Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Novemba 2027 › 24 Novemba

Kalenda Ọtọdọks · 11 Novemba (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 24 Novemba 2027

Wenezdee · Izu nke 23 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 5

Mmemme na ndị nsọ

Great Martyr Menas of Egypt († 304)

Ụbọchị obubu ọnụ

Obubu ọnụ: ya na mmanụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Akwụkwọ ozi

1Te 2:1–8

1Unu onwe unu maara, ụmụnna, na ọbịbịa anyị bịakwutere unu abụghị ihe lara nʼiyi. 2Anyị tara ahụhụ na mbụ e mekwara anyị ihe ihere na Filipai dịka unu maara, ma site nʼinyeaka Chineke anyị nwere obi ike ịgwa unu oziọma ya, ọ bụladị mgbe a na-eguzogide anyị nʼebe ọ dị ukwuu. 3Nʼihi na arịrịọ anyị na-arịọ unu esiteghị na njehie pụta maọbụ nʼọchịchọ nke na-adịghị ọcha ma ọ bụkwanụ nʼaghụghọ. 4Nʼaka nke ọzọ, anyị na-ekwu okwu dị ka ndị ozi Chineke nwapụtara, ndị o tinyere ọrụ oziọma a nʼaka na ntụkwasị obi idebe. Anyị adịghị agbalị ime ihe ga-atọ mmadụ ụtọ, kama anyị chọrọ ime ihe ga-atọ Chineke ụtọ, bụ onye na-enyocha echiche obi anyị. 5Ọ dịghị mgbe ọbụla, dị ka unu maara, anyị kwuru okwu nrafu maọbụ were ụzọ aghụghọ zoo anya ukwu anyị nwere. Chineke bụ onye akaebe anyị. 6Ọ dịghị mgbe anyị chọrọ ka ndị mmadụ ọbụla maọbụ unu, maọbụ ndị ọzọ, too anyị. 7Ọ bụ ezie, dị ka ndị ozi Kraịst, anyị gara abụ ibu arụ nye unu. Kama, anyị biri nʼetiti unu site nʼịdị nwayọọ dị ka ndị bụ nne na-azụ ụmụntakịrị ha, na-elekọta ha. 8Nʼihi na anyị hụrụ unu nʼanya nke ukwuu ruo na ọ bụghị naanị na anyị kwusaara unu oziọma Chineke kama anyị nyekwara unu ndụ anyị. Nʼihi na unu dị anyị nʼobi nke ukwu.

Oziọma

Luk 12:48–59

48Ma onye na-amaghị ama ma mee ihe kwesiri ka a pịa ya ụtarị, a ga-apịa ya ụtarị ole na ole. Nʼihi na ọ bụ onye e nyere ihe hiri nne ka a ga-ele anya ịnata ihe hiri nne nʼaka. Onye e nyekwara ihe ukwu nʼaka idebe, nʼaka ya ka a ga-achọ ihe nke kachasịnụ. 49“A bịara m iwebata ọkụ nʼelu ụwa, ọ gaara adịrị m nọ mma ma ọ bụrụ na ọ malitelarị inwu! 50Enwere m baptizim nke m na-aghaghị ime, ma aga m anọgide nʼoke ihe mgbu tutu e mezuo ya 51Unu chere na m bịara iweta udo nʼụwa? Asị m unu mbaa, kama nkewa. 52Site ugbu a gawa, mmadụ ise si nʼotu ezinaụlọ ga-ekewa megide onwe ha, atọ megide abụọ, abụọ megide atọ. 53Ha ga-ekewa; nna megide nwa ya nwoke, nwa nwoke ga-emegidekwa nna ya, nne megide nwa ya nwanyị, nwa nwanyị megidekwa nne ya, nne di megide nwunye nwa ya, nwunye nwa megide nne di ya.” 54Ọ gwakwara igwe mmadụ ahụ sị, “Mgbe unu hụrụ urukpu ojii ka ọ na-ebili nʼọdịda anyanwụ, unu na-eme ngwangwa sị, ‘Mmiri ga-ezo,’ ọ na-ezokwa. 55Mgbe unu hụrụ na ifufe na-esite na ndịda na-efe, unu na-asị, Oke okpomọkụ ga-adị, ọ na-emekwa otu ahụ. 56Ndị ihu abụọ! Unu matara ịkọwa ihu ala na mbara eluigwe. Gịnị mere unu apụghị ịkọwa oge dị ugbu a? 57“Gịnị mere unu adịghị ekpebiri onwe unu ihe ziri ezi? 58Ọ bụrụ na gị na onye na-ebo gị ebubo esoro na-aga nʼihu ọkaikpe, gbalịsie ike ka gị na ya kpezie nʼụzọ, ma ọ bụghị otu a, ọ ga-akpọpụ gị nʼihu onye ọkaikpe, ma eleghị anya ọkaikpe ahụ ga-arara gị nye nʼaka ọkaikpe ukwu, ọkaikpe ukwu ga-ararakwa gị nye nʼaka onye na-eje ozi nʼụlọikpe, bụ onye ga-etinye gị nʼụlọ mkpọrọ. 59Asị m gị, ị gaghị e si nʼebe ahụ pụta ruo mgbe ị kwụghachiri ọ bụladị otu kobo nke ikpeazụ.”

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 11 Novemba na kalenda nzukọ bụ 24 Novemba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike