Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọktoba 2026 › 7 Ọktoba
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 7 Ọktoba 2026
Wenezdee · Izu nke 27 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Wenezdee nke izu nke 27 nke Oge Nkịtị
Ncheta · Agba ofufe: ọcha
Nne anyị nke Rosari · Ncheta
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
1Mgbe afọ iri na anọ gasịrị, ejeghachiri m Jerusalem ọzọ. Mụ na Banabas laghachiri Jerusalem, akpọkwara m Taịtọs jee. 2Agara m nʼihi mkpughe m nwere. Na nzukọ nzuzo nke m na ndị ndu nwere, akọwaara m ha ihe banyere oziọma nke m na-ekwusa nʼetiti ndị mba ọzọ. Nʼihi na-achọghị m ka ọrụ niile m rụrụ nʼoge gara aga, na ọrụ m na-arụ ugbu a, bụrụ ihe efu. 7Ma nʼaka nke ọzọ, mgbe ha hụrụ na e nyere m ọrụ izisa oziọma nʼetiti ndị e bighị ugwu, dịka e nyere Pita izisa oziọma nʼetiti ndị e biri ugwu. 8Nʼihi na Chineke onye si nʼaka Pita na-arụ ọrụ onyeozi oziọma nʼetiti ndị e biri ugwu, sikwa nʼime m na-arụ ọrụ onyeozi izisara ndị mba ọzọ oziọma. 9Mgbe Jemis, Sefas na Jọn ndị a maara dị ka ide ji ụlọ nʼetiti ndị ndu ahụ niile nara m na Banabas aka nnwekọ, nabatakwa amara e nyere m. Ha gbara anyị ume, sị anyị gaa nʼihu nʼọrụ anyị, ikwusa oziọma nʼetiti ndị mba ọzọ, ka ha onwe ha kwa gaa nʼihu ịrụ ọrụ nke ha nʼetiti ndị e biri ugwu. 10Ọ bụ naanị otu ihe ka ha rịọrọ anyị, nke bụ ka anyị cheta ndị ogbenye. Nke a bụkwa ihe m na-achọsi ike ime. 11Ma mgbe Sefas bịaruru Antiọk, eguzogidere m ya nʼihu ya, nʼihi na ihe o mere mara ya ikpe. 12Tupu ndị Jemis zitere abịaruo ebe ahụ, ya na ndị mba ọzọ na-erikọ nri, ma mgbe ha rutere, ọ wepụrụ aka na nri laghachi azụ nʼihi na egwu ndị e biri ugwu na-atụ ya. 13Ndị Juu ụfọdụ sonyekwara ya inwe ihu abụọ a, nke mere na e si otu a duhiekwa Banabas nʼonwe ya. 14Ma mgbe m hụrụ na ha adịghị eme ihe dị ka eziokwu nke oziọma ahụ si dị, agwara m Sefas okwu nʼihu ha niile, sị, “Ọ bụrụ na gị nwa onye Juu na-ebi ndụ dịka onye mba ọzọ, na-abụghị dịka onye Juu, olee otu ị ga-esi manye ndị mba ọzọ ka ha na-ebi ndụ dịka ndị Juu?”
Abụ Ọma nzaghachi
1Toonu Onyenwe anyị, unu mba niile dị iche iche. Jaakwa ya mma, unu ndị niile dị iche iche. 2Nʼihi na ịhụnanya ya nʼebe anyị nọ dị ukwuu. Ikwesi ntụkwasị obi Onyenwe anyị na-adịkwa ruo mgbe ebighị ebi. Toonu Onyenwe anyị!
Oziọma
1Ọ nọ nʼotu ebe na-ekpe ekpere, mgbe o kpesịrị ekpere, otu nʼime ndị na-eso ụzọ ya sịrị ya, “Onyenwe anyị, kuziere anyị ikpe ekpere, dị ka Jọn kuziri ndị na-eso ụzọ ya.” 2Ọ sịrị ha, “Mgbe unu na-ekpe ekpere, sịnụ: “ ‘Nna, ka e doo aha gị nsọ ka alaeze gị bịa. 3Nye anyị taa nri nke ụbọchị anyị. 4Gbaghara anyị mmehie anyị, nʼihi na anyị na-agbaghara onye ọbụla mehiere megide anyị. Ekwela ka anyị daba nʼime ọnwụnwa.’ ”
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde A, afọ ụbọchị izu II.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike