Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọktoba 2026 › 7 Ọktoba

Kalenda Ọtọdọks · 24 Septemba (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 7 Ọktoba 2026

Wenezdee · Izu nke 19 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 1

Mmemme na ndị nsọ

Protomartyr and Equal-to-the-Apostles Thekla (1st C)

Ụbọchị obubu ọnụ

Obubu ọnụ: ya na mmanụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Akwụkwọ ozi

Fil 1:12–20

12Ugbu a ụmụnna m, nke a bụ ihe m chọrọ ime ka unu ghọta, na nsogbu niile dakwasịrị m emeela ka ọrụ ikwusa oziọma na-aga nʼihu. 13Nʼihi na ọ pụtala ihe nye ndị nche nke ụlọeze ahụ na onye ọbụla ọzọ, na ọ bụ naanị nʼihi na m bụ onye na-eso Kraịst ka e ji tụọ m mkpọrọ. 14Site na mkpọrọ a a tụrụ m, e meela ka ọtụtụ ụmụnna anyị bụrụ ndị nwere ezi ntụkwasị obi nʼime Onyenwe anyị, nwekwa oke nkwuwa okwu, izisa oziọma ahụ na-atụghị egwu ọbụla. 15Ọ bụ eziokwu na ụfọdụ ji ekworo na anya ụfụ na-ekwusa Kraịst, ma ụfọdụ kwa na-ezisa ya site nʼọchịchọ obi ziri ezi. 16Ndị ahụ ji ọchịchọ obi ziri ezi na-eme nke a nʼịhụnanya ebe ha matara na e tinyere m ebe a nʼihi izisa oziọma. 17Ndị mbụ ahụ na-ekwusa Kraịst site nʼọchịchọ obi nke onwe ha, ọ bụghị site nʼezi obi, ebe ha na-eche na ha ga-akpalị nsogbu nye m nʼime mkpọrọ. 18Gịnịkwa ka ogbochiri? Otu ọ dị, maọbụ nʼụzọ aghụghọ maọbụ nʼeziokwu, ihe dị mkpa bụ nʼụzọ ọbụla a na-ekwusa oziọma Kraịst, nʼihi nke a ka m na-aṅụrị ọṅụ. E, m ga-aṅụrịkwa ọṅụ mgbe niile. 19Nʼihi na-amaara m na site nʼekpere unu, ya na ịgbaume nke Mmụọ Jisọs Kraịst ihe ndị a niile dakwasịrị m ga-emesi ghọọrọ m nzọpụta. 20Nʼihi na olileanya m na ntụkwasị obi m bụ na ihere agaghị eme m nʼụzọ ọbụla, kama, aga m enwe ezi agbamume nke ga-eme ka e bulie Kraịst elu nʼahụ m, ma ugbu a ma mgbe niile, maọbụ na ndụ, ma ọ bụkwanụ nʼọnwụ.

Akwụkwọ ozi (maka Tọọzdee)

Fil 1:20–27

20Nʼihi na olileanya m na ntụkwasị obi m bụ na ihere agaghị eme m nʼụzọ ọbụla, kama, aga m enwe ezi agbamume nke ga-eme ka e bulie Kraịst elu nʼahụ m, ma ugbu a ma mgbe niile, maọbụ na ndụ, ma ọ bụkwanụ nʼọnwụ. 21Nʼihi na nʼebe m nọ, ịdị ndụ bụ Kraịst, ịnwụ ọnwụ bụkwa uru. 22Ma ọ bụrụ na ịdị ndụ nʼanụ ahụ, nke a buuru m ịrụpụta ọrụ bara uru, enweghị m ike ikwu nke m ga-ahọrọ. 23Ụzọ ihe abụọ a na-eche m ihu: Ma ọchịchọ obi m bụ ịlakwuru Kraịst, nʼihi na ọ bụ nke kachasị mma. 24Ma ọ pụtara ihe na ọ dị mkpa nye unu ma ọ bụrụ na m adịrị ndụ nʼanụ ahụ. 25Ebe nke a doro m anya, amara m na mụ na unu niile ga-aga nʼihu ịnọ maka ọganihu na ọṅụ nke unu nʼime okwukwe. 26Ka mgbe m ga-abịakwute unu ọzọ, unu ga-enwebiga ọṅụ oke nʼime Kraịst Jisọs nʼihi m. 27Ma nʼọnọdụ ọbụla, na-ebinụ ndụ kwesiri oziọma nke Kraịst, ma abịara m leta unu maọbụ na abịaghị m, ka a mata na unu guzosiri ike nʼotu mmụọ, werekwa otu obi na-agba mgba nʼokwukwe nke ikwusa oziọma,

Oziọma

Luk 4:1–15

1Jisọs, onye jupụtara na Mmụọ Nsọ, sitere na Jọdan lọta. Mmụọ nsọ duuru ya baa nʼọzara. 2Ebe ahụ ka ekwensu nwara ya ọnwụnwa iri ụbọchị anọ. Nʼụbọchị ndị ahụ niile o righị nri ọbụla. Nʼikpeazụ agụụ gụrụ ya. 3Ekwensu sịrị ya, “Ọ bụrụ na ị bụ Ọkpara Chineke, gwa nkume a ka ọ ghọọ achịcha.” 4Jisọs zara ya sị, “E dere ya, ‘Ọ bụghị naanị site na achịcha ka mmadụ ga-eji dị ndụ.’ ” 5Ekwensu duuru ya rigoo nʼebe dị elu, gosi ya alaeze niile nke ụwa, nʼotu ntabi anya. 6Ọ gwara ya sị, “M ga-enye gị ikike niile ndị a na ebube ha. Ọ bụ m ka e nyere ha, e nwere m ike inye ha onye ọbụla m chọrọ inye ha. 7Ya mere, ọ bụrụ na ị kpọọ isiala nye m, ha ga-abụ nke gị.” 8Jisọs zara ya sị, “E deela ya: ‘Ị ga-akpọ isiala nye Onyenwe anyị Chineke gị, naanị ya ka ị ga-efekwa.’ ” 9Ekwensu duuru ya gaa Jerusalem, mee ka o guzo nʼebe dịkarịsịrị elu nke ụlọnsọ ukwu ahụ. Ọ sịrị ya, “Ọ bụrụ na ị bụ Ọkpara Chineke, si nʼebe a tụda onwe gị nʼala. 10Nʼihi na e dere ya, “ ‘Ọ ga-enye ndị mmụọ ozi ya iwu banyere gị, ichekwa gị nke ọma; 11ha ga-ebuli gị elu nʼaka ha, ka ị ghara ịkpọbi ụkwụ gị na nkume.’” 12Jisọs zara ya sị, “E kwuola ya, Anwala Onyenwe anyị Chineke gị ọnwụnwa. ” 13Mgbe ekwensu nwasịrị ya ọnwụnwa ndị a niile, ọ hapụrụ ya ruo mgbe ohere ọzọ dapụtara. 14Jisọs lọghachiri na Galili nʼike nke Mmụọ Nsọ. Akụkọ banyere ya gbasara ruo akụkụ obodo niile. 15O ziri ihe nʼọtụtụ ụlọ ekpere ha, mmadụ niile na-etokwa ya.

Oziọma (maka Tọọzdee)

Luk 4:16–22

16Mgbe o rutere Nazaret ebe ọ nọrọ too, nʼụbọchị izuike, ọ gara nʼụlọ ekpere dị ka ọ dị mbụ eme. O guzoro ọtọ ịgụ akwụkwọ nsọ. 17E nyere ya akwụkwọ nke onye amụma Aịzaya dere. O meghere ya chọta ebe e dere sị, 18“Mmụọ nke Onyenwe anyị dị nʼahụ m, nʼihi na o teela m mmanụ ka m kwusaa oziọma nye ndị ogbenye. O zitela m ikwupụta inwere onwe nye ndị mkpọrọ, ya na ịhụ ụzọ nye ndị kpuru ìsì, ime ka ndị a na-emegbu emegbu nwere onwe ha. 19Ikwupụta afọ Onyenwe anyị ga-eme amara.” 20O mechiri akwụkwọ ahụ nyeghachi ya onye ahụ na-eje ozi, nọdụ ala. Ndị mmadụ niile nọ nʼụlọ nzukọ ahụ legidere ya nnọọ anya. 21Ma o bidoro ịgwa ha sị, “Taa ka ihe ndị a e dere nʼakwụkwọ nsọ a mezuru na ntị unu.” 22Mmadụ niile kwuru okwu ọma banyere ya nʼihi okwu amara niile si ya nʼọnụ pụta nke mere na ha jụrịtara onwe ha sị, “Onye a, ọ bụghị nwa nwoke Josef?”

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 24 Septemba na kalenda nzukọ bụ 7 Ọktoba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike