Bible Explorer

Nyochaa › Oziọma nʼakụkụ ibe ha › Na Jerusalem

Oziọma nʼakụkụ ibe ha · Na Jerusalem

Amụma banyere mbibi ụlọnsọ ukwu

Mat 24:1–2 · Mak 13:1–2 · Luk 21:5–6

Matiu

Mat 24:1–2

1Mgbe Jisọs si nʼụlọnsọ ahụ na-apụ, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya na-achọ igosi ya akụkụ dị iche iche nke ụlọnsọ ukwu ahụ.

2Ma ọ zara ha sị, “Unu hụrụ ihe ndị a niile? Nʼezie agwa m unu, oge na-abịa mgbe ọ bụladị otu nkume na-agaghị adịgidekwa nʼelu ibe ya, nke a na-agaghị akwatu nʼala.”

Mak

Mak 13:1–2

1Mgbe o sitere nʼụlọnsọ ukwu ahụ na-apụ, otu nʼime ndị na-eso ụzọ ya siri ya, “Onye ozizi, ị hụkwara otu ụlọ a si maa mma. Lee ụdị nkume buru ibu e ji wuo ha.”

2Jisọs zara ha, “Ị hụrụ ụlọ ukwu ndị a? Oge na-abịa mgbe ọ na-adịghị nkume ga-atụkwasị nʼelu ibe ya, nʼihi na a ga-ala ha niile nʼiyi.”

Luk

Luk 21:5–6

5Mgbe ụfọdụ na-ekwu okwu banyere otu e si were nkume mara mma na onyinye e chere nʼihu Chineke, chọọ ụlọnsọ ukwu ahụ mma, ọ sịrị,

6“Ma banyere ihe ndị a, oge na-abịa mgbe ihe ndị a niile unu na-ahụ na-agaghị adịkwa. Ọ dịghị otu nkume a ga-ahapụ nʼelu ibe ya, a ga-akwatusị ha niile.”

Akara: okwu akụkọ ọ bụla nwere, na nsụgharị ị na-agụ. A naghị aka akara nʼokwu ndị a na-ahụkarị (“na”, “ọ”); okwu nʼụdị ọzọ nwere ike ọ gaghị enwe akara.

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · E ji aka họrọ akụkụ yiri ibe ha site nʼederede ma lelee ha megide ntụaka gafere OpenBible.info (CC BY). Naanị otu ihe mere ma ọ bụ otu okwu e kwuru ka a na-etinye nʼakụkụ ibe ha. OpenBible.info · CC BY