Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Novemba 2027 › 30 Novemba
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 30 Novemba 2027
Tiuzdee · Izu nke 1 nke Advent
Mmemme na ndị nsọ
Onye nsọ Andru, Onyeozi
Mmemme · Agba ofufe: uhie
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
9Ma ọ bụrụ na ị ga-eji ọnụ gị kwupụta, na “Jisọs bụ Onyenwe anyị,” kwerekwa nʼime obi gị na Chineke kpọlitere ya site nʼọnwụ, a ga-azọpụta gị. 10Nʼihi na ọ bụ obi gị ka ị ga-eji kwere; a gụọ gị nʼonye ezi omume, ọ bụkwa ọnụ gị ka ị ga-eji kwupụta, a zọpụta gị. 11Dịka akwụkwọ nsọ kwuru, “Onye ọbụla kweere na ya, agaghị eme ka ihere mee ya.” 12Nʼihi na o nweghị ihe dị iche nʼetiti onye Juu na onye mba ọzọ, otu Onyenwe anyị ahụ bụ Onye nwe mmadụ niile, ọ na-agọzibigakwa ndị na-akpọku ya oke. 13Nʼihi na, “Onye ọbụla nke na-akpọku aha Onyenwe anyị, ka a ga-azọpụta.” 14Ma olee otu ha ga-esi kpọkuo aha ya ma ọ bụrụ na ha ekwereghị na ya? Olee otu ha ga-esikwa kwere nʼonye ahụ ha anụbeghị ihe gbasara ya? Olee otu ha ga-esi nụkwa ma ọ bụrụ na ndị nkwusa adịghị? 15Oleekwanụ otu ha ga-esi pụọ gaa kwusaa, ma ọ bụrụ na o nweghị ndị zipụrụ ha? Dịka e dere ya nʼakwụkwọ nsọ, sị, “Lee, ka ha si maa mma bụ ụkwụ ndị na-eweta oziọma.” 16Ma ọ bụghị mmadụ niile nabatara oziọma ahụ. Nʼihi na Aịzaya kwuru, “Onyenwe anyị, onye kweere ozi anyị?” 17Ma ọ bụ ihe doro anya na ọ bụ site nʼige ntị nʼoziọma a ka mmadụ ji enweta okwukwe, oziọma ahụ a na-anụ bụ site nʼokwu Kraịst. 18Ma ana m ajụ, Ọ ga-abụ na ha anụghị? Ha nụrụ ya nʼezie. “Nʼụwa niile ka olu ha pụrụ gazuo, okwu ọnụ ha niile erukwaala nʼebe ụwa sọtụrụ.”
Abụ Ọma nzaghachi
1Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ ọma Devid. Eluigwe na-ezipụta ebube Chineke; mbara eluigwe na-egosikwa ọrụ aka ya. 2Ụbọchị niile, ha na-ekwupụta okwu, ehihie na abalị, ha na-egosipụta ihe ọmụma. 3Ha nweghị asụsụ, ha nweghị okwu, ma a na-anụ ụda ha. 4Nʼụwa niile ka olu ha na-apụ gazuo, okwu ọnụ ha niile erukwaala nʼebe ụwa sọtụrụ. Ọ bụ na mbara eluigwe ka Chineke maara ụlọ ikwu nye anyanwụ.
Oziọma
18Ma mgbe Jisọs na-agafe nʼakụkụ osimiri Galili, ọ hụrụ ụmụnne abụọ, Saimọn onye a na-akpọ Pita, na Andru nwanne ya, ndị ọrụ ha bụ ịkụ azụ, ebe ha nọ nʼụgbọ mmiri na-akụ azụ. 19Ọ sịrị ha, “Bịanụ soro m. Aga m eme unu ndị ọkụ na-akụta mmadụ.” 20Ha hapụrụ ụgbụ azụ ha otu mgbe ahụ soro ya. 21Mgbe ọ gara nʼihu nke nta, ọ hụrụ ụmụnne abụọ ọzọ, Jemis nwa Zebedi na Jọn nwanne ya, ebe ha na nna ha Zebedi nọ nʼime ụgbọ mmiri na-ekezi ụgbụ azụ ha. Ọ kpọkwara ha, 22ngwangwa ha hapụrụ ụgbọ ha na nna ha soro ya.
Ndị nsọ nke ụbọchị
- Onye nsọ Andru, Onyeozi
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde C, afọ ụbọchị izu II.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike