Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Septemba 2027 › 16 Septemba
Kalenda Ọtọdọks · 3 Septemba (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 16 Septemba 2027
Tọọzdee · Izu nke 13 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 3
Mmemme na ndị nsọ
Hieromartyr Anthimus, Bishop of Nicomedia, and those with him: Theophilus the Deacon, Dorotheus, Mardonius, Migdonius, Peter, Indis, Gorgonius, Xeno, Domna the Virgin and Euthimius († 302)
Obubu ọnụ
Ọ dịghị obubu ọnụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
7Unu na-ele anya nʼihe ndị dị unu nʼihu. Ọ bụrụ na ọ bụ ihe doro anya nye onye ọbụla na ha bụ nke Kraịst, ha matakwa na onwe ha, na otu ahụ ha bụ nke Kraịst na anyị onwe anyị bụkwa nke ya. 8Ugbu a, ọ bụrụ na m anya isi banyere ikike ahụ Onyenwe anyị nyere m nʼebe unu nọ, ike ahụ o nyere m iji wulie unu elu, ọ bụghị iji wedaa unu ala, ihere agaghị eme m nʼihi nke a. 9Achọghị ka ọ dịka m a ga-asị na m sitere nʼakwụkwọ ozi m na-emenye unu egwu. 10Nʼihi na ha na-asị, “Akwụkwọ ozi ya dị arọ dịkwa ike, ma na mmadụ, ma nʼọdịdị ya na mmadụ adịghị ike, okwu ọnụ ya bụkwa ihe na-abaghị uru.” 11Ma ana m eme ka ndị dị otu a ghọta na ihe anyị na-ekwu site nʼakwụkwọ ozi mgbe anyị na-anọghị nʼetiti unu, ka anyị ga-eme ma anyị nọrọ nʼetiti unu. 12Anyị enweghị anya ike ihazi ọnọdụ maọbụ were onwe anyị tụnyere ndị ụfọdụ na ndị ahụ nʼeto onwe ha. Ma mgbe ha na-eji onwe ha na-atụ onwe ha, werekwa onwe ha na-atụnyere onwe ha, ha adịghị ezipụta nghọta. 13Ma anyị onwe anyị, adịghị anya isi banyere ihe ọbụla anyị na-enweghị ike ime. Kama anyị ga-anya isi nʼoke ọrụ ahụ Chineke kenyere anyị, ka anyị rụrụte ọ bụladị ruo nʼebe unu nọ. 14Nʼihi na anyị adịghị ekwu okwu karịrị ọnụ anyị mgbe anyị na-etinye anya nʼihe gbasara unu, nʼihi na ọ bụ anyị buru ụzọ bịakwute unu, ikwusara unu oziọma gbasara Kraịst. 15Ọ bụghị na anyị na-ekwu na ọ bụ anyị rụrụ ọrụ niile, ya na ọrụ nke ndị ọzọ rụrụ nʼetiti unu, kama olileanya anyị bụ na okwukwe unu ga na-eto eto mgbe niile, ka ọrụ ya nʼetiti unu bụrụ nke ga-eto eto. 16Nke a ga-eme ka anyị nwee ike zisaa oziọma ahụ na mba ndị ọzọ ndị dị nʼofe ala unu, ghara iji ọrụ arụrụ nʼebe ndị ọzọ na-arụ ọrụ na-etu ọnụ. 17Ma, “Onye ọbụla na-anya isi, ya nyaa nʼime Onyenwe anyị.” 18Nʼihi na ọ bụghị onye ji aka ya bulie onwe ya elu ka a na-anabata, kama ọ bụ onye Onyenwe anyị jiri aka ya bulie.
Oziọma
28Nʼezie agwa m unu, na a ga-agbaghara ụmụ mmadụ mmehie na nkwulu niile nke ha kwuru. 29Ma onye ọbụla ga-ekwulu Mmụọ Nsọ, enweghị ike ịgbaghara ya. Ọ bụ onye ikpe mmehie ebighị ebi mara.” 30O kwuru nke a nʼihi na ha na-asị, “Mmụọ na-adịghị ọcha bi nʼime ya.” 31Mgbe ahụ, nne ya na ụmụnne ya ndị nwoke bịara, guzoro nʼezi. Ha ziri ozi ka a kpọọ ya. 32Igwe mmadụ gbara ya gburugburu mgbe ahụ gwara ya sị, “Lee, nne gị na ụmụnne gị ndị nwoke na ndị nwanyị guzo nʼezi. Ha chọrọ ịhụ gị.” 33Ọ zara sị, “Onye bụ nne m, ndị ole bụkwa ụmụnne m ndị nwoke?” 34Mgbe ahụ, o lere ndị nọ ya gburugburu anya ma sị, “Ndị a bụ nne m, na ụmụnne m ndị nwoke! 35Onye ọbụla na-eme uche Chineke bụ nwanne m nwoke, na nwanne m nwanyị, na nne m.”
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 3 Septemba na kalenda nzukọ bụ 16 Septemba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike