Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Disemba 2027 › 14 Disemba
Kalenda Ọtọdọks · 1 Disemba (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 14 Disemba 2027
Tiuzdee · Izu nke 26 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 8
Mmemme na ndị nsọ
Prophet Naum (7th C BC)
Obubu ọnụ Ọmụmụ
Obubu ọnụ: ya na mmanụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
8Ma anyị maara na iwu dị mma, ma ọ bụrụ na onye ọbụla ewere ya mee ihe a chọrọ ka e jiri ya mee. 9Ma emeghị iwu nʼihi ndị ezi omume. Kama, e mere iwu nʼihi ndị ahụ na-emebi iwu na ndị na-enupu isi, ndị kpọrọ Chineke asị na ndị mmehie, ndị rụrụ arụ, ndị na-egbu nna ha na nne ha, na ndị na-egbu mmadụ ibe ha, 10na ndị na-akwa iko na ndị ikom na-emerụ onwe ha nʼahụ ndị ikom ibe ha, ndị na-azụ ahịa ndị ohu, na ndị ụgha niile, na ndị na-agba ama ụgha, tinyere ihe ndị ahụ niile megidere ezi ozizi ahụ, 11nke dabara nʼoziọma ahụ dị ebube, nke Chineke dị ngọzị, nke o nyefere m nʼaka na ntụkwasị obi ichebe. 12Ana m ekele Kraịst Jisọs Onyenwe anyị ekele, onye na-enye m ike, nʼihi na ọ gụrụ m dị ka onye e kwesiri ịtụkwasị obi mgbe ọ họpụtara m ijere ya ozi. 13Ọ bụ ezie na nʼoge gara aga, abụ m onye na-ekwujọ Chineke na onye na-akpagbu ndị ya, bụrụkwa onye na-emegide emegide. Ma Chineke meere m ebere nʼihi na m mere ihe ndị ahụ nʼọnọdụ amaghị ihe, na enweghị okwukwe. 14Ma Onyenwe anyị wụkwasịrị m amara ya, nke babigara ụba oke, ya na okwukwe na ịhụnanya nʼime Kraịst Jisọs.
Oziọma
45Mgbe ahụ, ọ banyere nʼime ụlọnsọ ukwu bido ịchụpụ ndị nọ ebe ahụ na-ere ahịa. 46Ọ sị ha, “E dere ya nʼakwụkwọ nsọ ‘na a ga-akpọ ụlọ m ụlọ ekpere’; ma unu emeela ya ‘ọgba ndị na-apụnara mmadụ ihe nʼike.’ ” 47Ụbọchị niile, ọ na-anọ na-akụzi ihe nʼụlọnsọ ukwu ahụ. Ma ndịisi nchụaja na ndị ozizi iwu na ndị ndu nʼetiti ndị mmadụ, nọ na-achọ ụzọ ha ga-esi gbuo ya. 48Ma ha achọtaghị ụzọ ọbụla ime ya, nʼihi na mmadụ niile sogidere ya kwenyekwara nʼokwu ya.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 1 Disemba na kalenda nzukọ bụ 14 Disemba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike