Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Septemba 2027 › 17 Septemba
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 17 Septemba 2027
Fraịdee · Izu nke 24 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Fraịdee nke izu nke 24 nke Oge Nkịtị
Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ
Onye nsọ Hildegard nke Bingen, Nwaagbọghọ na Onye nkuzi nke Chọọchị · Ncheta a na-ahọrọ
Onye nsọ Robert Bellarmine, Bishọp na Onye nkuzi nke Chọọchị · Ncheta a na-ahọrọ
Obubu ọnụ na nchegharị
Ụbọchị nchegharị
Fraịdee ọ bụla bụ ụbọchị nchegharị; ọgbakọ ndị bishọp ọ bụla na-ekpebi otú a ga-esi debe ya: izere anụ ma ọ bụ omume nchegharị ọzọ. Obubu ọnụ na-ejikọ ndị dị afọ 18 ruo 59, izere anụ site nʼafọ 14.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
2Ndị nke nwere ndị kwere ekwe dịka ndị nwe ha ekwesighị ilelị ha anya nʼihi na ha bụ ụmụnna ha. Kama, ha kwesiri ijere ndị nwe ha ozi nke ọma karịa, nʼihi na ndị na-erite uru nʼọrụ ha bụ ndị kwere ekwe bụrụkwa ndị anyị hụrụ nʼanya. Ihe ndị a ka ị ga-akụziri ha, dụkwaa ha ọdụ banyere ime nke a. 3Onye ọbụla na-ezi ihe ọzọ nke na-adabaghị nʼokwu ezi ntọala na-enye ndụ nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, ya na ozizi nke ibi ndụ kwesiri onye nke Chineke, 4bụ onye nganga na-afụli elu, ma bụrụkwa onye na-amaghị ihe. Ọchịchọ obi ya bụ nke na-ezighị ezi ma jupụtakwa nʼịrụ ụka na ekworo nke na-eweta ịkpọ asị na esemokwu, na nkwulu nakwa ajọ echiche, 5na isi ịrụ ụka niile nke na-esite nʼaka ụmụ mmadụ ndị echiche ha na-enweghịkwa eziokwu. Ha na-eche na ife Chineke bụ ụzọ e si aba ọgaranya. 6Ma ikpere Chineke bara uru nke ukwuu nye onye nwere afọ ojuju nʼihe ọbụla o nwere. 7Nʼihi na o nweghị ihe anyị ji nʼaka mgbe anyị bịara nʼụwa, otu a kwa, o nweghị ihe anyị ga-ewerekwa mgbe anyị ga-esi nʼụwa pụọ. 8Ya mere, ọ bụrụ na anyị enwe ihe oriri na uwe anyị ji ekpuchi ọtọ anyị, afọ kwesiri iju anyị nʼihe anyị nwere. 9Ma ndị na-achọ ịba ọgaranya na-adaba nʼọnwụnwa na nʼime ọnya na ọtụtụ ihe nzuzu na ọchịchọ ọjọọ niile dị iche iche nke na-enubanye ha nʼịla nʼiyi na mbibi. 10Nʼihi na ịhụ ego nʼanya bụ mgbọrọgwụ nke ime ihe ọjọọ niile dị iche iche. Ụfọdụ ndị hụrụ ego nʼanya, ndị na-achọsi ya ike, adapụla nʼokwukwe ha, si otu a tinye onwe ha nʼọtụtụ ọnọdụ na-ewetara ha obi ọjọọ na iru ụjụ. 11Ma gị bụ onye nke Chineke, gbaara ihe ndị a niile ọsọ. Ma chụsoo ezi omume na iyi Chineke, na okwukwe, na ịhụnanya, na ntachiobi, na ịdị nwayọ. 12Na-agbasi mgba ọma nke okwukwe gị ike, jidesiekwa ndụ ebighị ebi ahụ aka ike bụ nke a kpọrọ gị oku maka ya mgbe i mere ezi nkwupụta gị nʼihu ọtụtụ ndị akaebe.
Abụ Ọma nzaghachi
5Nʼihi gịnị ka m ga-eji tụọ egwu mgbe ụbọchị ọjọọ bịara, mgbe ndị aghụghọ ọjọọ gbara m gburugburu, 6ndị na-atụkwasị obi nʼakụnụba ha ma na-anyakwa isi nʼihi oke ụba ha. 7O nweghị onye pụrụ ịgbapụta ndụ onye ọzọ, maọbụ nye Chineke ụgwọ e ji agbara onye ahụ, 8nʼihi na ụgwọ e ji agbara ndụ dị oke ọnụ, o nweghị ụgwọ a ga-akwụ nke ga-ezu, 9nke ga-eme ka mmadụ dịrị ndụ ruo ebighị ebi, ma hapụ ịnwụ. 16Amala jijiji mgbe mmadụ na-aba oke ụba, mgbe ịdị ebube nke ụlọ ya na-amụba, 17nʼihi na ọ ga-agba aka laa ma ọ nwụọ, ịdị ebube ya agaghị eso ya banye nʼili. 18Nʼagbanyeghị na ọ gụrụ onwe ya dịka onye a gọziri agọzi mgbe ọ dị ndụ, ọ bụ ezie na ndị mmadụ na-eto gị mgbe ị na-enwe ọganihu, 19ọ ga-eso ọgbọ ndị nna nna ya ndị na-agaghị ahụkwa ìhè ọzọ.
Oziọma
1Mgbe ihe ndị a gasịrị, ọ gara nʼobodo ukwu niile na nʼobodo nta niile na-ekwusa ma na-ewetakwara ndị mmadụ oziọma nke alaeze Chineke. Ndị ozi iri na abụọ ahụ sokwa ya, 2na ụmụ nwanyị ụfọdụ ndị a chụpụrụ mmụọ ọjọọ site nʼime ha, gwọkwa ha nrịa nrịa: Meri Magdalin onye e sitere nʼime ya chụpụ mmụọ ọjọọ asaa, 3na Joana nwunye Chuza onye na-elekọta ụlọeze Herọd na akụ ya niile, na Suzana, na ọtụtụ ndị ọzọ ndị ji akụ ha na-enyere ha aka.
Ndị nsọ nke ụbọchị
- Onye nsọ Hildegard nke Bingen, Nwaagbọghọ na Onye nkuzi nke Chọọchị
- Onye nsọ Robert Bellarmine, Bishọp na Onye nkuzi nke Chọọchị
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike