Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọktoba 2026 › 6 Ọktoba
Kalenda Ọtọdọks · 23 Septemba (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 6 Ọktoba 2026
Tiuzdee · Izu nke 19 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 1
Mmemme na ndị nsọ
Conception by St Elizabeth of the Honorable Glorious Prophet, Forerunner and Baptizer of the Lord John
Obubu ọnụ
Ọ dịghị obubu ọnụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
8Chineke bụ onye akaebe m, otu agụụ unu niile si agụsi m ike site nʼịhụnanya nke Kraịst Jisọs. 9Nke a bụkwa ekpere m, ka ịhụnanya unu na-ahụrịta onwe unu na-ababiga ụba oke. Ka unu nwee ike ito eto, ruo nʼinwe mmazu na nghọta ihe niile. 10Ka unu nwee ike nwapụta ihe nke kachasị mma. Mgbe ahụ, unu ga-adị ọcha nʼenweghị ịta ụta ọbụla maka ụbọchị nke Kraịst. 11Ebe e mejupụtara unu na mkpụrụ nke ezi omume nke sitere na Jisọs Kraịst iji bulie Chineke elu ma nyekwa ya otuto. 12Ugbu a ụmụnna m, nke a bụ ihe m chọrọ ime ka unu ghọta, na nsogbu niile dakwasịrị m emeela ka ọrụ ikwusa oziọma na-aga nʼihu. 13Nʼihi na ọ pụtala ihe nye ndị nche nke ụlọeze ahụ na onye ọbụla ọzọ, na ọ bụ naanị nʼihi na m bụ onye na-eso Kraịst ka e ji tụọ m mkpọrọ. 14Site na mkpọrọ a a tụrụ m, e meela ka ọtụtụ ụmụnna anyị bụrụ ndị nwere ezi ntụkwasị obi nʼime Onyenwe anyị, nwekwa oke nkwuwa okwu, izisa oziọma ahụ na-atụghị egwu ọbụla.
Akwụkwọ ozi (maka Onye bu ụzọ)
22Nʼihi na e dere ya nʼakwụkwọ nsọ na Ebraham nwere ụmụ nwoke abụọ. Otu nʼime ha bụ nwa nke ohu ya nwanyị mụrụ, nke ọzọ bụ nke nwunye ya na-abụghị ohu mụtara. 23Nwa ahụ nke ohu nwanyị ahụ mụrụ bụ onye amụrụ site na anụ ahụ. Ma nwa ahụ nwunye ya na-abụghị ohu mụtara bụ onye a mụrụ site na nkwa. 24Anyị ga-ewere ihe ndị a dị ka ihe ịmaatụ, nʼihi na ụmụ nwanyị abụọ ndị a nọchiri anya ọgbụgba ndụ abụọ. Otu ọgbụgba ndụ sitere nʼUgwu Saịnaị ma mụọkwa ụmụ ndị bụ ohu: nke a bụ Hega. 25Hega bụ Ugwu Saịnaị nke dị nʼArebịa. Ọ dabara nʼọnọdụ Jerusalem nke ugbu a, nʼihi na ya na ụmụ ya nọ nʼohu. 26Ma nwanyị nke ọzọ nọ ọnọdụ Jerusalem nke dị nʼelu, nke nwe onwe ya. Ọ bụkwa ya bụ nne anyị. 27Nʼihi na e dere ya, “Ṅụrịa ọṅụ, gị nwanyị aga, onye na-amụtaghị nwa. Tie mkpu ọṅụ, tisiekwa mkpu akwa ike gị onye ime nwa na-emetụbeghị, nʼihi na ụmụ nwanyị ahụ a hapụrụ naanị ya ga-adị ọtụtụ karịa ụmụ nke nwanyị nwere dị.” 28Ugbu a, ụmụnna m, unu bụ ụmụ ahụ nke e kwere na nkwa, dị ka Aịzik. 29Nʼoge ahụ, nwa ahụ a mụrụ nʼụzọ anụ ahụ kpagburu nwa ahụ a mụrụ site nʼike nke Mmụọ Nsọ. Otu a ka ọ dịkwa nʼoge a. 30Ma gịnị ka akwụkwọ nsọ kwuru? “Chụpụ ohu nwanyị a na nwa ya, nʼihi na nwa nwoke ohu nwanyị a apụghị isoro nwa nke nwanyị na-abụghị ohu kerikọta oke.” 31Ya mere, ụmụnna m, anyị abụghị ụmụ nke nwanyị ohu, kama anyị bụ ụmụ nke nwanyị nwere onwe ya.
Oziọma
23Jisọs agbaala ihe dị ka iri afọ atọ mgbe o bidoro ọrụ ya. Ọ bụ nwa (dịka ndị mmadụ chere) Josef, onye bụ nwa Heli; 24Heli abụrụ nwa Matat, nwa Livayị, nwa Meliki, nwa Janayi, nwa Josef; 25nwa Matatiyas, nwa Emọs, nwa Nehum, nwa Esili, nwa Nagayị; 26nwa Maat, nwa Matatiyas, nwa Semein, nwa Josek, nwa Joda; 27nwa Joanan, nwa Resa, nwa Zerubabel, nwa Shealtiel, nwa Neri; 28nwa Meliki, nwa Adi, nwa Kosam, nwa Elmadam, nwa Er, 29nwa Joshua, nwa Elieza, nwa Jorim, nwa Matat, nwa Livayị; 30nwa Simiọn, nwa Juda, nwa Josef, nwa Jonam, nwa Eliakịm; 31nwa Melea, nwa Mena, nwa Matata, nwa Netan, nwa Devid; 32nwa Jesi, nwa Obed, nwa Boaz, nwa Salmọn, nwa Nashọn; 33nwa Aminadab, nwa Ram, nwa Hezrọn, nwa Perez, nwa Juda; 34nwa Jekọb, nwa Aịzik, nwa Ebraham, nwa Tera, nwa Nahọ; 35nwa Serug, nwa Reu, nwa Peleg, nwa Eba, nwa Shela; 36nwa Kenan, nwa Aafaksad, nwa Shem, nwa Noa, nwa Lamek; 37nwa Metusela, nwa Enọk, nwa Jared, nwa Mahalalel, nwa Kenan; 38nwa Enọsh, nwa Set, nwa Adam, nwa Chineke. 4:1Jisọs, onye jupụtara na Mmụọ Nsọ, sitere na Jọdan lọta. Mmụọ nsọ duuru ya baa nʼọzara.
Oziọma (maka Onye bu ụzọ)
5Nʼoge Herọd bụ eze Judịa, ọ dị otu onyeisi nchụaja aha ya bụ Zekaraya, onye si nʼotu ndị nchụaja nke Abija. Elizabet bụ nwunye ya, site nʼagbụrụ Erọn. 6Ha abụọ bụ ndị ezi omume nʼihu Chineke. Ha debere iwu na ụkpụrụ niile Onyenwe anyị nyere na-enweghị ntụpọ ọbụla. 7Mana ha amụtaghị nwa, nʼihi na Elizabet bụ nwanyị agaa, ha abụọ emeela nnọọ agadi. 8O ruru mgbe ọ bụ ndị otu Zekaraya ga-eje ozi, ọ nọ dịka onye nchụaja na-eje ozi nʼihu Chineke. 9A họpụtara ya site nʼife nza dị ka omenaala ndị nchụaja si dị ka ọ bụrụ ya ga-abanye nʼime ime ụlọnsọ Onyenwe anyị ịchụ aja nsure ọkụ nke e ji ụda na-esi isi ụtọ achụ. 10Mgbe oge ịchụ aja ụda na-esi isi ụtọ ruru, igwe ndị mmadụ bịara nọ nʼezi na-ekpe ekpere. 11Mgbe ahụ, mmụọ ozi Onyenwe anyị, onye guzo nʼaka nri nke ebe ịchụ aja nke ihe na-esi isi ụtọ mere ka ọ hụ ya anya. 12Mgbe Zekaraya hụrụ ya, obi fepụrụ ya, ọ tụkwara oke egwu. 13Ma mmụọ ozi ahụ gwara ya sị, “Zekaraya atụla egwu, Chineke anụla ekpere gị. Elizabet nwunye gị ga-atụrụ ime mụtara gị nwa nwoke. Ị ga-akpọkwa aha ya Jọn. 14Ọ ga-abụrụ gị ihe oke ọṅụ na obi ụtọ, ọtụtụ mmadụ ga-aṅụrịkwa ọṅụ nʼihi ọmụmụ ya. 15Nʼihi na ọ ga-abụ onye dị ukwuu nʼanya Onyenwe anyị. Ọ gaghị aṅụkwa mmanya ọbụla, maọbụ ihe ọṅụṅụ ọbụla na-egbu egbu nʼihi na site nʼafọ nne ya ọ ga-abụ onye emejupụtara na Mmụọ Nsọ. 16Ọ ga-akpọghachite ọtụtụ ụmụ Izrel nye Onyenwe ha bụ Chineke ha. 17Ma ọ ga-aga nʼihu Onyenwe anyị nʼike mmụọ na ike nke Ịlaịja, tụgharịa obi ndị bụ nna nʼebe ụmụ ha nọ. Meekwa ka ndị isiike tụgharịa obi, lekwasị anya nʼamamihe nke ndị ezi omume, na ijikere ụmụ mmadụ nʼihi Onyenwe anyị.” 18Zekaraya sịrị mmụọ ozi ahụ, “Olee otu m ga-esi mata na nke a ga-adị otu a? Abụrụla m agadi. Nwunye m akakwaala nka.” 19Mmụọ ozi zara ya sị, “Abụ m Gebrel. Ana m eguzo nʼihu Chineke. Ezitere m ka m bịa gwa gị okwu ma wetara gị oziọma a. 20Ma lee, ị ga-ada ogbi, ị gaghị ekwukwa okwu ọbụla, tutu ruo mgbe ihe ndị a ga-emezu nʼihi na i kwenyeghị nʼokwu m, nke ga-emezu mgbe oge ya ruru.” 21Mgbe ihe ndị a niile na-eme, mmadụ ndị ahụ nọkwa na-eche Zekaraya ka ọ pụta. O juru ha anya na ọ nọọla ọdụ nʼime ime ụlọnsọ ukwu ahụ. 22Mgbe o mesịrị pụta, o nwekwaghị ike ikwuru ha okwu. Ha ghọtara na ọ hụrụ ọhụ nʼime ụlọnsọ ahụ nʼihi na ọ bụ aka ka o ji gwa ha okwu. 23Mgbe oge ịrụ ọrụ ya gwụsịrị, ọ laghachiri nʼụlọ ya. 24Mgbe ụbọchị ndị ahụ gasịrị, Elizabet bụ nwunye ya tụụrụ ime. O zoro onwe ya nʼime ụlọ ọnwa ise. 25Ọ sịrị, “Onyenwe anyị emeerela m nke a. O gosila m ihuọma ya nʼụbọchị ndị a, ma wepụkwara m ihere nʼetiti ndị nke m.”
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 23 Septemba na kalenda nzukọ bụ 6 Ọktoba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike