Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Septemba 2027 › 17 Septemba
Kalenda Ọtọdọks · 4 Septemba (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 17 Septemba 2027
Fraịdee · Izu nke 13 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 3
Mmemme na ndị nsọ
Holy Prophet and God-seer Moses († 1531 BC)
Ụbọchị obubu ọnụ
Obubu ọnụ: ya na mmanụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
5Ma echeghị m na ọ dị ụzọ ọbụla ndị ozi a maara aha ha si kara m mma. 6Ọ bụrụ na m abụghị onye ọka okwu, abụ m onye ọka mmụta. Anyị akọwarala unu nke a ọtụtụ mgbe nʼụzọ dị iche iche nʼihe niile. 7Ọ ga-abụ na-emere m ihe ọjọọ mgbe m wedara onwe m ala ka e welie unu elu, nʼihi nʼanaghị m unu ihe ọbụla mgbe m na-ekwusara unu oziọma Chineke? 8Ọ bụ nzukọ nọ nʼebe ọzọ nyeere m aka mgbe m na-arụ ọrụ nʼetiti unu. Ọ bụ site nʼaka ha ka m ji nata nkwado, dịka ụgwọ ọrụ m, ka m nwee ike inyere unu aka. 9Ma mgbe m nọ nʼetiti unu abụghị m ibu arọ nye onye ọbụla nʼoge mkpa m. Nʼihi na ụmụnna si Masidonia wetaara m ihe niile na-akpa m mkpa. Ebe ọ bụ na m gbalịrị debe onwe m, ka m ghara ịbụ ibu arọ nye unu nʼụzọ ọbụla nʼoge gara aga, agaghị m abụkwa ibu arọ nye unu nʼoge dị nʼihu. 10Ebe eziokwu nke Kraịst dị nʼime m, ịnya isi m nke a agaghị akwụsị na mpaghara Akaịa niile. 11Nʼihi gịnị? Ọ bụ nʼihi na m ahụghị unu nʼanya? Chineke maara na m hụrụ unu nʼanya. 12Ma aga m aga nʼihu na-arụ ọrụ m na-achọghị ka unu nyere m aka nʼụzọ ọbụla ka m si otu a mee ka ndị ahụ na-akpọ onwe ha ndị ozi ghara ịnya isi kwuokwa na ha na-arụ ọrụ dịka anyị si arụ ọrụ anyị nʼetiti unu. 13Nʼihi na ndị dị otu a bụ ndị ozi ụgha, ndị ọrụ aghụghọ, ndị na-eme onwe ha ka ha bụ ndị ozi Kraịst. 14Ma omume ha adịghị eju m anya, nʼihi na ekwensu gbanwere onwe ya dịrị ka mmụọ ozi na-enye ìhè. 15Ya mere, ọ bụghị ihe iju anya ma ọ bụrụ na ndị na-ejere ya ozi emee onwe ha dịka ndị na-eje ozi ụzọ ezi omume. Ma nʼọgwụgwụ oge, ha ga-anata ụgwọ dịka ọrụ ha si dị. 16Dịka m kwuru na mbụ, ka onye ọbụla ghara iche na m bụ onye na-enweghị uche. Ọ bụrụkwarị na unu na-eche ụdị echiche a, biko naranụ m dịka onye na-enweghị uche, ka m nwee ike ịnya isi nke nta dịka ndị ọzọ si eme. 17Ma nʼihe m dabeere na-anya isi, adịghị m ekwu okwu dịka Onyenwe anyị ga-ekwu, maọbụ dịka onye na-enweghị uche. 18Ebe ọtụtụ mmadụ na-anya isi banyere ihe ha bụ nʼụzọ ụwa si eme. Mụ onwe m ga-anyakwa isi. 19Unu were obi ụtọ na-anagide ndị na-enweghị uche, ebe unu onwe unu nwere uche. 20Unu na-anagide ya ma ọ bụrụ na onye ọbụla eme unu ndị ohu ha, maọbụ jiri anya ike nakọrọ unu ihe unu nwere, maọbụ ghọgbuo unu, maọbụ bulie onwe ya elu dịka ha karịrị unu, maọbụ maa unu uraa nʼihu. 21Nʼezie, ọ bụ ihere m, ịnabata na anyị bụ ndị na-adịghị ike nʼezie nye nke a. Ọ bụrụ na onye ọbụla anwaa anwaa nyaa isi nʼihe ọbụla (ana m ekwu dịka onye nʼenweghị uche), mụ onwe m ga-anyakwa isi.
Oziọma
1Nʼoge ọzọ, ọ malitere izi ihe nʼakụkụ osimiri. Igwe mmadụ dị ukwuu gbara ya gburugburu, nke mere na ọ banyere nʼime ụgbọ nọdụ ala nʼime ya nʼelu mmiri ahụ, ma igwe mmadụ ahụ nọkwa nʼakụkụ osimiri ahụ. 2O bidoro i kuziri ha ọtụtụ ihe nʼilu, ma nʼozizi ya, ọ sịrị ha, 3“Geenụ ntị! Otu onye ọrụ ubi pụrụ gaa ịkụ mkpụrụ ya. 4Mgbe ọ na-agha mkpụrụ, ụfọdụ mkpụrụ dara nʼakụkụ ụzọ, ụmụ nnụnụ bịara tụtụrịa ha. 5Ụfọdụ mkpụrụ dara nʼala nkume, ebe aja ntakịrị dị. Ha puputara ngwangwa nʼihi na ala dị nʼebe ahụ emighị emi. 6Ma mgbe anwụ wara, ọ chagburu ha, ha kpọnwụọ nʼihi na ha enweghị mgbọrọgwụ. 7Mkpụrụ ndị ọzọ dara nʼetiti ogwu; ogwu ahụ tolitere kpagbuo ha. Ha amịkwaghị mkpụrụ. 8Mkpụrụ ndị ọzọ nke dara nʼezi ala, puru, tolite, ma mịa mkpụrụ na mmụba iri atọ, iri isii, ọ bụladị otu narị.” 9Ọ sịrị ha, “Onye ọbụla nwere ntị ịnụ ihe, ya nụrụ.”
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 4 Septemba na kalenda nzukọ bụ 17 Septemba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike