Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Novemba 2027 › 23 Novemba
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 23 Novemba 2027
Tiuzdee · Izu nke 34 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Tiuzdee nke izu nke 34 nke Oge Nkịtị
Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ
Onye nsọ Klement nke Mbụ, Pope na Onye nwụrụ nʼihi okwukwe · Ncheta a na-ahọrọ
Onye nsọ Kọlumban, Onyeisi ndị mọnk · Ncheta a na-ahọrọ
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
31“Eze, ihe ị hụrụ nʼọhụ bụ nke a. Ị hụrụ mmadụ a kpụrụ akpụ. Mmadụ a a kpụrụ akpụ buru nnọọ ibu. Ọ na-egbukwa nweghenweghe, bụrụkwa ihe na-eyi onye ọbụla lekwasịrị ya anya egwu. 32E ji ọlaedo a nụchara anụcha kpụọ isi mmadụ ahụ, jiri ọlaọcha kpụọ aka ya na obi ya. E jikwa bronz kpụọ afọ ya na apata ụkwụ ya. 33Ọ bụkwa igwe ka e ji kpụọ ogwe ụkwụ ya abụọ. Ma akụkụ ụkwụ ya, nke a na-azọ nʼala ka e ji igwe a gwara ya na ụrọ kpụọ. 34Mgbe ị na-ele anya, a wapụtara nkume, ma ọ bụghị aka mmadụ ka e ji wapụta ya. Nkume a kụrụ mmadụ ahụ a kpụrụ akpụ nʼukwu nkume na ụrọ ya, kụpịasịa ha. 35Mgbe ahụ, e tijisịrị igwe ahụ na ụrọ ahụ, bronz ahụ na ọlaọcha ahụ nakwa ọlaedo ahụ niile. Ha dịka igbugbo ọka nke na-adị nʼebe a na-azọcha ọka nʼoge okpomọkụ. Ifufe fechapụsịrị ha na-ahapụghị ihe ngosi ọbụla. Ma nkume ahụ dakwasịrị ihe ahụ awuru awu mechara ghọọ ugwu dị ukwuu, nke jupụtara ụwa niile. 36“Eze, nke a bụ nrọ ahụ. Ugbu a ka anyị kọwaara gị ihe nrọ ahụ pụtara. 37Gị onwe gị, eze, bụ eze nke ọtụtụ ndị eze ọzọ nọ nʼokpuru ya, onye Chineke nke eluigwe nyere ike ọchịchị, nʼocheeze niile, na ike na otuto; 38nyefeekwa nʼaka gị ụmụ mmadụ niile na ụmụ anụmanụ bi nʼime ọhịa, na ụmụ nnụnụ nke igwe, e mere ka ị bụrụ eze ihe niile ndị a, gị bụ isi ahụ e ji ọlaedo kpụọ. 39“Mgbe ị chịchara alaeze ọzọ ga-ebili, ma ọ gaghị adị ukwuu dịka nke gị, mgbe nke a gasịrị, alaeze ọzọ bụ nke atọ, nke ga-adị ka bronz ga-ebilikwa, ọ ga-achị ụwa niile. 40A ga-enwekwa alaeze nke anọ, nke ga-esi ike dịka igwe. Dịka igwe nke na-akụri ihe niile, ọ ga-egwepịa ma kụrikwaa ndị a niile. 41Ma ebe ị hụrụ na ọbụ ụkwụ ahụ na mkpịsịụkwụ ya niile na ụfọdụ nʼime ha bụ ụrọ ọkpụ ite na ụfọdụ bụkwa igwe, alaeze nke ekewara ekewa ka ọ ga-abụ, ma ọ ga-esitụ ike dịka igwe nke dị nʼime ya, nʼihi na ị hụrụ igwe ahụ na agwakọtara ya na ụrọ apịtị. 42Dịka mkpịsịụkwụ ya, nke ụfọdụ nʼime ya bụ igwe, ụfọdụ bụkwa ụrọ, na-egosi na akụkụ ụfọdụ nke alaeze ahụ ga-esi ike ma akụkụ ụfọdụ agaghị esi ike ntiwa. 43Dịka otu ahụ ị hụrụ e siri gwakọta igwe na ụrọ ọnụ, otu a ka ọchịchị alaeze ndị a ga-achọ njikọta alaeze na ibe ya, ma nke a agaghị ekwe mee, dịka ọ gaghị ekwe omume bụ ịgwakọta igwe na ụrọ. 44“Nʼoge ahụ, ndị eze ndị a ga-anọ nʼọchịchị, Chineke nke eluigwe ga-eme ka alaeze ọzọ bido. Ọ bụkwa alaeze nke a na-apụghị imebi emebi. O nwekwaghị onye ọbụla pụrụ imeri alaeze ahụ. Ọ ga-ala alaeze ndị ọzọ nʼiyi, mee ka ha bụrụ ihe efu, ma ọ ga-adịrị na-aga nʼihu ruo ebighị ebi. 45Dịka i siri hụ nkume ahụ dị ukwuu e sitere nʼugwu wapụta, nke a na-ejighị aka wapụta were kụrichaa igwe ahụ, bronz ahụ, ụrọ ahụ, ọlaọcha ahụ na ọlaedo ahụ. “Chineke dị ukwuu emeela ka eze mara ihe na-aga ime nʼoge dị nʼihu. Nrọ a bụ eziokwu, nkọwa ya kwesikwara ntụkwasị obi.”
Abụ Ọma nzaghachi
Ọ dịghị na nsụgharị a
Oziọma
5Mgbe ụfọdụ na-ekwu okwu banyere otu e si were nkume mara mma na onyinye e chere nʼihu Chineke, chọọ ụlọnsọ ukwu ahụ mma, ọ sịrị, 6“Ma banyere ihe ndị a, oge na-abịa mgbe ihe ndị a niile unu na-ahụ na-agaghị adịkwa. Ọ dịghị otu nkume a ga-ahapụ nʼelu ibe ya, a ga-akwatusị ha niile.” 7Ha jụrụ ya sị, “Onye ozizi, olee mgbe ihe ndị a ga-emezu? Gịnị ga-abụkwa ihe ịrịbama ga-egosi na ha na-aga imezu?” 8Ọ sịrị, “Lezienụ anya ka a ghara iduhie unu nʼihi na ọtụtụ ga-abịa nʼaha m sị, ‘Abụ m ya,’ na-asịkwa na ‘Oge ahụ dị nso.’ Unu esokwala ha. 9Mgbe ọbụla unu nụrụ akụkọ agha dị iche iche na ọgbaaghara, ka ụjọ ghara ịtụ unu, ihe ndị a aghaghị ibu ụzọ mezuo, ma ọgwụgwụ oge erubeghị.” 10Mgbe ahụ, ọ sịrị ha, “Mba ga-ebili megide mba, alaeze ga-ebilikwa megide alaeze. 11A ga-enwe ala ọma jijiji dị ukwuu. Ụnwụ na ọrịa ọjọọ dị iche iche ga-adịkwa nʼebe dị iche iche. A ga-ahụ ihe dị egwu na ihe ịrịbama dị ukwuu site na mbara eluigwe.
Ndị nsọ nke ụbọchị
- Onye nsọ Klement nke Mbụ, Pope na Onye nwụrụ nʼihi okwukwe
- Onye nsọ Kọlumban, Onyeisi ndị mọnk
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike