Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Septemba 2027 › 21 Septemba

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 21 Septemba 2027

Tiuzdee · Izu nke 25 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Onye nsọ Matiu, Onyeozi na Onye dere Oziọma

Mmemme · Agba ofufe: uhie

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Efe 4:1–7, 11–13

1Ya mere, mụ onwe m bụ onye mkpọrọ nke Onyenwe anyị, na-arịọ unu ka unu bie ndụ kwesiri ọkpụkpọ nke a kpọrọ unu. 2Werekwanụ obi dị umeala niile na ịdị nwayọọ, na ndidi na-anagide ibe unu nʼịhụnanya. 3Nọọnụ nʼudo nʼetiti onwe unu gbalịakwanụ ime ka ịdị nʼotu unu dịgide nʼime Mmụọ Nsọ. 4E nwere otu ahụ na otu Mmụọ, dị ka e siri kpọọ unu nʼotu olileanya nke dịịrị ọkpụkpọ a kpọrọ unu. 5Otu Onyenwe anyị dị, otu okwukwe na otu baptizim. 6Ọ bụkwa naanị otu Chineke dị onye bụ Nna ihe niile na onye na-achị ihe niile, na onye na-arụ ọrụ ya nʼime ihe niile, na-ebikwa nʼime ihe niile. 7Ma e nyere onye ọbụla amara dịka oke onyinye nke Kraịst siri dị. 11O nyekwara ụfọdụ onyinye ị bụ ndị ozi, ụfọdụ ndị amụma, ụfọdụ ndị nkwusa oziọma, ụfọdụ ndị ụkọchukwu na ndị nkuzi. 12Nke a bụ maka ikwadobe ndị nsọ maka ọrụ nke ije ozi, iji wulite ahụ nke Kraịst; 13tutu anyị niile abịa na nkwekọta banyere okwukwe anyị, na ọmụma ihe banyere ọkpara Chineke, bụrụ onye tozuru oke, ruo ọtụtụ nke ogogo na ozuzu oke nke Kraịst.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 19:1–4

1Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ ọma Devid. Eluigwe na-ezipụta ebube Chineke; mbara eluigwe na-egosikwa ọrụ aka ya. 2Ụbọchị niile, ha na-ekwupụta okwu, ehihie na abalị, ha na-egosipụta ihe ọmụma. 3Ha nweghị asụsụ, ha nweghị okwu, ma a na-anụ ụda ha. 4Nʼụwa niile ka olu ha na-apụ gazuo, okwu ọnụ ha niile erukwaala nʼebe ụwa sọtụrụ. Ọ bụ na mbara eluigwe ka Chineke maara ụlọ ikwu nye anyanwụ.

Oziọma

Mat 9:9–13

9Mgbe Jisọs si nʼebe ahụ na-aga, ọ hụrụ otu nwoke a na-akpọ Matiu ka ọ nọdụrụ ala nʼụlọ ịnakọta ụtụ. Ọ sịrị ya, “Soro m.” Na-atụfughị oge, ọ hapụrụ ihe niile soro ya. 10Dị ka ọ nọdụrụ ala iri nri uhuruchi nʼụlọ Matiu, ọtụtụ ndị ọna ụtụ na ndị mmehie sooro ya na ndị na-eso ụzọ ya nọdụ na-eri nri. 11Mgbe ndị Farisii hụrụ nke a, ha jụrụ ndị na-eso ụzọ ya ajụjụ sị ha, “Gịnị mere onye ozizi unu ji eso ndị ọna ụtụ na ndị mmehie na-eri nri?” 12Mgbe ọ nụrụ nke a, Jisọs sịrị, “Mkpa dibịa adịghị akpa ndị ahụ dị ike, kama ọ bụ ndị ahụ na-esighị ike ka mkpa dibịa na-akpa. 13Ma gaanụ mụta ihe okwu a pụtara, ‘Ana m achọ ebere, ọ bụghị aja.’ Nʼihi na abịaghị m ịkpọ ndị ezi omume, kama abịara m ịkpọ ndị mmehie.”

Ndị nsọ nke ụbọchị

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike