Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọktoba 2026 › 6 Ọktoba

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 6 Ọktoba 2026

Tiuzdee · Izu nke 27 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Tiuzdee nke izu nke 27 nke Oge Nkịtị

Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ

Onye nsọ Bruno, Onye ụkọchukwu · Ncheta a na-ahọrọ

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Gal 1:13–24

13Amara m na unu anụla ihe banyere ndụ m nʼoge gara aga, nʼofufe ndị Juu, na otu m si jiri ike kpagbuo nzukọ Chineke nʼebe niile, ma gbalịsiekwa ike ibibi ya. 14Abụ m otu nʼime ndị amaara aha ha nʼetiti ndị ọgbọ m, nʼihe banyere ofufe ndị Juu. Nʼihi oke ịnụ ọkụ nʼobi nke m nwere ịgbaso na idebezu ụkpụrụ omenaala na ofufe, nke nna nna m ha. 15Ma mgbe ọ tọrọ Chineke ụtọ, bụ onye kewapụrụ m iche tupu amụọ m, kpọọ m site nʼamara ya, 16ikpughe Ọkpara ya nʼime m, ka m nwe ike kwusaa ihe banyere ya nʼetiti ndị mba ọzọ, e jekwurughị m anụ ahụ ọbụla ịnụta ihe ọbụla nʼaka ya. 17Ejekwaghị m Jerusalem ịhụ ndị ahụ bu m ụzọ bụrụ ndị ozi, kama a gara m Arebịa, ma laghachikwa azụ na Damaskọs. 18Ọ bụ mgbe afọ atọ gasịrị, ka m gara Jerusalem ịhụ Sefas. Anọnyekwara m ya ụbọchị iri na ise. 19Ma ọ dịkwaghị onyeozi ọzọ m hụrụ, ma ọ bụghị naanị Jemis, nwanne Onyenwe anyị. 20Ana m agwa unu okwu a nʼihu Chineke. Ihe ndị a m na-ekwu abụghị okwu ụgha. 21Emesịa, agara m Siria na Silisia. 22Ma ndị Kraịst nọ na chọọchị niile dị nʼala Judịa amaghị onye m bụ. 23Naanị ihe ha na-ekwu bụ, “Onye ahụ na-esogbu anyị na mbụ na-ekwusazi ugbu a okwukwe ahụ ọ gbalịsịrị ike ibibi na mbụ.” 24Ha nyere Chineke otuto nʼihi m.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 139:1–3, 13–15

1Abụ nke dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid. O Onyenwe anyị, ị nyochaala m, ị makwaara m nke ọma 2Ị maara mgbe m na-anọdụ ala na mgbe m na-eguzo ọtọ; site nʼebe dị anya, ị na-aghọta echiche obi m niile. 3Ị na-ahụzu ọpụpụ m na ndina ala m; ị mazukwara ụzọ m niile. 13Ọ bụ gị kpụrụ akụkụ niile dị m nʼahụ. Ọ bụkwa gị jikọtara ha niile ka ha bụrụ otu mmadụ nʼime afọ nne m. 14Ana m eto gị nʼihi na abụ m onye e sitere nʼoke egwu na ebube kee; ọrụ gị niile dị ebube; amaara m nke a nke ọma. 15Ụdịdị m abụghị ihe zoro ezo nʼebe ị nọ mgbe a kpụrụ m nʼebe nzuzo ahụ, mgbe a kpakọtara m nʼebe omimi nke ụwa.

Oziọma

Luk 10:38–42

38Mgbe ha na-aga nʼụzọ, ọ banyere nʼotu obodo nta ebe nwanyị a na-akpọ Mata nabatara ya nʼụlọ ya. 39O nwere nwanne nwanyị a na-akpọ Meri nke nọdụrụ ala nʼụkwụ Onyenwe anyị na-ege ntị nʼihe ọ na-ekwu. 40Ma uche Mata gbasasịrị agbasa ebe ọ na-akwado maka ile ọbịa. Ọ bịakwutere ya sị ya, “Onyenwe anyị, ọ bụ na o metụghị gị nʼobi na nwanne m nwanyị hapụrụ naanị m ije ozi niile? Gwa ya ka ọ bịa nyere m aka.” 41Ma Onyenwe anyị zara ya sị, “Mata, Mata, ị na-echegbu onwe gị ma na-adọgbukwa onwe gị banyere ọtụtụ ihe, 42maọbụ naanị otu ihe dị mkpa, Meri ahọrọla nke ka mma, nke a na-agaghị anapụkwa ya.”

Ndị nsọ nke ụbọchị

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde A, afọ ụbọchị izu II.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike