Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Disemba 2027 › 8 Disemba
Kalenda Ọtọdọks · 25 Novemba (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 8 Disemba 2027
Wenezdee · Izu nke 25 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 7
Mmemme na ndị nsọ
Apodosis of the Entry of the Theotokos
Obubu ọnụ Ọmụmụ
Obubu ọnụ: nri esiri esi na-enweghị mmanụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
1Ma ihe banyere ọbịbịa Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, na nzukọ anyị na ya ga-ezukọta, anyị na-adụsị unu ọdụ ike ụmụnna. 2Ka unu ghara ịma jijiji maọbụ ịtụ egwu nʼuche unu nʼihi amụma, maọbụ okwu maọbụ akwụkwọ ozi e dere dị ka o sitere nʼaka anyị, nke na-asị nʼụbọchị Onyenwe anyị eruola. 3Unu ekwela ka onye ọbụla duhie unu nʼụzọ ọbụla, nʼihi na ụbọchị ahụ agaghị abịa tutu ruo mgbe oke inupu isi ga-adị, na mgbe a ga-ekpughe onye mmebi iwu ahụ nke a kara akara ịla nʼiyi. 4Onye mmebi iwu ahụ ga-ebuli onwe ya elu megide ihe niile a na-akpọ chi maọbụ nke a na-efe ofufe, nke ga-eme ka o dozie onwe ya nʼụlọnsọ Chineke, na-ekwupụta na ya bụ Chineke. 5Unu echetaghị ihe m gwara unu nʼoge mụ na unu nọ banyere ya? 6Ma ugbu a, unu maara na o nwere onye na-egbochi ya ka ọ hapụ ịpụta ihe. Nʼihi na mgbe ọ ga-apụta bụ mgbe oge ya ruru. 7Ma ọrụ nzuzo nke mmebi iwu ebidolarị ugbu a, ma onye ahụ na-egbochi ya ịbabiga ụba oke ga-anọgide na-eme otu a tutu ruo mgbe oge e wezugara ya. 8Mgbe ahụ, a ga-eme ka onye mmebi iwu ahụ pụta ìhè, bụ onye Onyenwe anyị Jisọs ga-eji ume ọ ga-esi nʼọnụ ya kupụta laa nʼiyi, ma mee ka ọ ghara ịdịkwa ọzọ site nʼọbịbịa ya. 9Ọbịbịa onye mmebi iwu ahụ ga-abụ dị ka ọrụ ekwensu si dị, site nʼike ịrụ ọrụ ebube aghụghọ na ihe ịrịbama dị iche iche, na ọrụ ịtụnanya aghụghọ dị iche iche nke ụgha. 10Ya na ụdị ọrụ ọjọọ dị iche iche nke ọ ga-eji duhie ndị ahụ na-ala nʼiyi. Ha ga-ala nʼiyi nʼihi na ha jụrụ ịhụ eziokwu nʼanya ma nwee nzọpụta. 11Nʼihi nke a, Chineke ga-ahapụ ha ka e duhie ha, ka ha jiri obi ha niile nabata okwu ụgha ndị a. 12Ihe nke a pụtara bụ na ndị niile na-ekweghị nʼeziokwu ahụ ma nwee mmasị nʼajọ omume ka a ga-ama ikpe.
Akwụkwọ ozi (maka Nne Chineke)
1Ọgbụgba ndụ nke mbụ nwere usoro ofufe na ebe nsọ nke ụwa nke a e jiri aka wuo. 2E guzobere ụlọ ikwu. Nʼọnụụlọ nke mbụ nʼụlọ ikwu ahụ, e nwere ihe ịdọba iheọkụ, na tebul, na achịcha e doro nsọ. Aha ọnụụlọ nke mbụ a bụ Ebe Nsọ. 3Nʼazụ akwa mgbochi nke abụọ ka e nwere ọnụụlọ a na-akpọ Ebe Kachasị Nsọ, 4nke nwere ebe ịchụ aja mgbaisiọma e ji ọlaedo wuo, na igbe ọgbụgba ndụ ahụ nke e jiri ọlaedo machie ahụ ya niile. Ihe dị nʼime ite ahụ bụ mánà na mkpanaka Erọn nke ahụ puputara ahịhịa, ya na mbadamba nkume e dekwasịrị iwu ọgbụgba ndụ. 5Ihe dị nʼelu igbe a bụ cherubim nke ebube ya, na-ekpuchite oche amara ahụ. Ma anyị enweghị ike ịkọwacha ihe niile ndị a nʼozuzu oke ugbu a. 6Mgbe e doro ihe niile ndị a nʼusoro, onye nchụaja na-abata mgbe ọbụla nʼime ọnụụlọ nke mbụ nke ụlọ ikwu a. Nʼebe a ka ọ na-arụ ọrụ o ketara ịrụ. 7Ma ọ bụ naanị onyeisi nchụaja na-abanye nʼime ọnụụlọ nsọ nke abụọ, naanị otu ugboro nʼafọ. Ọ na-ejikwa ọbara na-aba nʼebe ahụ, iji chụọ aja maka onwe ya na nʼihi mmehie ndị mmadụ mere na-amaghị ama.
Oziọma
15Ndị mmadụ na-ekutere ya ụmụntakịrị ka o bikwasị ha aka. Mgbe ndị na-eso ụzọ ya hụrụ nke a, ha baara ha mba. 16Ma Jisọs kpọrọ ha ka ha bịakwute ya, sị, “Kweenụ ka ha bịakwute m, unu egbochikwala ha, nʼihi na alaeze Chineke bụ nke ndị dị ka ha. 17Nʼezie, agwa m unu, onye ọbụla na-agaghị anara alaeze Chineke dị ka nwantakịrị agaghị aba nʼime ya.” 26Ndị nụrụ ya sịrị, “Onye kwanụ ka a ga-azọpụta?” 27Ọ sịrị, “Ihe mmadụ na-apụghị ime, bụ ihe Chineke pụrụ ime.” 28Mgbe ahụ Pita sịrị, “Lee, anyị ahapụla ihe niile anyị nwere soro gị!” 29Ọ sịrị ha, “Nʼezie, agwa m unu, o nweghị onye ọbụla hapụrụ ụlọ ya, maọbụ nwunye, maọbụ ụmụnne, maọbụ ndị mụrụ ya, maọbụ ụmụntakịrị ya, nʼihi alaeze Chineke 30nke na-agaghị anata ihe ndị a nʼọgbọ a, nwekwa ndụ ebighị ebi nʼọgbọ nke na-abịa.”
Oziọma (maka Nne Chineke)
38Mgbe ha na-aga nʼụzọ, ọ banyere nʼotu obodo nta ebe nwanyị a na-akpọ Mata nabatara ya nʼụlọ ya. 39O nwere nwanne nwanyị a na-akpọ Meri nke nọdụrụ ala nʼụkwụ Onyenwe anyị na-ege ntị nʼihe ọ na-ekwu. 40Ma uche Mata gbasasịrị agbasa ebe ọ na-akwado maka ile ọbịa. Ọ bịakwutere ya sị ya, “Onyenwe anyị, ọ bụ na o metụghị gị nʼobi na nwanne m nwanyị hapụrụ naanị m ije ozi niile? Gwa ya ka ọ bịa nyere m aka.” 41Ma Onyenwe anyị zara ya sị, “Mata, Mata, ị na-echegbu onwe gị ma na-adọgbukwa onwe gị banyere ọtụtụ ihe, 42maọbụ naanị otu ihe dị mkpa, Meri ahọrọla nke ka mma, nke a na-agaghị anapụkwa ya.” 11:27Mgbe ọ kpụ okwu a nʼọnụ, otu nwanyị sitere nʼime igwe mmadụ ahụ tie mkpu sị, “Ngọzị na-adịrị afọ mụrụ gị na ara nke e jiri zụọ gị.” 28Ma ọ sịrị, kama, “Ngọzị na-adịrị ndị na-anụ okwu Chineke, na-emekwa ha.”
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 25 Novemba na kalenda nzukọ bụ 8 Disemba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike