Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọktoba 2027 › 28 Ọktoba

Kalenda Ọtọdọks · 15 Ọktoba (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 28 Ọktoba 2027

Tọọzdee · Izu nke 19 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 1

Mmemme na ndị nsọ

Venerable Euthymios the New, of Thessalonica and Monk of Mt Athos († 889)

Obubu ọnụ

Ọ dịghị obubu ọnụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Akwụkwọ ozi

Fil 1:20–27

20Nʼihi na olileanya m na ntụkwasị obi m bụ na ihere agaghị eme m nʼụzọ ọbụla, kama, aga m enwe ezi agbamume nke ga-eme ka e bulie Kraịst elu nʼahụ m, ma ugbu a ma mgbe niile, maọbụ na ndụ, ma ọ bụkwanụ nʼọnwụ. 21Nʼihi na nʼebe m nọ, ịdị ndụ bụ Kraịst, ịnwụ ọnwụ bụkwa uru. 22Ma ọ bụrụ na ịdị ndụ nʼanụ ahụ, nke a buuru m ịrụpụta ọrụ bara uru, enweghị m ike ikwu nke m ga-ahọrọ. 23Ụzọ ihe abụọ a na-eche m ihu: Ma ọchịchọ obi m bụ ịlakwuru Kraịst, nʼihi na ọ bụ nke kachasị mma. 24Ma ọ pụtara ihe na ọ dị mkpa nye unu ma ọ bụrụ na m adịrị ndụ nʼanụ ahụ. 25Ebe nke a doro m anya, amara m na mụ na unu niile ga-aga nʼihu ịnọ maka ọganihu na ọṅụ nke unu nʼime okwukwe. 26Ka mgbe m ga-abịakwute unu ọzọ, unu ga-enwebiga ọṅụ oke nʼime Kraịst Jisọs nʼihi m. 27Ma nʼọnọdụ ọbụla, na-ebinụ ndụ kwesiri oziọma nke Kraịst, ma abịara m leta unu maọbụ na abịaghị m, ka a mata na unu guzosiri ike nʼotu mmụọ, werekwa otu obi na-agba mgba nʼokwukwe nke ikwusa oziọma,

Oziọma

Luk 9:7–11

7Mgbe Herọd onye ọchịchị nụrụ akụkọ banyere ihe niile merenụ, ọ gbagwojuru ya anya nʼihi na ụfọdụ mmadụ na-asị, na Jọn omee baptizim esitela na ndị nwụrụ anwụ bilie. 8Ndị ọzọ na-asị na Ịlaịja apụtala, ebe ndị ọzọ na-asị na otu nʼime ndị amụma ochie apụtakwala ndụ ọzọ. 9Ma Herọd sịrị, “Mụ onwe bipụrụ isi Jọn. Onye bụkwa onye a nke m na-anụ ihe banyere ya?” Ọ gụrụ ya agụụ ịhụ ya. 10Mgbe ndị ozi a lọtara, ha kọọrọ ya ihe niile ha mere. Ọ kpọọrọ ha gaa nʼobodo a na-akpọ Betsaida ebe ha ga-anọ naanị ha. 11Ma mgbe igwe mmadụ matara nke a, ha sooro ya. Ọ nabatara ha ma gwakwa ha okwu maka alaeze Chineke. Ọ gwọkwara ndị niile ọ dị mkpa na-emere ka ahụ dị ha mma.

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 15 Ọktoba na kalenda nzukọ bụ 28 Ọktoba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike