Bible Explorer

Nyochaa › Ndị Eze na Ihe E Mere nʼakụkụ ibe ha › Sọl na Devid

Ndị Eze na Ihe E Mere nʼakụkụ ibe ha · Sọl na Devid

Nkwa Onyenwe anyị kwere Devid

2Sa 7:1–17 · 1Ih 17:1–15

2 Samuel

2Sa 7:1–17

1O ruo mgbe eze nọsara ahụ nʼụlọeze ya, mgbe Onyenwe anyị mekwara ka o site nʼaka ndị iro ya nọ gburugburu zuru ike,

2ọ sịrị Netan, bụ onye amụma, “Lee, mụ onwe m na-ebi nʼụlọ sida, ma igbe ọgbụgba ndụ Chineke dị nʼime ụlọ ikwu.”

3Netan zaghachiri eze sị, “Ihe ọbụla dị gị nʼobi gaa nʼihu mee ya, nʼihi na Onyenwe anyị nọnyeere gị.”

4Ma nʼabalị ahụ, okwu Onyenwe anyị rutere Netan ntị, na-asị,

5“Gaa gwa ohu m Devid sị ya, ‘Otu a ka Onyenwe anyị kwuru, Ọ bụ gị ga-ewuru m ụlọ ebe m ga-ebi?

6Nʼihi na ebibeghị m nʼụlọ site nʼụbọchị m si nʼIjipt kpọpụta ndị Izrel ruo taa. Kama ana m ejegharị site otu ebe gaa ebe ọzọ, were ụlọ ikwu mere ebe obibi m.

7Nʼebe ọbụla m na-ejegharị nʼetiti ndị Izrel niile, ọ dị mgbe m sịrị onye ọbụla nʼime ndị ọchịchị ha, ndị m nyere iwu ka ha zụọ ndị m Izrel, sị, “Gịnị mere unu ewubereghị m ụlọ sida?” ’

8“Ma ugbu a, gwa Devid bụ ohu m, sị, ‘Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru: Mụ onwe m sitere nʼọhịa ebe ịta nri nke ụmụ anụ ụlọ, sikwa nʼebe ị na-azụ igwe ewu na atụrụ kpọpụta gị. Mee gị onye na-achị ndị m Izrel.

9Anọnyekwara m gị nʼebe ọbụla ị gara, kpochapụ ndị iro gị niile site nʼihu gị. Ugbu a, aga m eme ka aha gị dị ukwuu, dịka aha ndị ikom dịkarịsịrị ukwuu nʼụwa.

10Aga m ahọpụta otu ebe nʼihi ndị m Izrel, kụkwa ha dịka osisi ka ha biri nʼebe obibi nke aka ha; ka ha ghara ị bụkwa ndị a na-esogbu ọzọ. Ndị ajọ mmadụ agaghị emegbukwa ha dịka ha mere na mbụ,

11dịka ha na-emekwa siterị na mgbe m họpụtara ndị ndu nye ndị m Izrel. Aga m enyekwa gị ezumike site nʼebe ndị iro gị niile nọ. “ ‘ Onyenwe anyị na-ekwupụtara gị, na Onyenwe anyị ya onwe ya, ga-eguzobere gị ụlọ.

12Mgbe ụbọchị gị nʼụwa zuru, mgbe i ga-esoro nna nna gị ha dinaa nʼọnwụ, aga m eme ka otu mkpụrụ gị bilie nọchie ọnọdụ gị, onye bụ anụ ahụ na ọbara gị, aga m emekwa ka alaeze ya guzosie ike.

13Ọ bụ ya ga-ewuru m ụlọ. Aga m eme ka ocheeze nke alaeze ya guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi.

14Mụ onwe m ga-abụrụ ya nna. Ya onwe ya ga-abụkwara m nwa. Ọ bụrụ na o jehie, aga m eji mkpanaka mmadụ taa ya ahụhụ. Werekwa ihe otiti si nʼaka ndị mmadụ dụọ ya ọdụ.

15Ma agaghị ewezuga ịhụnanya m site nʼebe ọ nọ, dịka m si wezuga ya site nʼebe Sọl nọ, bụ onye m wezugara site nʼihu gị.

16Ụlọ gị na alaeze gị ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi nʼihu m. A ga-eme ka ocheeze gị bụrụ ihe guzosiri ike ruo mgbe ebighị ebi.’ ”

17Netan ziri Devid ozi dịka okwu niile nke ọhụ ahụ si dị.

1 Ihe E Mere

1Ih 17:1–15

1Mgbe Devid nọsara ahụ nʼụlọeze ya, ọ sịrị Netan onye amụma, “Lee, mụ onwe m na-ebi nʼụlọ sida, ma igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị dị nʼokpuru ụlọ ikwu.”

2Netan zaghachiri Devid, “Ihe ọbụla dị gị nʼobi, mee ya, nʼihi na Chineke nọnyeere gị.”

3Ma nʼabalị ahụ, okwu Chineke rutere Netan ntị, na-asị,

4“Gaa gwa ohu m Devid sị ya, ‘Otu a ka Onyenwe anyị kwuru: Gị onwe gị agaghị ewuru m ụlọ ebe m ga-ebi,

5nʼihi na ebibeghị m nʼụlọ site nʼụbọchị m si nʼIjipt kpọpụta Izrel ruo taa. Kama e sitela m nʼotu ọmụma ụlọ ikwu baa na nke ọzọ, sitekwa nʼotu ebe obibi gaa ebe nke ọzọ.

6Nʼebe ọbụla m na-ejegharị nʼetiti ndị Izrel niile, ọ dị mgbe m sịrị onye ọbụla nʼime ndị ndu ha, ndị m nyere iwu ka ha zụọ ndị m, sị, “Gịnị mere unu ewubereghị m ụlọ sida?” ’

7“Ma ugbu a, gwa Devid bụ ohu m, sị, ‘Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru: Mụ onwe m sitere nʼọhịa ebe ịta nri nke ụmụ anụ ụlọ, sikwa nʼebe ị na-azụ igwe ewu na atụrụ kpọpụta gị, mee gị onye na-achị ndị m Izrel.

8Anọnyekwara m gị nʼebe ọbụla ị gara, kpochapụ ndị iro gị niile site nʼihu gị. Ugbu a, aga m eme ka aha gị dịka aha ndị ikom dịkarịsịrị ukwuu nʼụwa.

9Aga m ahọpụta otu ebe nʼihi ndị m Izrel, kụkwa ha dịka osisi ka ha biri nʼebe obibi nke aka ha, ka ha ghara ị bụkwa ndị a na-esogbu ọzọ. Ndị ajọ mmadụ agaghị emegbukwa ha dịka ha mere na mbụ,

10dịka ha na-emekwa siterị na mgbe m họpụtara ndị ndu nye ndị m Izrel. Aga m eme ka ndị iro gị niile nọrọ nʼokpuru gị. “ ‘Ana m ekwupụtara gị na Onyenwe anyị ga-ewuru gị ụlọ.

11Mgbe ụbọchị gị nʼụwa zuru, mgbe ị gakwuru ndị nna nna gị ha, aga m eme ka otu mkpụrụ gị bilie nọchie ọnọdụ gị, ọ ga-abụ otu nʼime ụmụ ndị ị mụrụ. Aga m emekwa ka alaeze ya guzosie ike.

12Ọ bụ ya onwe ya ga-ewuru m ụlọ, aga m emekwa ka ocheeze ya guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi.

13Mụ onwe m ga-abụrụ ya nna, ya onwe ya ga-abụkwara m nwa. Agaghị m ewezuga ịhụnanya m site nʼebe ọ nọ, dịka m mere onye bu gị ụzọ chịa.

14Aga m eme ka ọ chịa ụlọ m na nʼalaeze m ruo mgbe ebighị ebi. A ga-emekwa ka ocheeze ya bụrụ ihe guzosiri ike ruo mgbe ebighị ebi.’ ”

15Netan ziri Devid ozi dịka okwu niile nke ọhụ ahụ si dị.

Akara: okwu akụkọ ọ bụla nwere, na nsụgharị ị na-agụ. A naghị aka akara nʼokwu ndị a na-ahụkarị (“na”, “ọ”); okwu nʼụdị ọzọ nwere ike ọ gaghị enwe akara.

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · E ji aka họrọ akụkụ yiri ibe ha site nʼederede ma lelee ha megide ntụaka gafere OpenBible.info (CC BY). Naanị otu ihe mere ma ọ bụ otu okwu e kwuru ka a na-etinye nʼakụkụ ibe ha. OpenBible.info · CC BY