Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Novemba 2027 › 23 Novemba

Kalenda Ọtọdọks · 10 Novemba (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 23 Novemba 2027

Tiuzdee · Izu nke 23 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 5

Mmemme na ndị nsọ

Apostles of the 70: Herastos, Olympos, Rodion, Sosipater, Quartus and Tercias (1st C)

Obubu ọnụ

Ọ dịghị obubu ọnụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Akwụkwọ ozi

1Te 1:6–10

6Nke a mere unu ji bụrụ ndị na-eṅomi anyị na Onyenwe anyị. Nʼihi na unu jiri ọṅụ nke Mmụọ Nsọ na-enye nabata oziọma ahụ, nʼagbanyeghị ọtụtụ ahụhụ dị ukwuu nke o wetaara unu. 7Nʼụzọ dị otu a, unu ghọrọ ihe ilere anya nye ndị niile kwere ekwe nọ na Masidonia na Akaịa. 8Ugbu a, e sitela na ndụ unu mee ka oziọma Onyenwe anyị gbasaa gabiga Masidonia na Akaịa. Nʼihi na a na-anụ ihe banyere okwukwe unu nwere na Chineke nʼebe niile. Ya mere, ọ dịkwaghị mkpa ka anyị kwuo ihe banyere ya. 9Nʼihi na ha onwe ha na-ebu ụzọ gwa anyị ihe banyere nnabata unu nabatara anyị, na otu unu si site nʼikpere arụsị tụgharịa, bido ife Chineke dị ndụ, onye bụkwa ezi Chineke, 10na i chere Ọkpara ya onye ga-esi nʼeluigwe, onye o sitere na ndị nwụrụ anwụ kulite, Jisọs, onye na-anapụta anyị nʼiwe nke na-abịa.

Oziọma

Luk 12:42–48

42Ma Onyenwe anyị sịrị, “Onye bụ ohu ahụ nke kwesiri ntụkwasị obi ma nwekwa uche, nke onyenwe ya mere onyeisi ụmụodibo ya niile, ka ọ na-enye ha nri mgbe o kwesiri? 43Ngọzị na-adịrị ohu ahụ nke onyenwe ya ga-ahụ ka ọ na-arụ ọrụ ahụ mgbe ọ ga-alọghachi. 44Nʼezie asị m unu, ọ ga-eme onye nke ahụ onyeisi nke ihe niile o nwere. 45Ma ọ bụrụ na ohu ahụ asị nʼobi ya, ‘Onyenwe m na-anọ ọdụ ịlọta,’ ọ bụrụkwa na ọ malite itigbu ụmụodibo ndị ọzọ, bụ ndị ikom na ndị inyom na-eje ozi, na iri ihe oriri, na ịṅụkwa ihe ọṅụṅụ na ịṅụbiga mmanya oke. 46Nna ukwu ohu ahụ ga-alọta nʼụbọchị ọ na-atụghị anya, nʼoge awa ọ na-amakwaghị. Ọ ga-egburisikwa ya, nye ya ọnọdụ nʼetiti ndị na-ekweghị ekwe. 47“Ohu ahụ maara ihe nna ya ukwu chọrọ ma hapụ ịnọ na njikere, maọbụ ime ya, ka a ga-apịasi ụtarị ike. 48Ma onye na-amaghị ama ma mee ihe kwesiri ka a pịa ya ụtarị, a ga-apịa ya ụtarị ole na ole. Nʼihi na ọ bụ onye e nyere ihe hiri nne ka a ga-ele anya ịnata ihe hiri nne nʼaka. Onye e nyekwara ihe ukwu nʼaka idebe, nʼaka ya ka a ga-achọ ihe nke kachasịnụ.

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 10 Novemba na kalenda nzukọ bụ 23 Novemba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike