site nʼinyeaka onye na-enye m ike. 14Ma unu mere nnọọ nke ọma inyere m aka nʼọnọdụ nsogbu nke m nọ nʼime ya. 19Ọ bụ Chineke m ga-egboro unu mkpa unu niile, site nʼụlọakụ ebube ya nke eluigwe, nʼihi Kraịst Jisọs. 20Ka otuto dịrị Chineke anyị, bụ Nna anyị, ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen.

Oziọma

Mat 22:1–14

1Jisọs gwara ha okwu ọzọ nʼilu sị, 2“Alaeze eluigwe dị ka otu eze, nke kwadoro oke oriri ọlụlụ di na nwunye, nʼihi nwa ya nwoke. 3O zipụrụ ndị ohu ya ka ha gaa chetara ndị ahụ a kpọrọ ka ha bịa. Ma ha niile achọghị ịbịa. 4“O zipụkwara ndị ohu ya ọzọ na-ejere ya ozi ka ha gaa gwa ndị ahụ a kpọrọ oriri sị, ‘E dozichaala ihe oriri ugbu a, egburu m oke ehi, na anụ ọzọ gbara abụba. Edoziela ihe niile. Bịanụ nʼoriri ọlụlụ di na nwunye.’ 5“Ma ndị ahụ niile a kpọrọ oriri gawaara mkpa ha nʼihi na ha akpọghị ya ihe ọbụla. Otu onye gara nʼala ubi ya, nke ọzọ nʼụlọ ahịa ya. 6Ndị fọdụrụ jidere ndị ohu ya, mee ha ihe ihere ma gbukwaa ha. 7Onye eze ahụ were iwe nke ukwuu, zipụ ndị agha ya ka ha gaa laa ndị ogbu mmadụ ahụ nʼiyi, rechapụkwa obodo ha nʼọkụ. 8“Mgbe ahụ ọ gwara ndị ohu ya sị, ‘E doziela m oriri ọlụlụ di na nwunye, ma ndị a kpọrọ oku ekwesighị ekwesi. 9Ugbu a, gaanụ nʼakụkụ ụzọ niile, kpọbatanụ ndị niile unu hụrụ, ka ha bịa nʼoriri ọlụlụ di na nwunye a.’ 10Ndị ohu ahụ pụrụ gaa nʼokporoụzọ niile kpọbata mmadụ niile ha hụrụ. Ha kpọbatara ndị bụ ezi mmadụ na ndị bụ ajọ mmadụ. Ụlọ oriri ahụ jupụtakwara na ndị a kpọrọ. 11“Ma mgbe eze ahụ batara ileta ndị niile nọ na nri, ọ hụrụ otu nwoke nke na-eyighị uwe ọlụlụ nwunye. 12Ọ jụrụ ya ajụjụ sị, ‘Enyi m, i si aṅaa bata nʼebe a mgbe ị na-eyighị uwe ọlụlụ di na nwunye?’ O mechiri ọnụ ya nʼihi na o nweghị ihe ọ ga-asa. 13“Eze ahụ nyere ndị ozi ya iwu sị ha, ‘Keenụ ya eriri, aka na ụkwụ, tụpụkwanụ ya nʼezi, nʼime ọchịchịrị, ebe ịkwa akwa na ịta ikikere eze ga-adị.’ 14“Nʼihi na akpọrọ ọtụtụ mmadụ oku, maọbụ mmadụ ole na ole ka a họọrọ.”

Ndị nsọ nke ụbọchị

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde A, afọ ụbọchị izu II.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike