Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Novemba 2027 › 30 Novemba

Kalenda Ọtọdọks · 17 Novemba (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 30 Novemba 2027

Tiuzdee · Izu nke 24 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 6

Mmemme na ndị nsọ

Saint Gregory the Wonderworker, Bishop of Neo-Cæsarea († c. 266-270)

Obubu ọnụ Ọmụmụ

Obubu ọnụ: ya na mmanụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Akwụkwọ ozi

1Te 3:9–13

9Olee ụdị ekele anyị pụrụ ikele Chineke nʼihi akụkọ nyere anyị ọṅụ nʼihu Chineke anyị nʼihi unu. 10Ehihie na abalị niile, anyị na-arịọ ka anyị hụ unu ihu na ihu, ka anyị nwee ike tinyezuo ihe fọdụrụ nʼokwukwe unu. 11Ugbu a, ka Chineke Nna anyị na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst megheere anyị ụzọ ịbịakwute unu. 12Ka Onyenwe anyị meekwa ka unu baa ụba, ka unu babiga ụba oke nʼịhụnanya unu nwere nye ibe unu, na ndị ọzọkwa, dị ka ịhụnanya anyị si dị ukwuu nʼebe unu nọ. 13Ka ọ mee ka obi unu guzosie ike nʼịdị nsọ, na-enweghị ịta ụta ọbụla, nʼihu Chineke na Nna anyị, nʼọbịbịa nke Onyenwe anyị Jisọs ya na ndị nsọ ya niile.

Akwụkwọ ozi (maka Onye nsọ Gregori Onye ọrụ ebube)

1Kọ 12:7–11

7Ọ na-enyekwa onye ọbụla amara izipụta ike nke Mmụọ Nsọ maka ọdịmma mmadụ niile. 8Mmụọ Nsọ na-enye otu onye onyinye ikwu okwu amamihe, na-enyekwa onye ọzọ onyinye ịma ihe ọmụma, site nʼotu Mmụọ ahụ. 9Otu Mmụọ nsọ a na-enye onye ọzọ onyinye inwe okwukwe, na-enyekwa onye ọzọ onyinye inwe ike ịgwọ ọrịa. 10Onye ọzọ ka ọ na-enye onyinye ịrụ ọrụ ịtụnanya, onye ọzọ ike ibu amụma. Onye ọzọ ka ọ na-enye ike ịkọwa ụdị mmụọ dị iche iche, ma onye ọzọkwa ka ọ na-enye ike ịsụ asụsụ dị iche iche. Ma ọ na-enyekwa onye ọzọ ike ịkọwa ihe onye na-asụ asụsụ ndị a na-ekwu. 11Ọ bụ otu Mmụọ ahụ na-enye onyinye ndị a niile. Ọ na-enye onye ọbụla onyinye dị iche iche dịka Mmụọ Nsọ si kpebie.

Oziọma

Luk 14:25–35

25Ugbu a, oke igwe mmadụ na-eso ya ma ọ tụgharịrị sị ha: 26“Onye ọbụla chọrọ iso m, ma o bụghị ụzọ kpọ nne na nna ya, na nwunye ya, na ụmụ ya, na ụmụnne ya ndị nwoke na ndị nwanyị tinyekwara ndụ nke ya onwe ya asị, apụghị ịbụ onye na-eso ụzọ m. 27Onye ọbụla na-eburughị obe ya soro m, enweghị ike ịbụ onye na-eso ụzọ m. 28“Ọ dị onye ọbụla nʼime unu chọrọ iwu ụlọ elu, na-agaghị ebu ụzọ nọdụ ala, gbakọọ ihe ọ ga-efu ya, iji chọpụta ma o nwekwara ego ga-ezu iwucha ya? 29Nʼihi na ọ bụrụ na ọ tọọ ntọala ma o nwekwaghị ike wuchaa ya, onye ọbụla hụrụ ya ga-achị ya ọchị, 30na-asị, ‘Nwoke a malitere iwu ụlọ, ma o nweghị ike wuchaa ya.’ 31“Maọbụ olee eze chọrọ ịlụso eze ibe ya ọgụ, ọ gaghị ebu ụzọ nọdụ ala tulee ma puku ndị agha iri ya ọ ga-ezuru ya iji lụso onye ji iri puku ndị agha abụọ abịakwute ya ọgụ? 32Ọ bụrụ na o nweghị ike, ọ ga-ezipụ ozi rịọ ka e kpee udo mgbe onye nke ọzọ ka nọ nʼebe dị anya. 33Nʼụzọ dị otu a, onye ọbụla na-ajụghị ihe niile o nwere, apụghị ịbụ onye na-eso ụzọ m. 34“Nnu dị mma, ma ọ bụrụ na ọ dịghị atọkwa ụtọ, a ga-eji gịnị mee ka ọ tọọ ụtọ ọzọ? 35Ọ bakwaghị uru nye ala maọbụ iji mee nri ala. Kama ọ bụ itufu ya. “Onye ọbụla nwere ntị ịnụ ihe, ya nụrụ.”

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 17 Novemba na kalenda nzukọ bụ 30 Novemba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike