Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọktoba 2027 › 27 Ọktoba

Kalenda Ọtọdọks · 14 Ọktoba (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 27 Ọktoba 2027

Wenezdee · Izu nke 19 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 1

Mmemme na ndị nsọ

Martyrs Nazarius, Gervasius, Protasius and Celsius of Milan (1st C)

Ụbọchị obubu ọnụ

Obubu ọnụ: ya na mmanụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Akwụkwọ ozi

Fil 1:12–20

12Ugbu a ụmụnna m, nke a bụ ihe m chọrọ ime ka unu ghọta, na nsogbu niile dakwasịrị m emeela ka ọrụ ikwusa oziọma na-aga nʼihu. 13Nʼihi na ọ pụtala ihe nye ndị nche nke ụlọeze ahụ na onye ọbụla ọzọ, na ọ bụ naanị nʼihi na m bụ onye na-eso Kraịst ka e ji tụọ m mkpọrọ. 14Site na mkpọrọ a a tụrụ m, e meela ka ọtụtụ ụmụnna anyị bụrụ ndị nwere ezi ntụkwasị obi nʼime Onyenwe anyị, nwekwa oke nkwuwa okwu, izisa oziọma ahụ na-atụghị egwu ọbụla. 15Ọ bụ eziokwu na ụfọdụ ji ekworo na anya ụfụ na-ekwusa Kraịst, ma ụfọdụ kwa na-ezisa ya site nʼọchịchọ obi ziri ezi. 16Ndị ahụ ji ọchịchọ obi ziri ezi na-eme nke a nʼịhụnanya ebe ha matara na e tinyere m ebe a nʼihi izisa oziọma. 17Ndị mbụ ahụ na-ekwusa Kraịst site nʼọchịchọ obi nke onwe ha, ọ bụghị site nʼezi obi, ebe ha na-eche na ha ga-akpalị nsogbu nye m nʼime mkpọrọ. 18Gịnịkwa ka ogbochiri? Otu ọ dị, maọbụ nʼụzọ aghụghọ maọbụ nʼeziokwu, ihe dị mkpa bụ nʼụzọ ọbụla a na-ekwusa oziọma Kraịst, nʼihi nke a ka m na-aṅụrị ọṅụ. E, m ga-aṅụrịkwa ọṅụ mgbe niile. 19Nʼihi na-amaara m na site nʼekpere unu, ya na ịgbaume nke Mmụọ Jisọs Kraịst ihe ndị a niile dakwasịrị m ga-emesi ghọọrọ m nzọpụta. 20Nʼihi na olileanya m na ntụkwasị obi m bụ na ihere agaghị eme m nʼụzọ ọbụla, kama, aga m enwe ezi agbamume nke ga-eme ka e bulie Kraịst elu nʼahụ m, ma ugbu a ma mgbe niile, maọbụ na ndụ, ma ọ bụkwanụ nʼọnwụ.

Oziọma

Luk 8:22–25

22Otu ụbọchị, ya na ndị na-eso ụzọ ya banyere nʼụgbọ mmiri, ọ sịrị ha, “Ka anyị gafee nʼofe nke ọzọ nke osimiri.” Nke a mere ha ji nụpụ ụgbọ, 23ma mgbe ha na-aga, ọ rahụrụ ụra. Oke ifufe malitere ife nʼelu ọdọ mmiri ahụ, nke mere na mmiri na-awụbanye nʼime ụgbọ ha, mee ka ha nọrọ nʼoke nsogbu. 24Ha gara kpọtee ya na-eti mkpu, “Nna anyị ukwu! Nna anyị ukwu! Lee na anyị nʼala nʼiyi!” O biliri, baara ifufe na ebili mmiri ahụ mba. Ha dara jụụ, ebe niile dekwara jii. 25Ọ sịrị ha, “Ebee ka okwukwe unu dị?” Ha ji oke egwu na oke iju anya jụrịta onwe ha sị, “Onye bụ onye a? Ọ na-enye ọ bụladị ifufe na ebili mmiri iwu, ha na-aṅakwa ya ntị.”

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 14 Ọktoba na kalenda nzukọ bụ 27 Ọktoba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike