Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọktoba 2026 › 10 Ọktoba
Kalenda Ọtọdọks · 27 Septemba (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 10 Ọktoba 2026
Satọdee · Izu nke 19 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 1
Mmemme na ndị nsọ
Martyr Callistratus and 49 Martyrs in his company († 304)
Obubu ọnụ
Ọ dịghị obubu ọnụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi (maka Fraịdee)
27Ma nʼọnọdụ ọbụla, na-ebinụ ndụ kwesiri oziọma nke Kraịst, ma abịara m leta unu maọbụ na abịaghị m, ka a mata na unu guzosiri ike nʼotu mmụọ, werekwa otu obi na-agba mgba nʼokwukwe nke ikwusa oziọma, 28na-atụghị ụjọ ihe ndị na-emegide unu ga-eme. Iguzosi ike unu ga-agbara ha ezi ama banyere ịla nʼiyi nke ga-abịakwasị ha. Ma nʼebe unu nọ, ọ ga-abụrụ unu nzọpụta pụtara ihe nke sikwa nʼebe Chineke nọ bịa. 29Nʼihi na ohere ahụ e nyere unu, abụghị naanị ikwere na Kraịst, kama ọ bụkwa ịhụ ahụhụ nʼihi ya. 30Unu nọ na-agabiga ụdị ibu agha ahụ unu hụrụ na m gabigara, nke unu na-anụkwa na m ka nọ nʼime ya ugbu a. 2:1Ya mere, ọ bụrụ na e nwere nkasiobi ọbụla dịrị anyị nʼihi njikọta e jikọtara anyị na Kraịst, ọ bụrụkwa na e nwere inyeaka ọbụla site nʼịhụnanya ya, ọ bụrụkwa na ọ dị nnwekọ ọbụla anyị na Mmụọ na-enwekọ, ọ bụrụ na unu nwere obi nro na ọmịiko, 2meenụ ka ọṅụ m zuo oke, site nʼinwe nkwekọta nʼihe ọbụla, site nʼịhụrịta onwe unu nʼanya, sitekwa nʼinwekọ otu mmụọ, na otu uche. 3Emela ihe ọbụla nʼihi naanị ọdịmma nke gị, maọbụ bie ndụ nʼụzọ ịdọtara onwe gị otuto efu. Kama bụrụ onye wedara onwe ya ala, onye na-ahụ ndị ọzọ dị ka ndị ka ya mma. 4Echela echiche banyere naanị ihe metụtara gị, kama, na-eleba anya nʼihe banyere ndị ọzọ.
Akwụkwọ ozi
58Ya mere, ụmụnna m ndị m hụrụ nʼanya, kwụsienụ ike, bụrụnụ akwaa akwụrụ. Nọgidenụ nʼọrụ Onyenwe anyị mgbe niile, ebe unu maara na ọrụ unu na-arụ nʼime Onyenwe anyị abụghị ihe efu. 16:1Nʼihe niile banyere ụtụ ihe onyinye nke ndị nsọ, gbalịanụ mee dịka m nyere ndị chọọchị dị nʼakụkụ Galeshịa nʼiwu. 2Ụbọchị ụka niile, ka onye ọbụla site nʼihe ọ kpatara nʼizu ụka ahụ wepụta ụfọdụ ihe nke ọ ga-eji nye onyinye a. Unu e cherekwala ịnakọta ihe onyinye ndị a ruo mgbe m ga-abịa. Ka a hapụ iche tutu ruo mgbe m bịara. 3Mgbe m bịara, aga m edenye ndị ahụ kwesiri ntụkwasị obi, bụ ndị unu họpụtara akwụkwọ nkọwa, ziga ha ibugara ndị nọ na Jerusalem onyinye obiọma unu.
Oziọma (maka Fraịdee)
22Mmadụ niile kwuru okwu ọma banyere ya nʼihi okwu amara niile si ya nʼọnụ pụta nke mere na ha jụrịtara onwe ha sị, “Onye a, ọ bụghị nwa nwoke Josef?” 23Ọ sịrị ha, “Nʼezie, amaara m na unu ga-atụrụ m ilu a: ‘Dibịa, gwọọ onwe gị!’ Sikwa m, ‘Ihe ndị ahụ niile anyị nụrụ ị na-eme na Kapanọm mee ha nʼebe a bụ obodo gị.’ ” 24Ọ gara nʼihu sị, “Ma ị gwa unu eziokwu, o nweghị onye amụma ọbụla a na-anabata nke ọma nʼobodo a mụrụ ya. 25Nʼezie, chetakwanụ na e nwere ọtụtụ ụmụ nwanyị di ha nwụrụ anwụ nʼoge Ịlaịja onye amụma. Nʼoge oke ụnwụ dara nʼala ahụ dum, mgbe e mechiri eluigwe na mmiri ezoghị nʼala Izrel afọ atọ na ọnwa isii. 26Ma e zigaghị Ịlaịja ka o jekwuru onye ọbụla nʼime ha karịakwa nwanyị di ya nwụrụ anwụ nʼobodo Zarefat nʼakụkụ Saịdọn. 27Nʼoge Ịlaisha onye amụma, e nwere ọtụtụ ndị ekpenta nʼala Izrel, ma o nweghị onye e mere ka ọ dị ọcha nʼetiti ha karịakwa Neeman onye Siria.” 28Mgbe ndị nọ nʼụlọ ekpere ahụ nụrụ nke a, iwe were ha nke ukwuu. 29Ha biliri, kwapụ ya site nʼobodo ahụ, dọkpụrụ ya gaa nʼelu ugwu nke e wukwasịrị obodo ahụ ka ha nwee ike tụpụ ya site nʼugwu ahụ. 30Ma o sitere nʼetiti igwe mmadụ ahụ pụọ, gawara onwe ya.
Oziọma
31O sitere nʼebe ahụ gaa Kapanọm, obodo dịkwa na Galili. Nʼụbọchị izuike, o bidoro izi ha ihe. 32Ozizi ya juru ha anya, nʼihi na okwu ya nwere ikike. 33Otu nwoke nọ nʼime ụlọ ekpere ahụ, onye mmụọ na-adịghị ọcha bi nʼime ya. O tiri mkpu nʼoke olu, 34“Hapụ anyị! Gịnị ka ị na-achọ nʼebe anyị nọ, gị, Jisọs onye Nazaret? Ị bịara ka ị laa anyị nʼiyi? Ama m onye ị bụ, Onye Nsọ nke Chineke!” 35Jisọs baara ya mba sị, “Nọrọ jii! Si nʼime ya pụta.” Mgbe ahụ mmụọ ọjọọ ahụ tụdara ya nʼala nʼihu ha niile, o sikwa nʼime ya pụọ ma o merụghị ya ahụ. 36Ihe ndị a juru ha niile anya, ha jụrịtara ibe ha sị, “Gịnị bụ ozizi nke a? O ji ịchị isi na ike na-enye mmụọ na-adịghị ọcha ndị a iwu, ha na-apụtakwa!”
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 27 Septemba na kalenda nzukọ bụ 10 Ọktoba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike